bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Corinthians 2
2 Corinthians 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 3 →
1
Ekpebiri m nꞌime obi m na agaghị m abịakwute unu ọzọ, ime ka obi jọọ unu njọ.
2
Nꞌihi na ọ bụrụ na m eme ka obi jọọ unu njọ, onye kwanụ gaakasị m obi? Ọ̀ bụghị unu onwe unu ndị m mere ka obi jọọ njọ?
3
Ọ bụ nke a mere m ji deere unu akwụkwọ ahụ ka unu nwee ike idozicha ihe nile tupuu ọbịbịa m. Achọghị m ka ndị ahụ kwesịrị ime ka obi tọọ m ụtọ, bụrụ ndị ga-eme ka obi jọọ m njọ. O doro m anya na ọ bụrụ na m ejiri obi ụtọ bịa, obi gaadịkwa unu ụtọ.
4
Nꞌezie, akwụkwọ ahụ m detaara unu wutere mmụọ m nke ukwuu. Nꞌihi na ọ bụ nꞌọnọdụ oke mkpagbu na ihe mgbu, ya na anya mmiri, ka m ji dee ya. Edeghị m ya ime ka unu nọọ nꞌihe mgbu, kama edere m ya ka unu mara otu m si hụ unu nꞌanya, na otu o si na-emetụ m nꞌobi bụ ihe na-eme nꞌetiti unu.
5
Ọ bụghị nanị m ka nwoke ahụ m deere unu ihe banyere ya wetaara obi ọjọọ. Ana m ekwu ihe banyere nwoke ahụ butere nsogbu ndị a nile. Kama o wetakwaara unu obi ọjọọ. Ya mere, achọghị m ka ọ hụọ ahụhụ karịa ka o kwesịrị.
6
Nꞌihi na ntaramahụhụ unu nile kpebiri nye ya ezuola.
7
Ugbu a, bikonụ ụmụnna m, o kwesịrị ka unu gbaghara ya, ma kasie ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu ma ọ bụ daa mba na mmụọ ya, nke ga-eme ka o kpebie ịhapụ iso Kraịst ọzọ.
8
Ya mere, bikonụ, gosinụ ya na unu hụrụ ya nnọọ nꞌanya.
9
Ihe mere m ji dee ihe m dere nꞌakwụkwọ m nke mbụ bụ ka m chọpụta ma unu jikekwara mgbe nile irube isi ime ihe m nyere unu nꞌiwu.
10
Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọ bụla, mụ onwe m kwa ga-agbaghara onye ahụ unu gbaghara. Ọ bụrụkwa na m agbaghara onye ahụ, ana m agbaghara ya nꞌihi unu, na site nꞌike nke Kraịst nyere m.
11
Ihe mere anyị ga-eji gbaghara ya bụ na anyị achọghị inye ekwensu ohere ọ bụla inwe mmeri nꞌebe anyị nọ, nꞌihi na anyị maara ihe ekwensu na-agbalị ime.
12
Mgbe m bịarutere Troas ikwusa ozi ọma Kraịst, Onyenwe anyị megheere m ụzọ izisa ozi ọma.
13
Ma enweghị m izuike nꞌime obi m, nꞌihi na ahụghị m Taitọs ezi nwanna m nꞌebe ahụ. Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji sị ndị Troas nọdụnụ nke ọma, mgbe m hapụrụ ha palie ije ịga Masidonia ịgbalị ịchọ Taitọs.
14
Ma ekele dịrị Chineke, onye naedugharị anyị na-enye anyị mmeri, nꞌihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst. Ekele dịkwara Chineke onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọ bụlạ nụrụ isisi ụtọ nke ozi ọma Kraịst.
15
Nꞌihi na nꞌetiti ndị ahụ Chineke na-azọpụta na nꞌetiti ndị ahụ na-ala nꞌiyi, anyị dị ka ụda na-esi isi ụtọ nke Kraịst naachụrụ Chineke.
16
Nꞌetiti ndị ahụ na-ala nꞌiyi, isisi ụtọ a bụ ihe na-ewetara ha ọnwụ, ma nꞌetiti ndị ahụ a na-azọpụta, ọ bụ isisi ụtọ a na-ewetara ha ndụ. Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị hụrụ onwe anyị dị ka ndị zuru oke ịrụ ọrụ dị otu a.
17
Nꞌihi na anyị adịghị ka ọtụtụ mmadụ ndị na-eji okwu Chineke azụ ahia. Kama anyị bụ ndị na-edebe onwe ha ọcha nꞌihu Chineke, ndị Chineke nꞌonwe ya họpụtara ịrụ ọrụ a. Anyị na-agba ama na-agwa ndị ọzọ ihe banyere ozi ọma a dị ka a ga-asị na anyị nọ nꞌihu Chineke eje ozi a, na dị ka ndị e jikọtara ha na Kraịst.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13