bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Corinthians 9
2 Corinthians 9
Igbo 1988
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 10 →
1
Ọ dịghị mkpa idere unu akwụkwọ banyere inyere ụmụ Chineke nọ na Judia aka.
2
Amaara m na unu jikeere inyere ha aka, dị ka m nyara isi nye ndị Masidonia banyere unu. Nꞌihi na agwara m ha na unu ndị bi na Akaịa ejikerelarị inyere ha aka kemgbe afọ gara aga. Ọ bụkwa ịnụ ọkụ nꞌobi unu kwaliri obi ha, ime ihe ha mere.
3
Ugbu a ana m ezitere unu ụmụnna anyị ndị a ka e mee ka ịnya isi nke m nyara banyere unu ghara ịbụ okwu efu. Ma dị ka m gwara ha na unu ejikerela, achọrọ m ka unu jikere nye ha ihe unu chọrọ inye.
4
Nꞌihi na ọ bụrụ na ndị Masidonia esoro m bịa hụ na unu ejikeghị ejike, ebe anyị naanya isi na unu ejikerela, ọ ga-abụru m ihe ihere, bụkwara unu ihe ihere, ebe anyị nwere afọ ojuju na unu gaejikere ejikere.
5
Ọ bụ nke a mere m ji hụ na ọ dị mkpa ịrịọ ụmụnna anyị ka ha buru ụzọ bịa, tupu m bịa. Ka unu nwee ike ịkwado onyinye ahụ unu kwere nkwa inye, jide ya na njikere ruo mgbe m bịara. Ka unu si otu a gosi ndị mụ na ha ga-eso na unu na-enye nꞌihi na unu chọrọ inye, ọ bụkwaghị nꞌihi na a gwara unu ka unu nye.
6
Ma mgbe unu na-enye onyinye unu, achọrọ m ka unu cheta na nwoke ọ bụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu nꞌubi ya ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne.
7
Ka onye ọ bụla nye dị ka o buru ụzọ kpebie nꞌime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nꞌihi na mmadụ kwagidere ya, ma ọ bụ inye nꞌihi na ndị ọzọ na-enye, nꞌihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye oninye ha nꞌanya.
8
Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu naenwezukwa ihe unu chọrọ mgbe nile. Mgbe ahụ unu ga-enwezukwa ihe nile unu ji arụ ọrụ ọma.
9
Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Chineke agaghị echefu ọrụ ọma nile nke onye ahụ naagbasa aka ya na-enye ndị ogbenye ihe.”
10
Ma Chineke ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-akụ nꞌubi ya, onye na-enyekwa ya nri nꞌoge owuwe ihe ubi, ga-enyekwa unu nile mkpụrụ dị unu mkpa, nke unu ga-eji kụọ mkpụrụ obi ọma. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ndị a too eto, meekwa ka owuwe ihe ubi unu hie nne.
11
Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya mgbe nile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe nile. Mgbe ndị ọzọ sitere nꞌaka anyị nata onyinye unu, ha nile ga-enye Chineke ekele nꞌihi inyeaka unu nyere ha.
12
Nꞌihi na ọrụ inyeaka nke unu na-enye abụghị nanị na unu gboro mkpa ụmụ Chineke, kama ọ bụkwa na unu na-eme ka ọtụtụ mmadụ nye Chineke ekele.
13
Ndị ahụ unu nyeere aka agaghị aṅụrị ọṅụ nanị nꞌihi onyinye unu nyere ha, kama ha ga-enye Chineke otuto, nꞌihi na unu esitela nꞌinyeaka unu gosi na ozi ọma Kraịst unu na-ekwusa, ma na-agbasokwa bụ eziokwu.
14
Nke a ga-emekwa ka ha nile jiri obi jupụtara nꞌekele kpeere unu ekpere, nꞌihi ịdị ukwu nke amara ahụ Chineke gosiri nꞌebe unu nọ.
15
Ka anyị kelee Chineke ekele nꞌihi onyinye ahụ ọnụ na-apụghị ịkọ o nyere anyị.
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13