bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Corinthians 12
2 Corinthians 12
Igbo 1988
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 13 →
1
Ọ bụ ezie na ịnya isi m ndị a bụ ihe nzuzu, ma ebe ọ bụ na m amalitela ịnya isi, ka m gaa nꞌihu nꞌime ya. Ka m gwa unu ihe banyere ọhụ m hụrụ, na ihe nile Onyenwe anyị kpughere gosi m.
2
Afọ iri na anọ gara aga Chineke kpọọrọ m gaa nꞌeluigwe. Amaghị m ihe bụ ọnọdụ m ji gaa nꞌebe ahụ, ma ọ bụ nꞌanụ ahụ, ma ọ bụ nꞌime mmụọ. Ọ bụ nanị Chineke maara ihe mere nꞌụbọchị ahụ. Kama ihe doro m anya bụ na agara m nꞌeluigwe.
4
Mgbe m ruru nꞌebe ahụ, ahụrụ m ihe dị omimi, bụ ihe ọnụ mmadụ na-enweghị ike ịkọwa. Ma dị ka ọ dị, e nyeghị m ike ikwu ihe ọ bụla banyere ihe nile m hụrụ.
5
Ebe ahụ m gara na ihe nile m hụrụ bụ ihe mmadụ kwesịrị iji nyaa isi. Ma agaghị m anya isi nꞌihi ha, kama ihe m ga-eji nyaa isi bụ adịghị ike m na otu Chineke si eji onye na-adịghị ike na-arụ ọrụ iwetara onwe ya otuto.
6
A sị na m chọrọ ịnya isi, enwere m ọtụtụ ihe m pụrụ iji nꞌihi ya nyaa isi. Agaghị m abụkwa onye nzuzu ma m nyaa isi nꞌihi ha. Ma agaghị m eji ha nyaa isi nꞌihi na achọghị m ka onye ọ bụla gụọ m na m bụ mmadụ dị mkpa karịa ihe o ji anya ya hụ na ndụ m, na nke ọ nụrụ site nꞌozi ọma si m nꞌọnụ pụta.
7
Ma nꞌihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesị, Chineke emeela ka m nwee ọrịa na-egbu m mgbu oge nile. Ahụ mgbu a nọ ọnọdụ dị ka onyeozi ekwensu. Ọ naenye m nsogbu na-egbukwa m mgbu, ime ka, m ghara iweli onwe m elu.
8
Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọọ Chineke ka o wepụrụ m ahụ mgbu a.
9
Ma ihe ọ zara bụ nke a, “Amara m ezuolara gị. Nꞌihi na ike m na-apụta ìhè karịa nꞌahụ ndị nile na-adịghị ike.” Ugbu a obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nꞌahụ m.
10
Ya mere, ebe m maara na ahụ mgbu a na-ewetara Kraịst otuto, obi dị m ụtọ na m nwere ya. Ana m aṅụrịkwa ọṅụ mgbe a naakọcha m, mgbe m nọ nꞌọnọdụ mkpa, mgbe a na-akpagbu m, na nꞌọnọdụ nsogbu nile. Nꞌihi na mgbe ahụ m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka Kraịst naenye m ike.
11
Ọ bụ unu mere m ji si otu a kwuo okwu. Nꞌihi na ọ bụ onwe unu kwesịrị ide ihe ndị a banyere m, ọ bụghị m kwesịrị ide ha. O nweghị ihe ọ bụla mmadụ ndị a unu na-anabata nwere nke m na-enweghị. Ma nꞌezie, abụghị ihe ọ bụla.
12
Mgbe m nọ nꞌetiti unu o nweghị ụzọ m na-esighị gosi unu na m bụ onyeozi Kraịst. Nꞌezie, egosiri m unu na m bụ onye Chineke nꞌonwe ya ziteere unu. Eji m obi dị umeala rụọ ọrụ ebube na ihe ịrịba ama nꞌetiti unu.
13
Ihe ọzọ m na-emere ụlọ nzukọ ndị ọzọ nke m jụrụ imere unu bụ ịnara unu ihe oriri na ịrịọ unu ebe obibi. Bikonụ gbaghara m nꞌihi ihe ọjọọ a m mere unu.
14
Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Ọ dịkwaghị ihe ọbịbịa m ga-efu unu, nꞌihi na achọghị ego unu. Ọ bụ unu onwe unu ka m chọrọ. Unu bụ ụmụ m. Ọ bụkwaghị ọrụ ụmụntakịrị ịkwụrụ nne na nna ha ụgwọ nri ha riri. Ọ bụ nne na nna na-azụtara ụmụ ha nri ha naeri.
15
Nꞌezie, ọ na-atọ m ụtọ iwere onwe m na ihe nile m nwere nye unu, maka ọdịmma ndụ mmụọ unu, nꞌihi na ahụrụ m unu nꞌanya. Ma ọ na-adị m ka mgbe ịhụnanya m nꞌebe unu nọ na-adị ukwuu, mgbe ahụ ka ịhụnanya unu nꞌebe m nọ na-adị nta.
16
Ụfọdụ nꞌime unu nwere ike ikwu sị, ọ bụ ezie na Pọl adịghị anara anyị ihe ọ bụla, ma ọ bụ onye aghụghọ! Ma eleghị anya, o nwere ụzọ aghụghọ dị iche iche o si anara anyị ego.
17
Ka m jụọ unu ajụjụ, Ọ̀ bụ nꞌụzọ dị aṅaa ka m si anara unu ego? Ò nwere ụzọ ụmụnna ndị m zitere unu si nara unu ego?
18
Mgbe m rịọrọ Taịtọs ka ọ bịakwute unu, ya na nwanna anyị nwoke ọzọ, ọ dị uru ọ bụla ha ritere site nꞌọbịbịa ha bịara nꞌebe unu nọ? É,è! Nꞌihi na ọ bụ otu Mmụọ Nsọ ahụ na-achị ndụ anyị. Anyị na-agbasokwa nzọ ụkwụ ibe anyị na-arụ otu ọrụ ahụ.
19
Ma eleghị anya unu ga-anọ naeche na okwu ndị a nile m na-ekwu bụ nꞌihi na m chọrọ ka unu nabatakwa anyị. É,è! Kama ana m ekwu nke a nꞌihu Chineke, onye na-anụ okwu m na-ekwu, na ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ inyere unu aka ka anyị ji na-ede ihe ndị a. Ee, inyere unu aka iwuli mmụọ unu elu, ọ bụghị nꞌihi ọdịmma nke anyị.
20
Nꞌihi na ihe na-atụ m egwu bụ na mgbe m bịara nꞌetiti unu, ihe m gaahụ agaghị atọ m ụtọ. Mgbe ahụ mmeso m ga-emo unu agakwaghị atọ unu ụtọ. Nꞌihi na ana m atụ egwu na mgbe m bịakwutere unu ọzọ aga m ahụ ọtụtụ nꞌime unu ka unu na-ese okwu, aga m ahụ ka unu na-ekwosa ibe unu ekworo, aga m ahụ unu ka unu na-akpasu ibe unu iwe. Aga m ahụ ọtụtụ ndị na-afụli onwe ha elu, ndị na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche megide ndị ọzọ; aga m ahụ ọtụtụ ndị jupụtara nꞌaghụghọ na ịkpa iche iche.
21
Ana m atụ egwu na mgbe m gaabịakwute unu ọzọ Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nꞌihu unu, mee ka m kwaa akwa nꞌihi ụfọdụ nꞌime unu ndị mere ajọ ihe, ma ha achọghị ichegharị site nꞌihe ọjọọ ha mere, na nꞌihi ọtụtụ nꞌime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ.
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 13 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13