bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Corinthians 10
2 Corinthians 10
Igbo 1988
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 11 →
1
Ugbu a, mụ onwe m bụ Pọl, onye na-eme nwayọọ nwayọọ mgbe m nọ nꞌetiti unu, na onye naemesi ike mgbe m na-anọghị nꞌetiti unu, na-arịọ unu, dị ka ọ bụ Kraịst na-arịọ unu.
2
Olileanya m bụ na mgbe ọ bụla m bịara ka m ghara inwe obi ike nꞌetiti unu, nꞌihi omume unu nꞌebe m nọ. Nꞌihi na o doro m anya na m nwere ike imesi ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya ike.
3
Ọ bụ ezie na anyị bi nꞌụwa, ma ọ bụghị ike anụ ahụ ka anyị ji alụso mmehie ọgụ.
4
Nꞌihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke ụwa, kama ha bụ ngwa agha dị ike nke Chineke na-enye; ngwa agha ahụ anyị ji akwada nzube nile nke ekwensu wusiri ike, laa ya nꞌiyi.
5
Anyị na-eji ngwa agha ndị a emegide okwu ụgha nile na okwu nganga nile, nke ndị mmadụ na-eji ekpuchi eziokwu nile gbasara Chineke. Anyị na-ejikwa ngwa agha ndị a eme ka obi nile bụrụ ihe e meriri emeri irubere Kraịst isi.
6
Aga m ejikwa ngwa agha a megide ndị nile na-enupụ isi fọdụrụ, mgbe m buru ụzọ jiri ya mee ka unu onwe unu nyefee onwe unu nꞌaka Kraịst.
7
Ihe na-enye unu nsogbu bụ na unu na-ele m anya nanị nꞌelu anụ ahụ chee na m adịghị ike, ma unu adịghị ele m anya nꞌime obi. Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na o nwere ike nke Kraịst na-enye ndị bụ ndị nke ya, ya matakwa na mụ onwe m nwekwara ụdị ike ahụ.
8
Ma ọ bụrụ na unu na-eche na m naanya isi banyere ike ahụ Chineke nyere m nꞌebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji merụọ unu ahụ, aga m emekwa ka unu mata na ihere adịghị eme m ịnya isi otu ahụ.
9
Esi m otu a na-agwa unu okwu nꞌihi na achọghị m ka unu chee na ọ bụ mba ọnụ efu ka m na-aba nꞌakwụkwọ ozi m na-edere unu.
10
Ụfọdụ nꞌime unu na-asị, “Unu echegbula onwe unu banyere ihe Pọl kwuru mgbe ọ na-edere anyị akwụkwọ, nꞌihi ọ na-aba nnọọ mba, ma mba ya enweghị isi. Mgbe ọ bịara nꞌonwe ya, nꞌetiti anyị, ọ na-adị ka otu onye nꞌime anyị. Ọ madịghị okwu ekwu.”
11
Ma ana m adọ ndị na-ekwu ihe dị otu a aka na ntị ka ha jikere chere m, nꞌihi na mgbe m bịara ha ga-ahụ na m ga-emezu ihe m bara mba ya nꞌakwụkwọ ozi a.
12
Agaghị m asị na m bụ onye maara okwu ekwu, dị ka ndị ọzọ ahụ na-azọ agụ agụ nꞌetiti unu, na-akọrọ unu ihe banyere oke okwu ha. Ihe na-enye ndị ahụ nsogbu bụ na ha na-eji onwe ha atụnyere mmadụ ibe ha. Ha lee mmadụ ibe ha anya, ha elee onwe ha anya nyochapụta ụzọ ha si dị mma karịa ndị ọzọ. Ma nke a bụ nzuzu!
13
Ma anyị onwe anyị adịghị anya isi banyere ihe ọ bụla anyị na-enweghị ike ime. Olileanya anyị na nzube anyị mgbe nile bụ ime ihe nile ruo nꞌebe ahụ Chineke chọrọ ka anyị meruo ihe, nꞌọrụ nke anyị na-arụ nꞌetiti unu.
14
Nꞌihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nꞌihe gbasara unu, nꞌihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu ozi ọma gbasara Kraịst.
15
Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ nile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nꞌetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu nꞌime Chineke ga na-eto eto mgbe nile, ka ọrụ ahụ Chineke chọrọ ka anyị rụọ nꞌetiti unu bụrụ nke ga-eto eto.
16
Ka o si otu a bụrụ na mgbe anyị rụsịrị ọrụ anyị nꞌetiti unu, anyị gaenwekwa ike pụọ gaa izisa ozi ọma Kraịst nꞌebe ọzọ dị iche, ebe onye ọ bụla na-adịghị arụ ọrụ; mgbe ahụ o nweghị onye ga-ebo anyị ebubo na anyị na-arụ ọrụ anyị nꞌebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ.
17
Dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ịnya isi, ya nyaa isi nꞌihe ahụ Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụghị nꞌihe banyere ihe nke ya onwe ya rụrụ.
18
Nꞌihi na ọ baghị uru onye ọ bụla ịgwa onwe ya okwu sị, “Emere m nke ọma”. Kama ihe dị mkpa bụ Onyenwe anyị ịgwa anyị okwu sị, “Ị mere nke ọma”.
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 11 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13