bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
2 Corinthians 7
2 Corinthians 7
Igbo 1988
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 8 →
1
Nkwa ndị a nile ka Chineke kwere anyị, ndị enyi m. Ya mere, ka anyị debe onwe anyị ọcha nꞌime ihe nile, ka ihe ọ bụla ghara imerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Kama ka anyị bie ndụ ịdị nsọ na ịtụ egwu Chineke.
2
Megheenụ obi unu nabata anyị, nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla nꞌetiti unu anyị mere ihe ọjọọ. O nwekwaghị onye anyị duhiere. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla anyị rigburu.
3
Anaghị m ekwu okwu ndị a ime ka ihere mee unu, nꞌihi na dị ka m si gwa unu na mbụ, ana m echeta unu nꞌime obi m mgbe nile. Ma o doro m anya, ma ọ bụ na ndụ o, ma anyị na-anwụ anwụ, anyị aghaghị ịnọkọta nꞌotu.
4
Enwere m ntụkwasị obi dị ukwuu nꞌebe unu nọ, ana m anyakwa isi nꞌihi unu. Unu agbaala m ume nke ukwuu. Unu emeela ka m ṅụrịa ọṅụ ọ bụladị nꞌime ahụhụ m.
5
Nꞌihi na mgbe anyị bịaruru ala Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nꞌaka nri na aka ekpe bịakwute anyị. Egwu jupụtakwara anyị obi.
6
Ma otu ọ dị, Chineke, onye na-agba ndị ike gwụrụ ume, gbara anyị ume site nꞌọbịbịa Taitọs.
7
Ọ bụkwaghị nanị nꞌihi na ọbịbịa Taitọs nyere anyị obi ụtọ, kama akụkọ o ji bịa, gbasara otu unu si nabata ya, na otu unu si kasie ya obi, ma gbaakwa ya ume, mekwara ka anyị ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ọ gwakwara anyị otu unu si na-ele anya ịhụ m, na otu unu si na-eru uju nꞌihi ihe nile mere, na otu unu si guzosie ike nꞌukwu m, na ụdị ịhụnanya unu nwere nꞌebe m nọ, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
8
Ọ naghị ewutekwa m ugbu a na m deere unu akwụkwọ ahụ, ọ bụ ezie na o wutere m mgbe ahụ m na-ede ya, nꞌihi na amaara m na ọ ga-ewetara unu obi ọjọọ mgbe unu gụrụ ya. Ma obi ọjọọ ahụ abụrụla nanị nke nwa oge nta.
9
Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nꞌihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nꞌihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nꞌihi akwụkwọ anyị deere unu.
10
Nꞌihi na Chineke na-eji ihe naewute anyị enyere aka ime ka anyị site na mmehie anyị chegharịa. Ka ọ zọpụta anyị. Ya mere, anyị kwesịrị ịnabata ihe mwute dị otu a mgbe ọ bụla ha dakwasịrị anyị. Ma ihe naewute onye na-amaghị Kraịst abụghị ihe ga-eme ka o chegharịa, kama ọ bụ ihe na-ewetara ya ọnwụ.
11
Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nꞌihe mwute dakwaịrị unu. Ugbu a unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwa otu unu si mee ihe nile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nꞌokwu ndị a nile.
12
Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ ahụ, ma edeghị m ya nꞌihi onye ahụ mehiere, ma ọ bụ nꞌihi onye ahụ e mehiere megide. Kama edere m ya ime ka Onyenwe anyị gosi unu otu ihe gbasara anyị si na-anụ unu ọkụ nꞌobi.
13
Ewezugakwa ụzọ unu si gbaa anyị ume site nꞌịhụnanya unu nwere nꞌebe anyị nọ, a gbara anyị ume karịa site na nnabata unu nabatara Taitọs, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu.
14
Nꞌihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyaara m isi nꞌihu ya banyere unu; ugbu a obi dị m ụtọ nke ukwuu nꞌihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a ịnya isi m nꞌebe Taitọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu.
15
Ugbu a, ịhụnanya o nwere nꞌebe unu nọ na-aba ụba nke ukwuu, nꞌihi ncheta ọ na-echeta otu unu nile si jiri ọṅụ gee ya ntị na otu unu si jiri ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji nabata ya.
16
Nke a na-enyekwa m obi ụtọ nꞌihi na enwere m ntụkwasị obi nꞌebe unu nọ nꞌime ihe nile.
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13