bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Genesis 4
Genesis 4
Igbo 2006
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 5 →
1
Madu ahu we mara aru Iv, bú nwunye-ya; o we turu ime, mua Ken, si, Enwetawom nwoke site n'iye-aka Jehova.
2
Ọzọ kwa, ọ mua nwa-nṅe-ya nwoke, bú Ebel. Ebel we buru onye nāzù ìgwè ewu na aturu, ma Ken bu onye nālu ọlu ubi.
3
O rue, n'ọgwugwu ubọchi ufọdu, na Ken wetara ufọdu nime nkpuru ala ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova.
4
Ebel kwa, ya onwe-ya wetakwara ufọdu nime umu eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu ya, na ufọdu nime iberibe-ha mara abuba. Jehova we le Ebel, le kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, anya ọma:
5
ma Ken na onyinye-inata-iru-ọma-ya, O leghi ha anya ọma. Ken we we iwe di ọku nke-uku, iru-ya we b͕arua.
6
Jehova we si Ken, N'ìhi gini ka i nēwe iwe di ọku? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka iru-gi b͕aruru?
7
Ọ buru na i nēme nke-ọma, ọ̀ bughi nb͕asa-iru ka i gēnwe? ọ buru kwa na i meghi nke-ọma, n'ọnu-uzọ ka nmehie nāma-kpu dika anu-ọhia: ọ bu kwa n'ebe i nọ ka ọchichọ-ya di, ma ọ kwesiri ka gi onwe-gi chia ya.
8
Ken we si Ebel, bú nwa-nne-ya, Ka ayi je n'ọhia. O rue, mb͕e ha nọ n'ọhia, na Ken biliri imegide Ebel, bú nwa-nne-ya, we b͕ue ya.
9
Jehova we si Ken, Òle ebe Ebel, bú nwa-nne-gi, nọ? Ọ we si, Amaghm: ọ̀ bu onye-nche nwa-nnem ka m'bu?
10
Ọ si, Gini ka i meworo? ge nti! olu ọbara nwa-nne-gi nētikum site n'ala.
11
Ma ub͕u a, onye anābu ọnu ka i bu site n'ala, nke saghere ọnu-ya inara ọbara nwa-nne-gi n'aka-gi;
12
mb͕e i nālu ọlu ubi, ọ gaghi-enye gi ike-ya ọzọ; onye nāṅaghari na ọsọ ka i gābu n'uwa.
13
Ken we si Jehova, Ahuhu ajọ omumem di uku kari obubu.
14
Le, I chupuwom ta n'iru ala; ọ bu kwa n'iru-Gi ka agēzopum; m'gābu kwa onye nāṅaghari na ọsọ n'uwa; o gēru kwa na onye ọ bula nke nāhum gēb͕um.
15
Jehova we si ya, N'ihi nka onye ọ bula nke nēb͕u Ken, okpukpu asa ka agābọ ọ́bọ̀ n'aru ya. Jehova we doro Ken ihe-iriba-ama, ka onye ọ bula nke nāhu ya we ghara itib͕u ya.
16
Ken we si n'iru Jehova pua, biri n'ala Nod, n'Iru-anyanwu Iden.
17
Ken we mara aru nwunye-ya; ọ we turu ime, mua Inok: ma Ken nọ nēwu obodo, o we kpọ aha obodo ahu, dika aha nwa-ya nwoke si di, Inok.
18
Ewe mua Irad nye Inok: Irad we mua Mehujael: Mehujael we mua Metushael: Metushael we mua Lemek.
19
Lemek we lutara onwe-ya ndinyom abua: aha otù onye nime ha bu Eda, aha nwayi ibe-ya bu Zila.
20
Eda we mua Jebel: onye ahu bu nna ndi bi n'ulo-ikwū, ndi nwe-kwa-ra anu-ulo.
21
Aha nwa-nne-ya nwoke bu Jubal: onye ahu bu nna ndi nile nākpọ ubọ-akwara, nēb͕u kwa ọ̀jà.
22
Zila kwa, nwayi ahu mu-kwa-ra Tubal-ken, onye nākpu ihe-ọlu nile ọ bula nke ọla na nke ígwè: ma nwa-nne-nwayi Tubal-ken bu Neama.
23
Lemek we si ndinyom-ya: Eda na Zila, nurunu olum; Ndinyom Lemek, genu nti n'okwu-ọnum: N'ihi na nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ob͕ub͕u-mmam, Ọ bu kwa nwata-nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ubiri-utarim:
24
Asi na ọ bu okpukpu asa ka agābọ̀ Ken ọ́bọ̀, Agābọ kwa Lemek ọgu okpukpu atọ na iri na asa.
25
Adam we mara aru nwunye-ya ọzọ; nwunye-ya we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Set, si, N'ihi na Chineke doworom nkpuru ọzọ n'ọnọdu Ebel; n'ihi na Ken b͕uru ya.
26
Set kwa, ya onwe-ya ka amu-kwa-ra nwa-nwoke nye; ọ kpọ aha-ya Enosh: mb͕e ahu ka amalitere ikpọku aha Jehova.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50