bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Chronicles 22
1 Chronicles 22
Igbo 2006
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 23 →
1
Devid we si, Nka bu ulo Jehova, bú Chineke, nka bu-kwa-ra Israel ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.
2
Devid we si ka achikọta ndi-ọbìa ndi nọ n'ala Israel; o we guzo ndi nāwa nkume iwa nkume awaputara awaputa iwu ulo Chineke.
3
Devid dozi-kwa-ra ígwè riri nne ikpuru ibo ọnu-uzọ-ama nile ǹtú, na ikpu ihe-njikọta nile; na ọla riri nne nke anātùghi atù;
4
na osisi cedar nādighi ọnu-ọgugu: n'ihi na ndi Zaidon na ndi Taia butere osisi cedar riri nne nye Devid.
5
Devid we si, Solomon nwam bu nwata di kwa nrò, ma ulo ahu agēwuru Jehova, aghaghi ime ya ka ọ di uku kachasi ulo nile, ibu aha na ibu ihe mara nma diri ala nile: biko, ka m'doziere ya. Devid we dozie ri nne tutu ọ nwua.
6
O we kpọ Solomon, bú nwa-ya, nye ya iwu iwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo.
7
Devid we si Solomon nwa-ya, Mu onwem, ọ di n'obim iwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo.
8
Okwu Jehova we ruem nti, si, I wusiwo ọbara ri nne, i buwo kwa agha uku di iche iche: i gaghi-ewuru aham ulo, n'ihi na i wusiwo ọtutu ọbara n'uwa n'irum:
9
le, agāmuru gi nwa-nwoke, onye ahu gābu nwoke izu-ike; M'gēme kwa ka o zuru ike pua n'aka ndi-iro-ya nile buruburu: n'ihi na Solomon ka aha-ya gābu, M'gēnye kwa Israel udo na idi-jū n'ubọchi-ya:
10
onye ahu gēwuru aham ulo; ya onwe-ya gāburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna; M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike n'elu Israel rue mb͕e ebighi-ebi.
11
Ub͕u a, nwam, ka Jehova nọyere gi; gi nwe kwa uche, wue ulo Jehova, bú Chineke-gi, dika O kwuworo bayere gi.
12
Nání Jehova nye gi ezi uche na nghọta, nye gi iwu bayere Israel; ọbuná idebe iwu Jehova, bú Chineke-gi.
13
Mb͕e ahu ka i gēnwe uche, ọ buru na i lezie anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere Israel: di ike, nwe kwa ume; atula egwu, atu-kwa-la ujọ.
14
Ma, le, na nwedam edoziworom ulo Jehova ọla-edo orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri, na ọla-ọcha orú nnù talent ọgu uzọ isi na uzọ ise; ma ọla na ígwè enweghi ọtùtù; n'ihi na o riri nne: edoziwokwam osisi na nkume; i gātukwasi kwa ha ihe.
15
Ndi nēje ozi ri-kwa-ra nne n'aka-gi, ndi nāwa nkume na osisi na ndi-ọ̀kà nkume na osisi, na ndi nile mara ihe n'ije-ozi ọ bula;
16
ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, enweghi ọnu-ogugu; bilie, lua ọlu, ka Jehova nọyere kwa gi.
17
Devid we nye ndi-isi nile nke Israel iwu iyere Solomon nwa-ya aka, si,
18
Jehova, bú Chineke-unu, Ọ̀ nọyeghi unu? Ọ̀ meghi kwa ka unu zuru ike buruburu? n'ihi na Ọ nyewo n'akam ndi bi n'ala; ebudawo kwa ala n'iru Jehova, na n'iru ndi-Ya.
19
Ub͕u a werenu obi-unu na nkpuru-obi-unu nye ichọ Jehova, bú Chineke-unu; bili-kwa-nu, wue ebe nsọ Jehova, bú Chineke, ibubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na ihe nsọ nile nke Chineke, n'ulo nke anēwuru aha Jehova.
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 23 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29