bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Chronicles 9
1 Chronicles 9
Igbo 2006
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 10 →
1
Ewe de Israel nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu; ma, le, edere ha n'akwukwọ ndi-eze Israel: ma emere ka Juda je biri na Babilon n'ihi nmekpu ha mekpuru.
2
Ma ndi-obibi mbu ndi bi n'ihe-onwunwe-ha n'obodo nile ha bu, Israel, ndi-nchu-aja, ndi Livai, na Netinim.
3
Ma ufọdu nime umu Juda, na ufọdu nime umu Benjamin, na ufọdu nime umu Efraim na Manase, biri na Jerusalem;
4
Utai nwa Amihud, nwa Ọmri, nwa Imri, nwa Bani, onye sitere n'umu Perez nwa Juda.
5
Ndi sitere na ndi Shailo; Asaia, bú ọkpara, na umu-ya ndikom.
6
Ndi sitere n'umu Zera; Jeuel, na umu-nne-ha, nnù madu na ọgu iri-na-anọ na iri.
7
Ndi sitere n'umu Benjamin; Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaia, nwa Hasenua;
8
na Ibneia nwa Jeroham, na Ila nwa Uzi, nwa Mikri, na Meshulam nwa Shefataia, nwa Reuel, nwa Ibnija;
9
na umu-nne-ha, dika osuso-ọmumu nile ha si di, nnù madu abua na ọgu asa na iri na isi. Ndikom ndia nile bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna diri ulo nke ndi bu nna-ha.
10
Ndi sitere na ndi-nchu-aja; Jedaia, na Jehoiarib, na Jakin;
11
na Azaraia nwa Hilkaia, nwa Meshulam, nwa Zedok, nwa Meraiot, nwa Ahaitub, bú onye-ndú ulo Chineke;
12
na Adaia nwa Jeroham, nwa Pashhua, nwa Malkija, na Maasai nwa Adiel, nwa Jahzera, nwa Meshulam, nwa Meshilemit, nwa Imea;
13
na umu-nne-ha, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha nwere, nnù madu anọ na ọgu asatọ; ndi-dike ndi bu dìnkpà ije ozi òfùfè ulo Chineke.
14
Ndi sitere na ndi Livai; Shemaia nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaia, site n'umu Merari;
15
na Bakbaka, na Heresh, na Galal, na Matanaia nwa Maika, nwa Zikri, nwa Esaf;
16
na Obadaia nwa Shemaia, nwa Galal, nwa Jedutun, na Berekaia nwa Esa, nwa Elkena, onye bi n'obodo ntà ndi Netofa.
17
Ndi-ọnu-uzọ-ama kwa; Shalum, na Akub, na Talmon, na Ahaiman, na umu-nne-ha: Shalum bu onye-isi;
18
ma ha nọ rue ub͕u a n'ọnu-uzọ-ama eze n'akuku ọwuwa-anyanwu: ndi ahu bu ndi-ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū umu Livai nwere.
19
Ma Shalum nwa Kora, nwa Ebiasaf, nwa Kora, na umu-nne-ya, nke ulo nna-ya, bú ndi Kora, bu ndi-isi ije-ozi òfùfè ahu, ndi-nche nbata-uzọ nile nke ulo-ikwū: ndi bu nna-ha buri ndi-isi ọmuma-ulo-ikwū Jehova, ndi-nche uzọ-nbata;
20
Finehas nwa Eleeza bu kwa onye-ndú-ha na mb͕e gara aga, Jehova nọyere ya.
21
Zekaraia nwa Meshelemaia bu onye-ọnu-uzọ-ama nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.
22
Ndia nile arọputara ibu ndi-ọnu-uzọ-ama nime nbata-uzọ nile di ọgu iri na iri na abua. Edere ndi ahu n'akwukwọ-osuso-ọmumu-ha n'obodo ntà ha, ndi ahu ka Devid na Samuel onye-ọhu-uzọ doro n'ọnọdu-ha, bú ọnọdu nke ndi kwesiri ntukwasi-obi.
23
Ndi ahu na umu-ha bu kwa ndi-isi ọnu-uzọ-ama nile diri ulo Jehova, bú ulo nke ulo-ikwū ahu, n'ihe-ndebe.
24
N'akuku anọ ka ndi-ọnu-uzọ-ama nọ, n'Ọwuwa-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida.
25
Ma umu-nne-ha, n'obodo ntà nile ha, nwe ibata kwa-ubọchi-asa site na mb͕e rue mb͕e, inọyere ha:
26
n'ihi na n'ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka ha nọ, bú ndi-dike anọ nke ndi-ọnu-uzọ-ama, ha onwe-ha bu ndi Livai, ha bu kwa ndi-isi ime-ulo nile na ndi-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke.
27
Buruburu ulo Chineke ka ha nānọ kwa ọnọdu-abali, n'ihi na n'isi-ha ka ndebe di, ha onwe-ha nwe-kwa-ra imeghe ya kwa-ututu.
28
Ufọdu nime ha bu kwa ndi-isi ihe òfùfè; n'ihi na n'ọnu-ọgugu ka ha nāchibata ha, n'ọnu-ọgugu kwa ka ha nāchipu ha.
29
Ufọdu nime ha kwa ka agutara ibu ndi-isi ihe, bú ibu ndi-isi ihe nile nke ebe nsọ ahu, na ibu ndi-isi utu ọka flour, na manya-vine, na manu, na frankincense, na uda di iche iche.
30
Ufọdu nime umu ndi-nchu-àjà nāsugwa kwa manu-otite nēsì ísì utọ nke uda di iche iche.
31
Matitaia kwa, otù onye nime ndi Livai, onye ahu bu ọkpara Shalum onye Kora, ọ nọ n'ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ibu onye-isi nke ihe esiri n'ite isi ihe.
32
Ufọdu nime umu ndi Kohat, bú ufọdu nime umu-nne-ha, bu ndi-isi achicha anēdo n'usoro, idozi ya kwa-ubọchi-izu-ike.
33
Ndia kwa bu ndi-ọbù-abù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai, ndi bi n'ime-ulo, ndi puru n'òfùfè ọzọ: n'ihi na ehihie na abali ha bu ndi-isi-ha n'ije-ozi ahu.
34
Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai n'osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi: ndia biri na Jerusalem.
35
Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka:
36
na nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nea, na Nedab;
37
na Gedoa, na Ahio, na Zekaraia, na Miklot.
38
Miklot we mua Shimeam. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha.
39
Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal.
40
Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika.
41
Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tahrea, na Ehaz.
42
Ehaz we mua Jara; Jara mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza;
43
Moza mua Binea; Refaia bu kwa nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya:
44
Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan: ndia bu umu-ndikom Azel.
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29