bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Corinthians 3
2 Corinthians 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 4 →
1
Okwu ndị a nile anyị na-ekwu o gosiri na anyị na-anya isi nꞌime onwe anyị? Dị ka ndị ọzọ na-eme, ọ̀ dị anyị mkpa iwetara unu akwụkwọ nke ga-akọwa ụdị mmadụ anyị bụ? Ka ọ̀ dị mkpa ka anyị rịọọ unu ka unu nye anyị akwụ-kwọ nke ga-ezi ndị ọzọ ịma mma anyị?
2
Nꞌezie, akwụkwọ ọ bụla adịghị anyị mkpa, nꞌihi na unu onwe unu bụ akwụkwọ e dere iji kọwaa ụdị mmadụ anyị bụ nke mmadụ nile nwere ike ịhụ na ịgụ. Nꞌihi na mgbe ndị mmadụ hụrụ mgbanwe dị na ndụ unu, ha ga-ahụ ọrụ ọma anyị rụrụ nꞌetiti unu.
3
Ọ pụtara ìhè na unu bụ akwụkwọ ozi si nꞌebe Kraịst nọ bịa, nke anyị dere. Ọ bụghị ihe e ji mkpịsị akwụkwọ dee na mbadamba nkume, kama e dere ya nꞌobi mmadụ site na mmụọ Chineke na-adị ndụ.
4
Anyị pụrụ ikwu ụdị okwu a banyere onwe anyị nꞌihi na anyị nwere ntụkwasị obi nꞌime Chineke site na Kraịst, na ọ ga-enyere anyị aka iguzosi ike nꞌeziokwu ahụ anyị na-ekwu.
5
Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nꞌime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọ bụla bara uru site nꞌike aka anyị, kama ihe ọ bụla anyi nwere, ihe ọ bụla anyị rụpụtara, sitere nꞌaka Chineke.
6
Ọ bụ nanị Chineke mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya, na-akọwara ndị mmadụ ihe banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke Chineke chọrọ iji zọpụta ha. Anyị anaghị agwa ha na ọ dị mkpa ka ha debe iwu nile Chineke nyere, kama anyị na-agwa ha na ndụ dịrị ha site na Mmụọ Nsọ. Nꞌihi na ụzọ ochie ahụ nke inwe nzọpụta site nꞌidebe iwu na-eweta ọnwụ, ma nꞌime ụzọ ọhụrụ a, Mmụọ Nsọ na-enye ha ndụ.
7
Ma iwu ahụ na-eweta ọnwụ ji ebube dị ukwuu bịa. Ebube ahụ dị nnọọ ukwuu mee ka ụmụ Izirel hapụ inwe ike ilegide Mosisi anya nꞌihu mgbe o si nꞌelu ugwu Sainai rịdata. Ma nꞌezie, ebube ahụ mesịrị bido ịgabiga.
8
Ọ bụrụ na iwu ahụ ji ebube bịa, anyị kwesịrị ile anya na ụzọ a Mmụọ Nsọ si enye ndụ ga-eji ebube dịkarịrị ukwuu bịa.
9
Ọ bụrụ na ụzọ ahụ na-eweta ọnwụ ji ebube bịa, ebube nke ụzọ ọhụrụ ahụ na-eweta udo nꞌetiti Chineke na mmadụ ga-adịkwa ukwuu.
10
Nꞌezie, a pụghị iji ịdị ukwuu nke ebube ụzọ ọhụrụ a tụnyere ebube pụtara ìhè nꞌihu Mosisi na mgbe oche.
11
Ya mere, ọ bụrụ na iwu ahụ gafere agafe ji ebube bịa, ebube nke ụzọ ọhụrụ a Chineke mere nꞌihi ịzọpụta anyị, nwere ebube ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
12
Ya mere, ebe anyị nwere olileanya na ebube ụzọ ọhụrụ a agaghị agwụ agwụ, anyị nwere ike ugbu a ikwusa ozi ọma na-atụghị egwu.
13
Anyị agakwaghị ekwu okwu dị ka Mosisi onye weere akwa kpuchie ihu ya, nꞌihi na ọ chọghị ka ụmụ Izirel hụ ebube ahụ mgbe ọ na-agafe agabiga.
14
Ma nꞌezie, ọ bụghị nanị ihu Mosisi ka e jiri akwa kpuchie, kama e mechiri obi ụmụ Izirel ruo taa. Nꞌihi na mgbe ọ bụla ụmụ Izirel gụrụ akwụkwọ nsọ, ọ na-adị ka e ji akwa kpuchie obi ha, nꞌihi na ha adịghị ahụ ma ọ bụ aghọta ihe ha gụrụ. Ma a pụrụ iwepụ akwa mkpuchi dị otu a, nanị ma ọ bụrụ na nwoke ọ bụla ekwere na Kraịst.
15
Ee, tutuu ruo taa, mgbe ọ bụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosisi dere, ihe mkpuchi na-adịgide nꞌobi ha, ime ka ha chee na a ga-azọ-puta ha site nꞌidebe iwu.
16
Ma mgbe onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa, lọghachikwute Onyenwe anyị, mgbe ahụ a na-eme ka ihe mkpudo ahụ gharakwa ịdị.
17
Nꞌihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ ahụ anyị na-ekwu ihe banyere ya. Ebe ọ bụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nꞌebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya.
18
Ma anyị nile ndị bụ ụmụ Chineke enweghị ihe mkpudo ọ bụla nꞌihu anyị. Anyị dị ka enyo na-egosi ndị mmadụ ebube Chineke. Mgbe Mmụọ Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ya nꞌime anyị, ọ na-agbanwe anyị, ime ka anyị dịrị ka ya.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13