bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Chronicles 17
1 Chronicles 17
Igbo 2006
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 18 →
1
O rue, mb͕e Devid biri n'ulo-ya, na Devid siri Netan, bú onye-amuma, Le, mu onwem nēbi n'ulo cedar, ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nēbi n'okpuru ákwà-nkwuba.
2
Netan we si Devid, Ihe nile nke di n'obi-gi, me ya; n'ihi na Chineke nọyere gi.
3
O rue, n'abali ahu, na okwu Chineke ruru Netan nti, si,
4
Je, si Devid, bú orùm, Otú a ka Jehova siri, Gi onwe-gi agaghi-ewurum ulo ibu ebe M'gēbi:
5
n'ihi na ebighm n'ulo site n'ubọchi M'mere ka Israel rigota, rue ta; kama esim n'otù ulo-ikwū ba n'ulo-ikwū ọzọ, si kwa n'otù ebe-obibi ba n'ebe-obibi ọzọ.
6
N'ebe nile nke M'nējeghari n'etiti Israel nile, ọ̀ di okwu M'gwara otù nime ndi-ikpe Israel, nke M'nyere iwu izù ndim, si, N'ìhi gini ka unu nēwurughm ulo cedar?
7
Ma ub͕u a otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n'ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n'ebe i nēso ìgwè ewu na aturu, kuru gi, ka i buru onye-ndú ndim, bú Israel:
8
M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa.
9
M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otù ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eme kwa ha ọzọ ka ha nāka nká ngwa ngwa, dika na mbu,
10
na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel: emewokwam ka ndi-iro-gi nile ruru ala. Anamegosi kwa gi na Jehova gēwuru gi ulo.
11
Ọ gēru kwa, mb͕e ubọchi-gi zuru ijeso nna-gi-hà, na M'gēme ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, onye gēsite n'umu-gi ndikom; M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.
12
Onye ahu gēwurum ulo, M'gēme kwa ka oche-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.
13
Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa: M'gaghi-ewezuga kwa eberem n'ebe ọ nọ, dika M'wezugara ya n'ebe ọ nọ, bú onye buru gi uzọ:
14
ma M'gēme ka o nēguzo n'ulom na n'ala-ezem rue mb͕e ebighi-ebi: agēme kwa ka oche-eze-ya buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.
15
Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu.
16
Devid, bú eze, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Jehova, bú Chineke, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a?
17
Ma nka bu ihe ntà n'anya-gi, Chineke; I we kwue okwu bayere ulo orù-Gi rue mb͕e di anya, I huwokwam dika ọnọdu nke madu nọ n'elu si di, Jehova, bú Chineke.
18
Gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ bayere nsọpuru orù-Gi? n'ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi.
19
Jehova, n'ihi orù-Gi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka amara ihe uku ndia nile.
20
Jehova, ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.
21
Ma òle mba di ka ndi-Gi, bú Israel, nke bu otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ibu otù ndi, imere Onwe-gi aha site n'ihe-idi-uku na ihe di egwu, ichupu mba di iche iche n'iru ndi-Gi, ndi I siri n'Ijipt b͕aputa?
22
I we doro Onwe-gi ndi-Gi, bú Israel, ibu otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke.
23
Ma ub͕u a, Jehova, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, ka eme ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo.
24
Ka eme kwa ka ọ buru ihe kwesiri ntukwasi-obi, ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, bu Chineke Israel nwere: agēme kwa ka ulo Devid, bú orù-Gi, guzosie ike n'iru Gi.
25
N'ihi na Gi onwe-gi, Chinekem, ekpughewo nti orù-Gi, si na I gēwuru ya ulo: n'ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpe ekpere n'iru Gi.
26
Ma ub͕u a, Jehova, Gi onwe-gi bu Chineke onwe-ya, I gwawo kwa orù-Gi ezi ihe a:
27
ma ub͕u a I kwerewo igọzi ulo orù-Gi, ka o we dirue mb͕e ebighi-ebi n'iru Gi: n'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, agọziwo, o we buru ihe agọziri agọzi rue mb͕e ebighi-ebi.
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29