bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Chronicles 23
1 Chronicles 23
Igbo 2006
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 24 →
1
Ma Devid ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ, o we me Solomon, bú nwa-ya, eze Israel.
2
O we chikọta ndi-isi nile nke Israel, ha na ndi-nchu-àjà na ndi Livai.
3
Ewe gua ndi Livai ọnu site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru: ọnu-ọgugu-ha, onye na isi-ya onye na isi-ya, ndikom di ike, di orú nnù uzọ anọ na nnù iri-na-ise.
4
Nime ndia ndi ọlu-ha bu ichi achi n'ije-ozi ulo Jehova di orú nnù uzọ atọ; nnù ndikom iri-na-ise bu ndi-odozi-okwu na ndi-ikpe:
5
nnù ndikom iri bu ndi-ọnu-uzọ; nnù ndikom iri nēto Jehova n'ihe m'mere iji to Ya, ka Devid kwuru.
6
Devid we kè ha n'òkè, n'òkè, dika umu Livai si di; bú Giashon na Kohat, na Merari.
7
Nke ndi Giashon; Ladan na Shimai.
8
Umu-ndikom Ladan; onye-isi bu Jehiel, na Zitam, na Joel, atọ.
9
Umu-ndikom Shimai; Shel-omot, na Haziel, na Haran, atọ. Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Ladan.
10
Umu-ndikom Shimai kwa; Jahat, na Zina, na Jeush, na Beria. Anọ ndia bu umu Shimai.
11
Jahat bu onye-isi, Ziza bu kwa nke-abua: ma Jeush na Beria enweghi ọtutu umu-ndikom; ha we ghọ otù ulo nna site n'igukọta ha n'otù.
12
Umu-ndikom Kohat; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel, anọ.
13
Umu-ndikom Amram; Eron na Moses: ewe kewapu Eron, ido ya nsọ ibu onye nsọ kachasi ndi nsọ nile, ya onwe-ya na umu-ya ndikom, rue mb͕e ebighi-ebi, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova, ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue mb͕e ebighi-ebi.
14
Ma Moses, bú onye nke Chineke ahu, anākpọ umu-ya ndikom aha n'etiti ebo Livai.
15
Umu-ndikom Moses; Giashom, na Elieza.
16
Umu-ndikom Giashon; Shebuel, bú onye-isi.
17
Umu-ndikom Elieza bu kwa Rehabia, bú onye-isi. Ma Elieza enweghi umu-ndikom ọzọ; ma umu-ndikom Rehabia bara uba nke-uku.
18
Umu-ndikom Izha; Shelomit, bú onye-isi.
19
Umu-ndikom Hebron; Jeria, bú onye-isi, na Amaraia, bú nke-abua, na Jehaziel, bú nke-atọ, na Jekameam, bú nke-anọ.
20
Umu-ndikom Uziel; Maika, bú onye-isi, na Ishia, bú nke-abua.
21
Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Umu-ndikom Mahli; Eleeza na Kish.
22
Eleeza we nwua, ma o nweghi umu-ndikom, ọ bu nání umu-ndinyom: umu-nne-ha, bú umu-ndikom Kish, we luru ha na nwunye.
23
Umu-ndikom Mushi; Mahli, na Ida, na Jeremot, atọ.
24
Ndia bu umu Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-ha agukọtara, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, ndi nēje ozi ahu diri òfùfè ulo Jehova, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba.
25
N'ihi na Devid siri, Jehova, bú Chineke Israel, emewo ka ndi-Ya zuru ike; Ọ nēbi kwa nime Jerusalem rue mb͕e ebighi-ebi:
26
ọzọ kwa, ndi Livai agaghi-enwe ibūru ebe-obibi na ihe-ya nile diri òfùfè-ya.
27
N'ihi na n'okwu ikpe-azu Devid ka edere ndia, bú ọnu-ọgugu umu-ndikom Livai site n'onye b͕ara orú arọ we gaba.
28
N'ihi na ebe-nguzo-ha di n'akuku umu Eron ifè òfùfè ulo Jehova, n'ogige nile, na n'ime-ulo nile, na n'ime ka ihe nsọ ọ bula di ọcha, bú ọlu òfùfè ulo Chineke;
29
na idozi achicha anēdo n'usoro, na idozi utu oka flour iji nye onyinye-inata-iru-ọma, na idozi mbadamba-achicha ekoghi-eko, na idozi ihe esiri n'ite isi ihe, na idozi ihe edere edè, na idebe ihe ọ bula itù ihe di miri miri na ihe ọ bula itù ihe ọzọ;
30
na iguzo kwa-ututu ikele na ito Jehova, otú a kwa n'anyasi;
31
na isurere Jehova àjà-nsure-ọku nile, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na nime mb͕e nile akara àkà, n'ọnu-ọgugu dika ikpe ekpere ha si di, mb͕e nile n'iru Jehova:
32
ka ha we debe kwa ihe-ndebe ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe ebe nsọ ahu, na ihe-ndebe umu Eron, bú umu-nne-ha, bayere òfùfè ulo Jehova.
← Chapter 22
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 24 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29