bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Corinthians 13
2 Corinthians 13
Igbo 1988
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
1
Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Akwụkwọ nsọ ekwuola ya na a ga-esite nꞌama mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ taa onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. Nke a na-emekwa ya ịdọ aka na ntị nke ugboro atọ m na-adọ unu ugbu a m na-akwado ịbịakwute unu.
2
Eburula m rị ụzọ dọọ ndị na-eme mmehie aka na ntị nꞌoge gara aga m bịakwutere unu. Ugbu a ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ha na ndị ọzọ nile, dị ka m mere mgbe ahụ m bịara, nꞌihi na mgbe m bịara ugbu a aga m ejikere ịta onye ọ bụla mehiere ahụhụ, o nweghị onye ga-ala nꞌefu.
3
Ebe unu chọrọ ka m gosi unu na ọ bụ Kraịst na-ekwu okwu nꞌime m, unu ga-ahụ ya. Unu ga-ahụ na Kraịst abụghị onye na-adịghị ike, kama na ọ bụ onye na-eji ike ukwuu ya na-arụ ọrụ nꞌime unu.
4
Ọ bụ ezie na a kpọgidere anụ ahụ ya na-adịghị ike nꞌelu obe, ma ugbu a ọ na-adị ndụ site nꞌike dị ukwuu nke Chineke. Anyị onwe anyị adịkwaghị ike nꞌanụ ahụ anyị dị ka Kraịst dị mgbe ọ nọ nꞌụwa, ma ugbu a anyị dị ndụ nweekwa ike, dị ka o nwere. Ike dị ukwuu nile Chineke nwere bụ nke anyị iji ịrụ ọrụ nꞌime unu.
5
Ya mere, ka onye ọ bụla lezie onwe ya anya nwapụta ụdị ndị ọ na-ebi. Ùnu bụ ndị Kraịst nꞌezie? Ùnu agafeela ule ahụ e ji anwapụta ndị bụ nke Kraịst nꞌezie? Leenụ onwe unu anya, Kraịst ò bi nꞌime unu? Ịrụ ọrụ nke ike ya ọ̀ na-apụta ìhè na ndụ unu? Ka ùnu na-ejegharị dị ka ndị Kraịst mgbe unu na-abụghị ndị ya nꞌezie?
6
Enwere m olileanya na unu nile ga-ekwekọta na agafeela m ule ahụ, na abụ m onye Kraịst nꞌezie.
7
Ana m ekpekwa ekpere na Chineke ga-enyere unu aka ibi ezi ndu. Ọ bụghị nꞌihi na anyị chọrọ ka mmadụ site na ndụ unu hụ na anyị ziri unu ihe bụ ezi okwu, kama ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka unu na-eme ezi ihe ọ bụladị mgbe a na-ekwujọ anyị.
8
Nꞌihi na ike ahụ anyị nwere bụ nke anyị ji akwado eziokwu, ọ bụghị nke anyị ji emegide eziokwu.
9
Anyị na-aṅụrị ọnụ mgbe ndị mmadụ na-eleda anyị anya dị ka ndị na-adịghị ike, ma ọ bụrụ na unu onwe unu abụrụ ndị dị ike. Nꞌihi na ekpere anyị bụ ka unu tuozuo oke nꞌime Kraịst.
10
Ana m edere unu akwụkwọ a ugbu a, nꞌihi na achọghị m ịbara unu mba na inye unu ntaramahụhụ mgbe m bịara. Achọkwaghị m iji ike ahụ Kraịst nyere m inye unu ntaramahụhụ, kama achọrọ m iji ya wulie unu elu dị ka ụlọ.
11
Ugbu a ụmụnna m nꞌime Kraịst, ka m jiri okwu ndị a mechie akwụkwọ ozi a. Na-aṅụrịnụ ọnụ! Na-etokwanụ eto nꞌime Kraịst. Werenụ okwu ndị a m gwara unu rụọ ezi ọrụ. Na-ebikwanụ nꞌudo. Ka Chineke onye hụrụ anyị nꞌanya, na onye na-enye anyị udo dịnyeere unu.
12
Jirinụ ekele obi ọcha keleere m ibe unu nke ọma.
13
Ndị Kraịst nile nọ nꞌebe a na-ekele unu.
14
Ka mara naesite nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ abịa, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ naeweta, dịnyere unu nile. Amin.
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13