bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Corinthians 11
2 Corinthians 11
Igbo 1988
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 12 →
1
Echere m na unu ga-anagide ya ma ọ bụrụ na m ekwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nweenụ ndidi nꞌebe m nọ mgbe m na-ekwu ihe dị m nꞌobi.
2
Ana m echegbu nnọọ onwe m nꞌihi unu, ihe banyere unu na-emetụ m nꞌobi dị ka o si emetụ Chineke nꞌobi. Ọ na-agụ obi m agụụ ịhụ na Kraịst nanị bụ onye unu gaahụ nꞌanya. Achọrọ m ka unu hụ Kraịst nꞌanya dị ka nwagbọghọ naamaghị nwoke si ahụ onye na-achọ ịlụ ya nꞌanya, na-edebekwa onye ya ọcha nꞌihi nwoke ahụ.
3
Ma ana m atụ egwu, nꞌihi na ọ na-adị m ka unu gaekwe ka ụfọdụ mmadụ duhie unu, mee ka unu ghara iwere obi unu nile hụ Onyenwe anyị nꞌanya, dị ka agwọ ahụ si jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv.
4
Ọ pụtara ìhè na ọ gaghị abụ ihe siri ike ụfọdụ mmadụ ịbịakwute unu duhie unu, nꞌihi na ọ bụ ihe e jiri mara unu bụ ịnabata onye ọ bụla bịakwutere unu kwusaara unu Jisọs ọzọ nke naabụghị nke anyị na-ekwusa. Ma ọ bụ kwusaara unu ihe banyere mmụọ ozi dị iche, ma ọ bụ zi unu ụzọ ọzọ dị iche a ga-esi zọpụta unu. Unu ga-anabata ozizi ahụ nile.
5
Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọ bụla ndị ozi a a maara aha ha si kara m mma.
6
A sịkwarị na m amaghị okwu ekwu, ihe m na-ekwu doro m anya. Nꞌihi na o were m anya na unu onwe unu maara nke a, nꞌihi na anyị emeela ka ike ahụ dị nꞌozi ọma anyị na-ekwusa pụta ìhè nꞌihu unu ọtụtụ mgbe.
7
Ọ̀ ga-abụ na emere m ihe ọjọọ nꞌihi na asịghị m unu nye m ihe ọ bụla mgbe m na-ekwusara unu ozi ọma Chineke?
8
Ọ bụ nzukọ Kraịst nọ nꞌebe ọzọ nyeere m aka mgbe m na-arụ ọrụ nꞌetiti unu. Ọ bụ site nꞌaka ha ka m ji nata ego, dị ka ụgwọ ọrụ m, ka m nwee ike inyere unu aka.
9
Ma mgbe m nọ nꞌetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọ bụla nꞌoge mkpa m. Nꞌihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe nile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nꞌụzọ ọ bụla nꞌoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nꞌoge dị nꞌihu.
10
Nke a bụ nkwa m na-ekwe onwe m. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla nꞌime Griis pụrụ igbochi m ịnya isi na anataghị m inyeaka ọ bụla site nꞌaka onye ọ bụla nꞌetiti unu.
11
Nꞌihi gịnị? Ọ̀ bụ nꞌihi na m ahụghị unu nꞌanya? É, è! Nꞌihi na Chineke maara na m hụrụ unu nꞌanya.
12
Ma aga m aga nꞌihu na-arụ ọrụ m naachọghị ka unu nyere m aka nꞌụzọ ọ bụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dị ka anyị si arụ ọrụ anyị nꞌetiti unu.
13
Nꞌihi na ndị dị otu a abụghị ndị ozi nꞌezie. Ha bụ ndị ụgha, ndị ghọgburu unu ime ka unu chee na ha bụ ndị ozi Kraịst.
14
Ma omume ha adịghị eju m anya, nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya nwere ike ịgbanwe onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.
15
Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ekwensu ozi emee onwe ha dị ka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nꞌọgwụgwụ oge, ha ga-anata ịta ahụhụ dị ukwuu nꞌihi ajọ ọrụ ha rụrụ.
16
Dị ka m kwuru na mbụ, ka onye ọ bụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dị ka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dị ka ndị ọzọ si eme.
17
Ma ụdị ịnya isi a m chọrọ igosi unu abụghị ihe Onyenwe anyị chọrọ ka m mee, ma achọrọ m ịkpa agwa ugbu a dị ka onye na-enweghị uche.
18
Ebe ọtụtụ mmadụ na-anya isi banyere ihe ha bụ, mụ onwe m gaanyakwa isi nke nta.
19
Ọ bụ unu na-akpọ onwe unu ndị nwere uche, ma unu na-eji obi ụtọ na-ege ntị, na-anabatakwa ihe nile ndị nzuzu na-agwa unu.
20
Ihe mmadụ ndị a na-eme unu agbasaghị unu. Ee, ọ gbasaghị unu ma ha mee unu ndị ohu ha. Ọ gbasaghị unu ma ha nakọrọ unu ihe nile unu nwere, mesoo unu mmeso dị ka ndị karịrị unu ike, ma ọ bụ ndị maara ihe karịa. Ọ gaghị agbasa unu ma ha tie unu aka nꞌihu.
21
Ma ọ bụ na-asị na anyị bụ ndị na-enweghị ike! Nꞌezie, anyị nabatara ka unu kpọọ anyị ndị na-adịghị ike karịa na a ga-agụ anyị dị ka ndị na-emegbu unu. Ma ka m gwa unu, ihe ọ bụla ndị ahụ nwere, ma ọ bụ ihe ọ bụla ha bụ, nke na-eme ha ịnya isi, achọrọ m ka unu mata na m nwekwara otu ihe ahụ, na m bụkwa ihe ahụ ha bụ. Ma ana m ekwu okwu ndị a dị ka onye nzuzu.
22
Ha na-anya isi na ha bụ ndị Juu! Lee na mụ onwe m bụkwa onye Juu. Ha na-ekwu na ha bụ ndị Izirel ahụ Chineke họpụtara. Otu a kwa, mụ onwe m bụkwa onye Izirel. Ha na-anya isi na-asị na ha bụ ụmụ Eberaham. Mụ onwe m bụkwa nwa Eberaham.
23
Ha na-ekwu na ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi. Ma mụ onwe m ejerrela Kraịst ozi karịa ha nile (amaara m na ụdị okwu a m na-ekwu bụ ụdị okwu onye isi na-adịghị mma na-ekwu). Ma adọgbuola m onwe m nꞌọrụ karịa ha nile. Etinyela m nꞌụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe nꞌihi ikwusa ozi ọma. Etiela m ihe otiti ọtụtụ mgbe. Mgbe mgbe kwa anọọla m nꞌọnụ ọnwụ.
24
Ndị Juu apịala m ọnụ ụtarị iri atọ na toolu ha ugbo ise.
25
E jirila okporo igwe tie m ihe ruru ugboro atọ. A tụọla m nkume otu ugboro. Ugboro atọ ka ụgbọ mmiri m nọ nꞌime ya kpuru nꞌoke osimiri. Anọọla m otu abalị na ụbọchị so ya nꞌelu oke osimiri ebe mmiri na-ebugharị m.
26
Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nꞌime ya. Ọtụtụ mgbe ka mmiri gaara eri m. Ọtụtụ mgbe ka ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike gaara ala ndụ m nꞌiyi. Ọtụtụ mgbe kwa ka ndị Juu, ndị obodo nke aka m chọrọ igbu m. Otu a kwa, ọtụtụ mgbe ka m na-eze ndụ m ka ndị mba ọzọ ghara igbu m. Nꞌọtụtụ obodo ukwu, igwe ndị mmadụ achọọla itigbu m, ọtụtụ oge dịkwa mgbe m gaara etufu ndụ m nꞌọzara ma nꞌoke osimiri, na nꞌaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị iro m nꞌezie.
27
Adọgbuola m onwe m nꞌọrụ, anọọla m nꞌọnọdụ ịhụju anya na ịmụ anya ọtụtụ abalị. Ọtụtụ mgbe ana m anọ agụụ na-erighị ihe ọ bụla, ma ọ bụ ịṅụ ihe ọ bụla. Anọọla m ọtụtụ mgbe nꞌoge oyi na-ama jijiji nꞌihi enweghị uwe dị mma m ji achụ oyi.
28
Ma e wezụga ihe ndị a nile, ana m anọ nꞌechiche mgbe nile banyere otu ihe nile si aga nꞌime nzụkọ Kraịst.
29
Ònye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Ònye ka e mere ka ọ daa mba nke ịda mba ya na-adịghị emetụ m nꞌobi, ime ka m baara onye mesoro ya mmeso ahụ mba?
30
Kama ọ bụrụ na o kwesịrị ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m.
31
Chineke, Nna Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesịrị ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a nile m na-ekwu bụ eziokwu.
32
Mgbe m nọ nꞌobodo Damaskọs, onye ọchịchị ala ahụ, nke eze obodo ahụ a na-akpọ Aretas họpụtara, dotere ndị agha ya ka ha nọọ na nche nꞌọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ ijide m ma ọ bụrụ na m achọọ isite obodo ahụ pụọ.
33
Ma e tinyere m nꞌime nkata, site nꞌoghere dị na mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu wedata m, ime ka m si otu ahụ gbapụ ọsọ site nꞌaka ya.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13