bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Genesis 22
Genesis 22
Igbo 2006
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 23 →
1
O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Chineke nwara Abraham, si ya, Abraham; ọ si, Lekwam.
2
Ọ si, Biko, were nwa-gi nwoke nke i nwere nání ya, onye i huru n'anya, bú Aisak, je ala Moraia; sure ya n'ebe ahu, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n'elu otù nime ugwu ahu nke M'gāsi gi je.
3
Abraham we bilie n'isi-ututu, jikwa inyinya-ibu-ya, chiri madu abua nime umu-okorọbia-ya tiyere onwe-ya, na Aisak, bú nwa-ya nwoke; ọ kpọwa nkú nke àjà-nsure-ọku, bilie, je ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je.
4
N'ubọchi nke-atọ Abraham weliri anya-ya abua, hu ebe ahu n'ebe di anya.
5
Abraham we si umu-okorọbia-ya, Nọdunu ebe a n'onwe-unu, unu na inyinya-ibu, ma mu onwem na nwa-okoro a gēje ebe ahu; ayi gākpọ kwa isi ala, chigharikute unu.
6
Abraham we were nkú àjà-nsure-ọku, bo Aisak nwa-ya nwoke; o jide n'aka-ya ọku na mma; ha abua we yikọ je.
7
Aisak we gwa Abraham, bú nna-ya, okwu, si, Nnam; ọ si, Lekwam, nwam. Ọ si, Le, ọku na nkú: ma òle ebe nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku di?
8
Abraham we si, Chineke gāhuru Onwe-ya nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku, nwam: ha abua we yikọ je.
9
Ha biarue ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je; Abraham we wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, do nkú ahu n'usoro, ke Aisak, bú nwa-ya nwoke, ab͕ú, tukwasi ya n'elu ebe-ichu-àjà, n'elu nku.
10
Abraham we setia aka-ya, were mma ahu ib͕u nwa-ya nwoke.
11
Ma mọ-ozi nke Jehova siri n'elu-igwe kpọ ya òkù, si, Abraham, Abraham: ọ si, Lekwam.
12
Ọ si, Esetila aka-gi tukwasi n'aru nwa-okoro ahu, eme-kwa-la ya ihe ọ bula: n'ihi na ub͕u a ka M'mara na onye nātu egwu Chineke ka i bu, n'ihi na i b͕ochighi nwa-gi nwoke, nke i nwere nání ya, iwere ya nyem.
13
Abraham we welie anya-ya abua hu, ma, le, otù ebulu n'azu ya, nke alughi-ulù nējide ya na mpi-ya: Abraham we je, were ebulu ahu, sure ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku n'ọnọdu nwa-ya nwoke.
14
Abraham we kpọ aha ebe ahu Jehova-Jaire: dika anāsi rue taa, N'ugwu nke Jehova ka agāhu ya.
15
Mọ-ozi nke Jehova we si n'elu-igwe kpọ Abraham òkù nke ub͕ò abua,
16
si, Ejim Onwem ṅu iyi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na n'ihi na i mewo ihe a, n'ihi na i b͕ochighi kwa nwa-gi nwoke, onye i nwere nání ya:
17
na n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, na dika ájá nke di n'usọ oké osimiri; nkpuru-gi gēnweta kwa ọnu-uzọ-ama nke ndiroya;
18
ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha; n'ihi na i gewo nti n'olum.
19
Abraham we chigharikute umu-okorọbia-ya, ha bilie, yikọ je Bia-sheba; Abraham we biri na Bia-sheba.
20
O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na egosiri Abraham, si, Le, Milka, ya onwe-ya amuwo-kwa-ra nwa-nne-gi nwoke, bú Nehoa, umu-ndikom;
21
Uz, bú ọkpara-ya, na Buz, bú nwa-nne-ya, na Kemuel, bú nna Eram
22
na Kesed, na Hazo, na Pildash, na Jidlaf, na Betuel.
23
Betuel we mua Rebeka: madu asatọ ndia ka Milka muru nye Nehoa, bú nwa-nne Abraham.
24
Iko-ya nwayi, onye aha-ya bu Reuma, ya onwe-ya mu-kwa-ra Tiba, na Gaham, na Tahash, na Meaka.
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 23 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50