bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Chronicles 27
1 Chronicles 27
Igbo 2006
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 28 →
1
Ma umu Israel, dika ọnu-ọgugu-ha si di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-odozi-okwu-ha ndi nējere eze ozi, n'ihe ọ bula nke òkè nile ndi nābata nāpu kwa n'ọnwa n'ọnwa, n'ọnwa nile nke arọ, otù òkè di orú nnù uzọ atọ.
2
Onye-isi òkè mbu nke diri ọnwa mbu bu Jashọbeam nwa Zabdiel: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
3
O sitere n'umu Perez, bú onye-isi nke ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha nke diri ọnwa mbu.
4
Ma onye-isi òkè nke ọnwa nke-abua bu Dodai onye Ahoa, na òkè-ya; Miklot bu kwa onye-ndú-ha: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
5
Onye-isi usu-ndi-agha nke-atọ nke diri ọnwa nke-atọ bu Benaia nwa Jehoiada onye-nchu-aja, ọ bu onye-isi: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
6
Onye ahu bu Benaia nke bu dike nke orú ndikom na iri ahu, ọ bu kwa onye-isi orú na iri ahu: Amizabad nwa-ya di kwa n'òkè-ya.
7
Onye-isi nke-anọ nke diri ọnwa nke-anọ bu Asahel nwa-nne Joab, Zebadaia nwa-ya so-kwa-ra ya: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
8
Onye-isi nke-ise nke diri ọnwa nke-ise bu Shamhut onye-Izrahait: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
9
Onye-isi nke-isi nke diri ọnwa nke-isi bu Ira nwa Ikesh onye Tekoa: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
10
Onye-isi nke-asa nke diri ọnwa nke-asa bu Hilez onye-Pelonait, onye sitere n'umu Efraim: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
11
Onye-isi nke-asatọ nke diri ọnwa nke-asatọ bu Sibekai onye Husha, nke ndi Zera: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
12
Onye-isi nke-iteghete nke diri ọnwa nke-iteghete bu Abieza onye Anatot, nke ndi Benjamin: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
13
Onye-isi nke-iri nke diri ọnwa nke-iri bu Maharai onye Netofa, nke ndi Zera: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
14
Onye-isi nke-iri-na-otù nke diri ọnwa nke-iri-na-otù bu Benaia onye Piraton, sitere n'umu Efraim: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
15
Onye-isi nke-iri-na-abua nke diri ọnwa nke-iri-na-abua bu Heldai onye Netofa, nke Ọtniel: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
16
Ndi-isi kwa nke ebo nile nke Israel: nke ndi Reuben, Elieza nwa Zikri bu onye-ndú: nke ndi Simeon, Shefataia nwa Meaka:
17
nke Livai, Hashabaia nwa Kemuel: nke Eron, Zedok:
18
nke Juda, Elaihu, onye sitere n'umu-nne-Devid: nke Isaka, Ọmri nwa Maikael:
19
nke Zebulun, Ishmaia nwa Obadaia: nke Naftali, Jerimot nwa Azriel:
20
nke umu Efraim, Hoshea nwa Azazaia: nke nkera ebo Manase, Joel nwa Pedaia:
21
nke nkera ebo Manase di na Gilead, Ido nwa Zekaraia: nke Benjamin, Jaasiel nwa Abnea:
22
nke Dan, Azarel nwa Jeroham. Ndia bu ndi-isi ebo nile nke Israel.
23
Ma Devid agutaghi ọnu-ọgugu-ha site n'onye b͕ara orú arọ we rida: n'ihi na Jehova siri na Ọ gēme ka Israel ba uba dika kpakpando nke elu-igwe.
24
Joab nwa Zeruaia malitere iguta ha, ma ọ guzughi; iwe we dikwasi Israel n'ihi nka; etiyeghi kwa ọnu-ọgugu n'ọnu-ọgugu nke di n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke eze, bú Devid.
25
Onye-isi ulo-àkù nile nke eze bu Azmavet nwa Adiel: onye-isi ulo-àkù nile nke di n'ọhia, na n'obodo nile, na n'obodo ntà nile, na n'ulo-elu nile, bu kwa Jehonatan nwa Uzaia:
26
onye-isi ndi nēje ozi ubi ilu ọlu ala-ubi bu Ezri nwa Kelub:
27
onye-isi ubi-vine nile bu Shimai onye Rema: onye-isi nke ihe di n'ubi-vine itiye n'ulo nile anēdebe manya-vine bu Zabdi onye Shefam:
28
onye-isi osisi olive nile na osisi sycomore nile nke di n'ebe di ala ala bu Beal-hanam onye Geda: onye-isi ulo nile anēdebe manu bu Joash:
29
onye-isi ìgwè ehi nke nāta nri nime Sheron bu Shitrai onye Sheron: onye-isi ìgwè ehi nke di nime ndagwurugwu nile bu Shefat nwa Adlai:
30
onye-isi camel nile bu Obil onye Ishmael: onye-isi inyinya-ibu nile bu Jehdeia onye Meronot:
31
onye-isi ìgwè ewu na aturu bu Jaziz onye Haga. Ndia nile bu ndi-isi àkù nke Devid nwere.
32
Jonatan nwa-nne nna Devid bu onye nādu ọdu, nwoke nwere nghọta na ode-akwukwọ ka ọ bu: Jehiel nwa Hakmoni nọye-kwa-ra umu-ndikom eze:
33
Ahitofel bu kwa onye nādu eze ọdu: Hushai onye-Akait bu eyì eze:
34
ma nke nēso Ahitofel bu Jehoiada nwa Benaia, na Abaiata: onye-isi usu-ndi-agha eze bu Joab.
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 28 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29