bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Chronicles 21
1 Chronicles 21
Igbo 2006
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 22 →
1
Setan we guzo imegide Israel, o we kpalie Devid iguta Israel.
2
Devid we si Joab, si kwa ndi-isi ndi Israel, Jenu, gua Israel ọnu site na Bia-sheba we rue Dan; wetaranum ọnu-ọgugu-ha ka m'we mara ya.
3
Joab we si, Ka Jehova tukwasiri ndi-Ya, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise: onye-nwem, bú eze, hà abughi ndi-orù onye-nwem nwere, ha nile? n'ìhi gini ka onye-nwem nāchọ ihe a? n'ìhi gini ka ọ gāghọrọ Israel ihe-ikpe-ọmuma?
4
Ma okwu eze di ike n'ebe Joab nọ. Joab we pua, jegharia n'Israel nile, biarue Jerusalem.
5
Joab we nye Devid ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel. Israel nile we di orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ iri-na-asa na nnù iri, ndi nāmiputa mma-agha: Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri-na-asatọ na nnù iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.
6
Ma ọ gukọtaghi Livai na Benjamin n'etiti ha: n'ihi na okwu eze bu ihe-árú n'anya Joab.
7
Ọ we jọ njọ n'anya Chineke bayere okwu a, O we tib͕ue Israel.
8
Devid we si Chineke, Emehiewom nke-uku n'ihe a m'meworo: ma ub͕u a, biko, me ka ajọ omume orù-Gi gabiga; n'ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku.
9
Jehova we gwa Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke Devid, okwu, si,
10
Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēche n'iru gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M'we me gi ya.
11
Gad we biakute Devid, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nara n'onwe-gi otù n'ihe ndia;
12
ma ọ bu oké unwu arọ atọ; ma-ọbu ka ekpochapu gi ọnwa atọ n'iru ndi nākpab͕u gi, ọbuná mma-agha ndi-iro-gi nēru gi aru; ma-ọbu mma-agha Jehova ubọchi atọ, bú ajọ ọria nēfe efe n'ala, mọ-ozi nke Jehova nēbibi kwa n'ókè-ala nile nke Israel. Ma ub͕u a le okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem.
13
Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko ka m'dabà n'aka Jehova; n'ihi na obi-ebere-Ya bara uba nke-uku: ma ka m'ghara idabà n'aka madu.
14
Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n'aru Israel: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we dapu n'Israel.
15
Chineke we ziga mọ-ozi na Jerusalem ibibi ya: ma mb͕e ọ gaje ibibi, Jehova huru, we chègharia n'ihe ọjọ ahu, we si mọ-ozi ahu nke nēbibi, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nēguzo n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.
16
Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n'etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n'aka-ya, nke esetiri n'elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n'ala.
17
Devid we si Chineke, Ọ̀ bughi mu onwem siri ka aguta ndi Israel? ọbuná mu onwem ka ọ bu, bú onye mehieworo, me kwa ihe ọjọ nke-uku; ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, Jehova, bú Chinekem, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam; ma ka ọ ghara idigide ndi-Gi, ka etie ha ihe-otiti.
18
Mọ-ozi nke Jehova we si Gad ka ọ si Devid ka Devid rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.
19
Devid we rigo n'okwu Gad nke o kwuru n'aha Jehova.
20
Ọnan we chigharia, hu mọ-ozi ahu; umu-ya ndikom anọ ndi ya na ha nọ we nēzo onwe-ha. Ma Ọnan nāzọcha ọka wheat.
21
Devid we biakute Ọnan, Ọnan we legide anya, hu Devid, si n'ebe-nzọcha-ọka-ya puta, kpọ isi ala nye Devid, kpuchie iru-ya n'ala.
22
Devid we si Ọnan, Nyem ebe a, bú ebe-nzọcha-ọka nka, ka m'we wuere Jehova ebe-ichu-àjà nime ya: n'ego zuru ezu o ruru ka i gēnyem ya: ka ewe b͕ochie ihe-otiti a n'ebe ndi Israel nọ.
23
Ọnan we si Devid, Were ya n'onwe-gi, ka onye-nwem, bú eze, me kwa ihe di nma n'anya-ya: le, enyewom gi ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka ka ha buru nkú, na ọka wheat ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma; ihe nile ka m'nyeworo.
24
Eze, bú Devid, we si Ọnan, É-è; kama aghaghm izuru ya n'ego zuru ezu o ruru: n'ihi na m'gaghi-ewere ihe i nwere ichuru Jehova àjà, m'gaghi-esure kwa àjà-nsure-ọku nke m'nētiyeghi ego ọ bula.
25
Devid we nye Ọnan nnù shekel ọla-edo na ọgu iri n'ọtùtù iji zuru ebe ahu.
26
Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo, kpọkue Jehova; Ọ we were ọku si n'elu-igwe za ya n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.
27
Jehova we gwa mọ-ozi ahu; o we mighachi mma-agha-ya n'ọbọ-ya.
28
Na mb͕e ahu, mb͕e Devid huru na Jehova zara ya n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus, o we chua àjà n'ebe ahu.
29
Ma ebe-obibi Jehova, nke Moses mere n'ọzara, na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, di n'ebe di elu nime Gibeon na mb͕e ahu.
30
Ma Devid apughi ije n'iru ya iju Chineke ase: n'ihi na ọ turu egwu nke-uku n'ihi mma-agha mọ-ozi nke Jehova.
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 22 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29