bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Corinthians 8
2 Corinthians 8
Igbo 1988
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 9 →
1
Anyị chọrọ ịgwa unu ihe Chineke sitere nꞌamara ya rụpụta nꞌime nzukọ Kraịst nile dị na Masidonia.
2
Ọ bụ eziokwu na ha nọ nꞌime oke mkpagbu na ihe mwute mgbe nile, ma ha nwere ịnụ ọkụ nꞌobi dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, ewezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye.
3
Nꞌezie, ọ bụghị nanị na ha nyere ihe ha nwere, kama ha nyere karịa ihe ha nwere. Ha nyekwara ihe ha nwere nꞌihi na ha chọrọ inye, ọ bụghị nꞌihi na mmadụ kwagidere ha ka ha nye.
4
Nꞌezie, ha rịọsịrị anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye ha nyere nꞌihi na ha chọrọ iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka.
5
Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nꞌihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nꞌọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha.
6
Nꞌihi ụzọ dị otu a ha si nye onyinye ha, anyị rịọrọ Taitọs, onye malitere ọrụ ịnakọta onyinye a, ka ọ rụzuo ya site nꞌịbịa ileta unu na inyere unu aka ịrụzụ ọrụ nke ikenye ndị ọzọ ihe unu nwere.
7
Unu babigara ụba oke nꞌihe nile unu nwere. Unu nwere okwukwe dị ukwuu, nweekwa ọtụtụ mmadụ ndị maara ikwusa ozi ọma nke ọma, na ndị maara ihe. Unu hụkwara anyị nꞌanya nke ukwuu ma gosikwa ịnụ ọkụ nꞌobi unu inye aka. Nꞌihi nke a anyị chọrọ ka unu gbasaa aka unu ịrụ ọrụ ịhụnanya a.
8
Anaghị m enye unu iwu, kama site nꞌizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nꞌobi inye aka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nꞌobi unu ọ ga-adakọtakwa.
9
Nꞌihi na unu maara ụdị oke ịhụnanya na obi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nꞌihi unu, ka unu onwe unu site nꞌogbenye ya bụrụ ọgaranya.
10
Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu nꞌokwu a. Ọ baara unu uru ka unu rụzuo ọrụ unu malitere ịrụ nꞌafọ gara aga. Unu bụ ndị mbụ buru ụzọ chepụta ịrụ ọrụ a, unu bụkwa ndị mbụ buru ụzọ malite ime ihe banyere ya.
11
Ma ugbu a achọrọ m ka unu mezuo ihe unu chepụtara ime. Ka ịnụ ọkụ nꞌobi unu nwere na mbụ ịrụ ọrụ a bụrụkwa ihe unu ga-eji mezuo ya dị ka ihe unu nwere si dị.
12
Nꞌihi na ọ bụrụ na unu ejikere inye onyinye, ọ dịghị mkpa ihe unu nwere ike inye. Ihe Chineke chọrọ bụ ka mmadụ nye ihe o nwere ike inye, ọ bụghị ihe ọ na-enweghị ike inye.
13
Nke a apụtaghị na m chọrọ ka unu nye nꞌụzọ ihe ga-esi siere unu ike nꞌihi na unu nyere. Ọ dịghị! Kama, ebe unu nwere hie nne ugbu a, ọ bụ ihe dị mma ka unu nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Mgbe unu ga-anọkwa na mkpa ha ga-enyere unu aka ma ha nwee hie nne. Nꞌụzọ dị otu a onye ọ bụla ga-enwe ihe dị ya mkpa.
15
Nke a bụkwa ihe akwụkwọ nsọ kwuru, “Nwoke ahụ chikọtara hie nne agaghị enwe karịa. Nwoke ahụ chịkọtara ihe dị nta ga-enwezukwa ihe ọ chọrọ.”
16
Anyị kelere Chineke onye nyere Taitọs obi inyere unu aka ekele, dị ka ihe banyere unu si emetụ anyị nꞌobi.
17
Ọ bụghị nanị na o kweere ime dị ka anyị si rịọrọ ya, kama nꞌihi ịhụnanya o nwere nꞌebe unu nọ, o kpebiri nꞌime obi ya ịbịakwute unu na inyere unu aka.
18
Anyị na-ezitekwa ya na nwanna anyị nwoke ahụ nzukọ nile na-asọpụrụ nꞌihi ọrụ ikwusa ozi ọma Kraịst ya.
19
Ma ọ bụghị nanị nke a, kama ndị nzukọ Kraịst nile họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka nꞌije ozi ịhụnanya a, nꞌụzọ ọ ga-esi wetara Onyenwe anyị otuto. Ije ozi a ga-ezipụta na anyị jikeere inyere ibe anyị aka.
20
Ije anyị na nwanna anyị ga-ejekọta ga-egbochi onye ọ bụla ịta anyị ụta nꞌihe ọ bụla, nꞌihi na anyị achọghị ka onye ọ bụla nwee ohere ịta anyị ụta nꞌihi otu anyị si jizie onyinye a.
21
Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị nanị nꞌihu Chineke, kama nꞌihu ndị mmadụ kwa.
22
Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nꞌobi inye aka. Ugbu a o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nꞌebe unu nọ.
23
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ ajụjụ banyere Taitọs, sị ya na ọ bụ onye mụ na ya na-arụ ọrụ inyere unu aka. Sịkwanụ na ụmụnna anyị abụọ ndị ọzọ, ndị ya na ha so, bụ ndị na-anọchi anya nzukọ Kraịst, na ndị na-ewetara Kraịst otuto.
24
Gosinụ ha ihe ga-eme ka ha mata na unu hụrụ ha nꞌanya. Meekwanụ ka ha mata na ịnya isi anyị banyere unu bụ eziokwu.
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 9 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13