bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Chronicles 7
1 Chronicles 7
Igbo 2006
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 8 →
1
Ma umu-ndikom Isaka; Tola, na Pua, na Jashub, na Shimron, anọ.
2
Umu-ndikom Tola kwa; Uzi, na Refaia, na Jeriel, na Jahmai, na Ibsam, na Shemuel, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, bú ndi nke Tola; ha bu ndi-dike bu dìnkpà n'osuso-ọmumu nile ha: ọnu-ọgugu-ha n'ubọchi Devid di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-isi na ọgu iri.
3
Umu-ndikom Uzi kwa; Izrahia: umu-ndikom Izrahia kwa; Maikael, na Obadaia, na Joel, na Ishia, ise: ndi-isi ka ha nile bu.
4
Usu ndi nāpunara madu ihe nke usu-ndi-agha so-kwa-ra ha, n'osuso-ọmumu-ha, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha di orú nnù uzọ anọ na nnù iri: n'ihi na ha nwere ọtutu ndinyom na umu-ndikom.
5
Umu-nne-ha kwa nke ab͕uru nile nke Isaka, ndi-dike bu dìnkpà, di orú nnù uzọ iri na nnù iri-na-asa na ọgu iri, edewo ha nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu.
6
Umu-ndikom Benjamin; Bela, na Bekea, na Jediael, atọ.
7
Umu-ndikom Bela kwa; Ezbon, na Uzi, na Uziel, na Jerimot, na Iri, ise; ndi-isi ulo nke ndi bu nna, ndi-dike bu dìkpà; edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-ise na orú na iri na anọ.
8
Umu-ndikom Bekea kwa; Zemira, na Joash, na Elieza, na Elioenai, na Ọmri, na Jeremot, na Abaija, na Anatot, na Alemet. Ndia nile bu umu-ndikom Bekea.
9
Edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, dika osuso-ọmumu nile ha si di, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù iri na ọgu iri.
10
Umu-ndikom Jediael kwa; Bilhan: umu-ndikom Bilhan kwa; Jeush, na Benjamin, na Ihud, na Keneana, na Zetan, na Tashish, na Ahishaha.
11
Ndia nile bu umu Jediael, dika ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-dike bu dìnkpà, ha di orú nnù uzọ abua na nnù atọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha ibu agha.
12
Shupim kwa, na Hupim, bú umu Ia, na Hushim, bú umu Ahea.
13
Umu-ndikom Naftali; Jahaziel, na Guni, na Jiza, na Shalum, bú umu Bilha.
14
Umu-ndikom Manase; Asriel, onye nwunye-ya muru: (iko-ya nwayi, bú nwayi Eram, muru Makia nna Gilead:
15
Makia we luru nwunye n'etiti Hupim na n'etiti Shupim, aha nwa-nne-ya nwayi bu kwa Meaka;) aha nwa nke-abua bu kwa Zelọfehad: ma Zelọfehad nwere umu-ndinyom.
16
Meaka, bú nwunye Makia, we mua nwa-nwoke, o we kpọ aha-ya Peresh; aha nwa-nne-ya nwoke bu Sheresh; umu-ya ndikom bu Ulam na Rakem.
17
Umu-ndikom Ulam kwa; Bedan. Ndia bu umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase.
18
Nwa-nne-ya nwayi, bú Hamoleket, we mua Ishhod, na Abieza, na Mahla.
19
Umu-ndikom Shemida bu kwa Ahian, na Shekem, na Likhi, na Aniam.
20
Umu-ndikom Efraim kwa; Shutela, na Bered nwa-ya, na Tahat nwa-ya, na Eleada nwa-ya, na Tahat nwa-ya,
21
na Zabad nwa-ya, na Shutela nwa-ya, na Eza, na Elead, ndi ndikom Gat, ndi amuru n'ala, b͕uru, n'ihi na ha ridatara ichiri anu-ulo-ha.
22
Efraim, bú nna-ha, we rue újú ọtutu ubọchi, umu-nne-ya we bia ikasi ya obi.
23
O we bakuru nwunye-ya, o we turu ime, mua nwa-nwoke, nna-ya we kpọ aha-ya Beria, n'ihi na ulo-ya di n'ọnọdu ọjọ.
24
Nwa-ya nwayi bu Sheera, onye wuru Bet-horon di n'okpuru, na nke di n'elu, na Uzen-sheera.
25
Refa bu kwa nwa-ya, na Reshef, na Tela nwa-ya, na Tahan nwa-ya;
26
Ladan nwa-ya, Amaihud nwa-ya, Elishama nwa-ya;
27
Nun nwa-ya, Joshua nwa-ya.
28
Ihe-onwunwe nile ha na ebe-obibi nile ha bu Bet-el na umu-obodo-ya, na n'akuku ọwuwa-anyanwu Naaran, na n'akuku Ọdida-anyanwu Gezea na umu-obodo-ya; na Shekem na umu-obodo-ya, rue Aza na umu-obodo-ya:
29
na n'akuku umu Manase, Bet-shean na umu-obodo-ya, Teanak na umu-obodo-ya, na Megido na umu-obodo-ya, na Doa na umu-obodo-ya. Nime ndia ka umu Josef nwa Israel biri.
30
Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi.
31
Umu-ndikom Beria kwa; Heba, na Malkiel, onye ahu bu nna Biazait.
32
Heba we mua Jaflet, na Shoma, na Hotam, na Shua nwa-nne-ha nwayi.
33
Umu-ndikom Jaflet kwa; Pasak, na Bimhal, na Ashvat. Ndia bu umu Jaflet.
34
Umu-ndikom Shema kwa; Ahi, na Rohga, na Jehuba, na Eram.
35
Umu-ndikom Helem nwa-nne-ya kwa; Zofa, na Imna, na Shelesh, na Amal.
36
Umu-ndikom Zofa; Sua, na Hanefa, na Shual, na Beri, na Imra;
37
Beza, na Hod, na Shama, na Shilsha, na Itran, na Beera.
38
Umu-ndikom Jeta kwa; Jefune, na Pispa, na Ara.
39
Umu-ndikom Ula kwa; Ara, na Haniel, na Rizia.
40
Ndia nile bu umu Asha, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi arọputara arọputa, ndi-dike bu dìnkpà, ha bu ndi-isi nke ndi-isi. Edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, nime usu-ndi-agha, n'ibu-agha, ọnu-ọgugu-ha bu orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ise.
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29