bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Genesis 24
Genesis 24
Igbo 2006
← Chapter 23
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 25 →
1
Ma Abraham ghọrọ agadi, ubochi nduya nāgwu: Jehova gọzikwarari Abraham n'ihe nile.
2
Abraham we si orù-ya, bú okenye nke ulo-ya, onye nāchi ihe nile o nwere, Biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum:
3
m'gēme kwa gi ka i were Jehova, bú Chineke nke elu-igwe na Chineke nke uwa, ṅu iyi, na i gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'etiti ha:
4
kama ọ bu alam na umu-nnam ka i gējekuru, lutara nwam, bú Aisak, nwunye.
5
Orù ahu we si ya, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-achọ isom jerue ala nka: ọ̀ bu na m'nāghaghi ime ka nwa-gi laghachi n'ala ahu nke i siri n'ebe ahu puta?
6
Abraham we si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ime ka nwam laghachi n'ebe ahu.
7
Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Nke si n'ulo nnam, na n'ala amurum, kuputam, Nke gwakwara m okwu, Nke ṅukwara m iyi, si, Nkpuru-gi ka M'gēnye ala nka; Ya onwe-ya gēziga mọ-ozi-Ya n'iru gi, i gēsi kwa n'ebe ahu lutara nwam nwunye.
8
Ma ọ buru na nwayi ahu achọghi iso gi je, ya bu i puwo n'iyi nka i ṅurum; nání na i gaghi-eme ka nwam laghachi n'ebe ahu.
9
Orù ahu we tiye aka-ya n'okpuru apata-ukwu Abraham onye-nwe-ya, ṅuara ya iyi bayere okwu a.
10
Orù ahu we chiri kamel iri, nime kamel nile nke onye-nwe-ya, je; ezi ihe nile nke onye-nwe-ya di kwa n'aka-ya: o bilie, je Mesọpọtemia, rue obodo Nehoa.
11
Ọ me ka camel nile b͕ue ikpere n'ala n'azu obodo ahu n'akuku olùlù-miri na mb͕e anyasi, na mb͕e ndinyom ndi nēsere miri nāputa.
12
Ọ si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, me ka o zutem taa, bú ihe m'nāchọ, mekwara onye-nwem Abraham ebere.
13
Le, mu onwem nēguzo n'akuku isi-iyi miri a; umu-ndinyom nke ndi obodo a nāputa kwa isere miri:
14
ka o ru kwa, na nwa-ab͕ọghọ ahu onye m'gāsi, Biko, zie ite-gi ka m'ṅua; onye gāsi kwa, Ṅua, ọzọ kwa, camel-gi ka m'gēme ka ha ṅua: ka ọ buru nwayi ahu ka I rọputaworo nye orù-gi, bú Aisak; ọ bu kwa nime nka ka m'gāmara na I meworo onye-nwem ebere.
15
O rue na, tutu o kwusia okwu, le, Rebeka nāputa, bú nwayi amuru nye Betuel nwa-nwoke Milka, bú nwunye Nehoa, nwa-nne Abraham, ite-ya di kwa n'ubu-ya.
16
Nwa-ab͕ọghọ ahu di nma nke-uku ile anya, nwayi nke akāmaghi nwoke, nwoke amaghi kwa aru-ya: ọ rida n'isi-iyi ahu, b͕ajue ite-ya, rigota.
17
Orù ahu we b͕a ọsọ izute ya, si, Biko, kwe ka m'ṅua nwantī miri site n'ite-gi.
18
Ọ si, Nua, onye-nwem: ọ me ngwa, zie ite-ya n'aka-ya, me ka ọ ṅua.
19
Mb͕e ọ mesiri ka ọ ṅua, nwayi ahu siri, Kamel gi ka m'gēsere kwa miri, rue mb͕e ha gāṅujuwori.
20
Ọ me ngwa, b͕apu miri di n'ite-ya nime ihe anu-ulo ji aṅu miri, ọ b͕a ọsọ ọzọ rue olùlù-miri isere miri, we sere nye camel-ya nile.
21
Nwoke ahu nēlegide ya anya, nāb͕a nkiti, imara ma Jehova mereri ka ije-ya ga nke-ọma, ma-ọbu na O meghi.
22
O rue, mb͕e camel ṅujusiri miri, na nwoke ahu were nb͕a-aka ọla-edo, nke ọtùtù-ya bu nkera shekel, na ọla-aka abua ib͕a n'aka-ya abua nke ọtùtù-ha bu shekel ọla-edo iri;
23
ọ si, Ǹwa onye ka i bu? biko, gosim. Ọ̀ di ọnọdu n'ulo nna-gi ayi gēnwe inọ ọnọdu-abali?
24
Nwayi ahu we si ya, Nwa Betuel ka m'bu, bú nwa Milka, nke ọ muru nye Nehoa.
25
Ọ sikwara ya, Ma okporo-ọka ma nri-anu-ulo riri nne n'ulo-ayi, ebe inọ ọnọdu-abali di kwa.
26
Nwoke ahu we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova,
27
si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, bu, Onye nārapughi ebere-Ya na ezi-okwu-Ya n'ebe onye-nwem nọ: mu onwem, n'uzọ ka Jehova duworom rue ulo umu-nne onye-nwem.
28
Nwa-ab͕ọghọ ahu we b͕a ọsọ, gosi ulo nne-ya dika okwu ndia si di.
29
Ma Rebeka nwere nwa-nne nwoke, nke aha-ya bu Leban: Leban we b͕akuru nwoke ahu n'èzí, rue isi-iyi ahu.
30
O rue, mb͕e ọ huru nb͕a-aka ahu, na ọla-aka abua di n'aka nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ọ nukwara okwu nile nke Rebeka nwa-nne-ya nwayi, si, Otú a ka nwoke ahu gwaram; na o biakutere nwoke ahu; ma, le, o nēguzo n'akuku camel-ya n'akuku isi-iyi ahu.
31
O we si, Bata, gi onye agọziri agọzi nke Jehova; n'ìhi gini ka i nēguzo n'èzí? n'ihi na mu onwem edoziwo ulo, na ebe camel-i gānọ.
32
Nwoke ahu we ba n'ulo, ọ tọpu ibu camel-ya; ọ nye ya okporo-ọka na nri-anu-ulo inye camel-ya, na miri isa ukwu-ya na ukwu ndikom ndi ya na ha yikọrọ bia.
33
Ewe dọba nri n'iru ya iri: ma ọ siri, M'gaghi-eri, rue mb͕e m'gēkwuwori okwum nile. Ọ si, Kwue.
34
Ọ si, Orù Abraham ka m'bu.
35
Jehova agọziwo kwa onye-nwem nke-uku; o we di uku: O nyewo kwa ya ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ọla-ọcha na ọla-edo, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.
36
Sera, bú nwunye nke onye-nwem, we muara onye-nwem nwa-nwoke mb͕e ọ ghọsiri agadi: o we nye ya ihe nile o nwere.
37
Onye-nwem we me ka m'ṅua iyi, si, I gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'ala-ha:
38
kama ọ bu ulo nnam ka i gējekuru, jekuru ab͕urum, lutara nwam nwunye.
39
M'we si onye-nwem, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-esom je.
40
Ọ sim, Jehova, Onye m'jeghariworo n'iru Ya, gēziga mọ-ozi-Ya ka gi na ya yikọ je, Ọ gēme kwa ka ije-gi ga nke-ọma; i gāluta-kwa-ra nwam nwunye sitere n'ab͕urum, na n'ulo nnam:
41
mb͕e ahu i gāpu n'iyi i ṅurum, mb͕e i gābiakute ab͕urum; ọ buru kwa na ha enyeghi gi ya, i gāpu kwa n'iyi i ṅurum.
42
M'we bia ta rue isi-iyi ahu, si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, ọ buru na I nēme ijem nke mu onwem nēje ka ọ ga nke-ọma:
43
le, mu onwem nēguzo n'akuku isi-iyi miri a; ka o ru kwa, na nwa-ab͕ọgho ahu nke nāputa isere miri, onye m'gāsi ya, Biko, nyem nwantī miri site n'ite-gi ka m'ṅua;
44
onye gāsikwam, Gi onwe-gi ṅua, ọzọ kwa, camel-i ka m'gēsere miri nye: ka onye ahu buru nwayi Jehova rọputaworo nye nwa nke onye-nwem.
45
Ma tutu mu onwem agwasia obim okwu, le, Rebeka nāputa, ite-ya di kwa n'ubu-ya; ọ rida n'isi-iyi ahu, sere miri; m'we si ya, Biko, kwe ka m'ṅua.
46
Ọ me ngwa, si n'ubu-ya zie ite-ya, si, Ṅua, ọzọ kwa, camel-i ka m'gēme ka ha ṅua: m'we ṅua, camel ka ọ me-kwa-ra ka ha ṅua.
47
M'we jua ya, si, Nwa ònye ka i bu? Ọ si, Nwa Betuel ka m'bu, bú nwa Nehoa, onye Milka muru nye ya: m'we tiye nb͕a-aka ahu n'imi-ya, na ọla-aka abua ahu n'aka-ya abua.
48
M'we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, gọzie Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, Onye durumri n'uzọ ezi-okwu ilutara nwa onye-nwem nwa nwa-nne-ya nwoke na nwunye.
49
Ma ub͕u a, ọ buru na unu gaje ime ebere na ezi-okwu n'ebe onye-nwem nọ, gosinum: ma ọ buru na unu agaghi-eme ya, gosinum; ka m'we che iru n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.
50
Leban na Betuel we za, si, N'aka Jehova ka okwu a siteworo: ayi apughi igwa gi ihe ọjọ ma-ọbu ezi ihe.
51
Le, Rebeka nọ n'iru gi, kuru ya, la, ka ọ ghọrọ nwa onye-nwe-gi nwunye, dika Jehova kwuworo.
52
O rue, mb͕e orù Abraham nuru okwu nile ha, na ọ kpọrọ isi ala nye Jehova.
53
Orù ahu we chiputa ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, nye Rebeka: ihe di iche iche nke di oké ọnu-ahia ka ọ nyekwara nwa-nne-ya nwoke na nne-ya.
54
Ha we rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we nọ ọnọdu-abali; ha we bilie n'ututu, ọ si, Zilagam na nke onye-nwem.
55
Ma nwa-nne-ya nwoke na nne-ya siri, Ka nwa-ab͕ọgho nọyere ayi ubọchi asa ma-ọbu iri; emesia ọ gēje.
56
Ọ si ha, Unu eb͕ochilam, ebe Jehova meworo ka uzọm ga nke-ọma; zilagam ka m'lakuru onye-nwem.
57
Ha si, Ayi gākpọ nwa-ab͕ọghọ ahu, juta ya n'ọnu-ya.
58
Ha we kpọ Rebeka, si ya, Ì gēso nwoke a je? Ọ si, M'gēje.
59
Ha we zilaga Rebeka, bú nwa-nne-ha, na nwayi nyere ya ara na nwata, na orù Abraham, na ndikom-ya.
60
Ha we gọzie Rebeka, si ya, Nwa-nne-ayi, gi onwe-gi ghọ nnù kwuru nnù madu, ọzọ, ka nkpuru-gi nweta ọnu-uzọ-ama nke ndi nākpọ ha asì.
61
Rebeka we bilie, ya na umu-ab͕ọghọ-ya, ha we nọkwasi n'elu camel-ha, so nwoke ahu je: orù ahu we kuru Rebeka, la.
62
Ma Aisak biarari site n'ije Bia-lahai-roi; n'ihi na ya onwe-ya bi n'ala Negeb.
63
Aisak we pua itughari uche-ya n'ọhia na mb͕e anyasi: ọ welie anya-ya abua, hu, ma, le, camel ufọdu nābia.
64
Rebeka we welie anya-ya abua, hu Aisak, si n'elu camel-ya rida.
65
Ọ si orù ahu, Ònye bu nwoke ahu nke nēje ije n'ọhia izute ayi? Orù ahu we si, Onye ahu bu onye-nwem: Rebeka we were ákwà-nkpudo-ya kpuchie onwe-ya.
66
Orù ahu we kọrọ Aisak akukọ bayere ihe nile o mere.
67
Aisak we me ka Rebeka bata n'ulo-ikwū Sera, bú nne-ya, o we kuru Rebeka, o we ghọ nwunye-ya; Aisak we hu ya n'anya: ewe kasie Aisak obi ka nne-ya nwusiri.
← Chapter 23
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 25 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50