bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Chronicles 4
1 Chronicles 4
Igbo 2006
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 5 →
1
Umu-ndikom Juda; Perez, na Hezron, na Kami, na Hua, na Shobal.
2
Reaia nwa-nwoke Shobal we mua Jahat; Jahat we mua Ahumai na Lahad. Ndia bu ab͕uru ndi Zọra.
3
Ndia bu kwa umu-ndikom nna Etam; Jezreel, na Ishma, na Idbash: aha nwa-nne-ha nwayi bu Hazelelponi:
4
na Penuel nna Gedoa, na Iza nna Husha. Ndia bu umu-ndikom Hua, bú ọkpara Efrata, nna Bet-lehem.
5
Ma Ashua nna Tekoa nwere ndinyom abua, bú Hela na Naara.
6
Naara we muara ya Ahuzam, na Hifa, na Timeni, na Haahashtari. Ndia bu umu-ndikom Naara.
7
Umu-ndikom Hela bu kwa Zeret, na Zoha, na Etnan.
8
Koz we mua Anub, na Zobiba, na ab͕uru nile nke Ahahel nwa Harum.
9
Ma asọpuru Jebez kari umu-nne-ya ndikom: ma nne-ya kpọrọ aha-ya Jebez, si, N'ihi na amurum ya n'ihe-nb͕u.
10
Jebez we kpọkue Chineke Israel, si, Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na I gọziem n'ezie, me kwa ka ókè-alam rie nne, ọ buru kwa na aka-Gi gādiyerem, I we me ka m'pua n'ihe ọjọ, ka ọ ghara iwutam! Chineke we me ka ihe nke ọ riọrọ biarue ya aru.
11
Kelub nwa-nne Shua we mua Mehia, onye ahu bu nna Eshton.
12
Eshton we mua Bet-rafa, na Pasea, na Tehina, bú nna Ia-nehash. Ndia bu ndikom Rika.
13
Umu-ndikom Kenaz kwa; Ọtniel, na Seraia: umu-ndikom Ọtniel kwa; Hatat.
14
Meonotai we mua Ọfra: Seraia mu-kwa-ra Joab, bú nna Gi-harashim: n'ihi na ndi-ọ̀kà ka ha bu.
15
Umu-ndikom Keleb nwa Jefune kwa; Iru, na Ila, na Naam: umu-ndikom Ila kwa; na Kenaz.
16
Umu-ndikom Jehalelel kwa; Zif, na Zifa, na Tiria, na Asarel.
17
Umu-ndikom Ezra kwa; Jeta, na Mered, na Ifa, na Jalon: o we mua Miriam, na Shamai, na Ishba, bú nna Eshtemoa.
18
Nwunye-ya, bú Hajehudija, we mua Jered nna Gedoa, na Heba nna Soko, na Jekutiel nna Zanoa. Ndia bu kwa umu-ndikom Bitia, bú nwa-nwayi Fero, nke Mered luru na nwunye.
19
Umu-ndikom nwunye Hodia, nwa-nne-nwayi Naham, bu nna Keila onye-Gamait, na Eshtemoa onye Meakat.
20
Umu-ndikom Shimon kwa; Amnon, na Rina, na Ben-hanan, na Tilon. Umu-ndikom Ishi kwa; Zohet, na Ben-zohet.
21
Umu-ndikom Shila nwa Juda; Ia nna Lika, na Laada nna Marisha, na ab͕uru nile nke ulo ndi nākpa ezi ákwà ọcha, nke ulo Ashbia;
22
na Jokim, na ndikom Koziba, na Joash, na Saraf, bú ndi-nwe Moab, na Jashubi-lehem. Ma ihe ndia bu ihe ochie.
23
Ndi ahu bu ndi-ọkpu-ite, na ndi bi na Netaim na Gedira; ọ bu n'aka eze n'ije-ozi-ya ka ha biri n'ebe ahu.
24
Umu-ndikom Simeon; Nemuel, na Jamin, na Jarib, na Zera, na Shaul:
25
Shalum nwa-ya, Mibsam nwa-ya, Mishma nwa-ya.
26
Umu-ndikom Mishma kwa; Hamuel nwa-ya, Zakua nwa-ya, Shimai nwa-ya.
27
Shimai nwe-kwa-ra umu-ndikom iri na isi, na umu-ndinyom isi; ma umu-nne-ya ndikom enweghi ọtutu umu-ndikom, ab͕uru-ha nile abaghi kwa uba, ra ka umu Juda.
28
Ha we biri na Bia-sheba, na Molada, na Haza-shual;
29
na nime Bilha, na n'Ezem, na nime Tolad;
30
na nime Betuel, na nime Họma, na nime Ziklag;
31
na nime Bet-makabot, na nime Haza-susim, na nime Bet-biri, na nime Shaaraim. Ndia bu obodo-ha rue mb͕e Devid bu eze.
32
Obodo ntà ha bu Itam, na Ain, na Rimon, na Token, na Ashan, obodo ise:
33
na obodo ntà ha nile nke di obodo ahu buruburu, rue Beal. Ndia bu ebe-obibi-ha, ha nwe-kwa-ra akwukwọ-osuso-ọmumu-ha.
34
Na Meshobab, na Jamlek, na Josha nwa Amazaia;
35
na Joel, na Jihu nwa Joshibia, nwa Seraia, nwa Asiel;
36
na Elioenai, na Jaakoba, na Jeshohaia, na Asaia, na Adiel, na Jesimiel, na Benaia;
37
na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaia, nwa Shimri, nwa Shemaia;
38
Ndia ndi baworo n'akwukwọ n'aha bu ndi-isi n'ab͕uru-ha: ulo nke ndi bu nna-ha we basa rue ọtutu.
39
Ha we jerue nbata Gedoa, rue n'akuku ọwuwa-anyanwu ndagwurugwu, ichọ ihe iji zù ìgwè ewu na aturu-ha.
40
Ha we chọta ihe-ọzùzù mara abuba di kwa nma, ala ahu sa-kwa-ra mbara n'akuku-ya abua, nādi kwa jū, nwe kwa udo; n'ihi na ndi bi n'ebe ahu na mb͕e gara aga sitere na Ham.
41
Ndia ndi edeworo n'akwukwọ n'aha we bia n'ubọchi Hezekaia, bú eze Juda, tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū-ha, na Meunim ndi ahuru n'ebe ahu, ha we wezuga ha ka ebibie ha, rue ta, we biri n'ọnọdu ha: n'ihi na ihe eji zù ìgwè ewu na aturu-ha di n'ebe ahu.
42
Ufọdu nime ha, bú ufọdu nime umu Simeon, nnù ndikom na ọgu ise, je-kwa-ra ugwu Sia; Pelataia, na Nearaia, na Refaia, na Uziel, bú umu Ishi, bu ndi-isi-ha.
43
Ha we tib͕ue ndi fọduru n'etiti ndi Amalek b͕apuru ab͕apu, ha we biri n'ebe ahu, rue ta.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29