bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Genesis 43
Genesis 43
Igbo 2006
← Chapter 42
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 44 →
1
Oké unwu ahu we sie ike n'ala ahu.
2
O rue, mb͕e ha risiri ọka nke ha siri n'Ijipt bute, na nna-ha siri ha, Jeghachinu, zutara ayi nwanti ihe-oriri.
3
Juda we gwa ya okwu, si, Nwoke ahu b͕asiri ayi àmà ike, si, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na nwa-nne-unu esoghi unu bia.
4
Ọ buru na i nēziga nwa-nne-ayi, ka ayi na ya we yikọ je, ayi gārida, zutakwara gi ihe-oriri:
5
ma ọ buru na i gaghi-eziga ya, ayi agaghi-arida: n'ihi na nwoke ahu siri ayi, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na unu na nwa-nne-unu ayikọghi bia.
6
Israel we si, N'ìhi gini ka unu mejọrọm, n'igosi nwoke ahu na unu nwere nwa-nne ọzọ?
7
Ha si, Nwoke ahu jusiri ajuju ike banyere ayi, banyekwara umu-nna-ayi, si, Nna-unu, ọ̀ nọ ndu ub͕u a? ọ̀ di nwa-nne-ọzọ unu nwere? ayi we gosi ya dika okwu ndia si di: àyi gāmara n'ezie na ọ gāsi, Menu ka nwa-nne-unu ridata?
8
Juda we si Israel nna-ya, Ziga nwa-okoro ahu ka mu na ya we yikọ je, ayi gēbili kwa, je; ka ayi we di ndu, ghara inwu, ma ayi, ma gi, ma umu-ntakiri-ayi.
9
Mu onwem gānọrọ ya mbe; n'akam ka i gājuta ya: ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, ọ buru kwa na akpotaghi m ya n'iru gi, emehiewokwam megide gi ubọchi ndum nile:
10
n'ihi na asi na ayi anọghi ọdù, n'ezie ayi gālatawori ub͕ò abua ndia.
11
Israel, bú nna-ha, we si ha, Ọ buru na ọ di otú a ub͕u a, menu nka; werenu ufọdu nime ihe makarisiri mma nke ala nka n'ihe-unu, wedakwara nwoke ahu onyinye-inata-iru-ọma, nwantī balm, na nwantī manu-aṅu, na uda di iche iche, na myrrh, na ákú, na almond:
12
were-kwa-nu ego okpukpu abua n'aka-unu: ego kwa nke enyegha-chiri n'ọnu akpa-unu, weghachinu ya n'aka-unu; eleghi anya ohihie-anya ka ọ bu:
13
kuru-kwa-nu nwa-nne-unu, bilie, jeghachikuru nwoke ahu:
14
Chineke Nke puru ime ihe nile, Ya nye kwa unu obi-ebere n'iru nwoke ahu, ka ọ we zitere unu nwa-nne-unu nke-ọzọ na Benjamin. Ma mu onwem, ọ buru na ab͕abaram aka umu, ab͕abawom aka umu.
15
Ndikom ahu we were onyinye-inata-iru-ọma ahu, ọ bu kwa okpukpu ego abua ka ha were n'aka-ha, na Benjamin; ha bilie, rida n'Ijipt, guzo n'iru Josef.
16
Josef we hu Benjamin n'etiti ha, ọ si onye bu onye-isi ulo-ya, Me ka ndikom ahu bata n'ulo, gi b͕u kwa anu, dozie ihe; n'ihi na mu ka ndikom ahu gēso ri ihe n'etiti-ehihie.
17
Nwoke ahu we me dika Josef siri ya; nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n'ulo Josef.
18
Ndikom ahu we tua egwu, n'ihi na emere ka ha bata n'ulo Josef; ha si, Ọ bu n'ihi ego ahu, nke enyeghachiri n'akpa-ayi na mmalite, ka anēme ka ayi onwe-ayi bata; ka ọ we chọ ayi okwu, dakwasi ayi, were ayi ibu ndi-orù, were kwa inyinya-ibu-ayi.
19
Ha we biakute nwoke ahu nso, nke bu onye-isi ulo Josef, ha gwa ya okwu n'ọnu-uzọ ulo ahu,
20
si, Biko, onye-nwem, ayi rida-tara n'ezie na nmalite izuru ihe-oriri:
21
o rue, mb͕e ayi biara n'ebe inọ ọnọdu-abali, na ayi meghere akpa-ayi, ma, le, ego onye ọ bula di n'ọnu akpa-ya, bú ego-ayi n'ọtùtù-ya zuru okè; ayi ewe-ghachiwo ya n'aka-ayi.
22
Ọ di kwa ego ọzọ ayi wedataworo n'aka-ayi izuru ihe-oriri: ayi amaghi onye tiyere ego-ayi n'akpa-ayi.
23
Ọ si Udo diri unu, unu atula egwu: Chineke-unu, na Chineke nke nna-unu, enyewo unu àkù zoro ezo n'akpa-unu: ego-unu rurum aka. Ọ me ka Simeon pukute ha.
24
Nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n'ulo Josef, ọ nye ha miri, ha we sa ukwu-ha; ọ nye kwa inyinya-ibu nile ha nri-anu-ulo.
25
Ha we dozie onyinye-inata-iru-ọma ahu rue ọbibia Josef n'etiti-ehihie: n'ihi na ha nuru na ọ bu n'ebe ahu ka ha gēri nri.
26
Josef we bata n'ulo-ya, ha we webatara ya onyinye-inata-iru-ọma ahu nke di n'aka-ha nime ulo, kpọ isi ala nye ya.
27
Ọ jua ha ajuju bayere udo-ha, si, Ọ̀ nọ n'udo, bú nna-unu, agadi ahu onye unu kwuru okwu bayere ya? Ọ̀ nọ kwa ndu?
28
Ha si, Orù-gi, bú nna-ayi, nọ n'udo, ọ nọ kwa ndu. Ha we rube isi, kpọ isi ala.
29
Ọ welie anya-ya abua, hu Benjamin nwa-nne-ya, bú nwa nke nne-ya, ọ si Ọ̀ bu nka bu nwa-nne-unu nke-ntà, onye unu gwaram okwu banyere ya? Ọ we si, Ka Chineke mere gi amara, nwam.
30
Josef we me ngwa; n'ihi na obi-ebere-ya nile di ọku n'aru nwa-nne-ya: ọ chọ ebe ọ gākwa ákwá; o we ba n'ime-ulo-ya, kwa ákwá n'ebe ahu.
31
Ọ sa iru-ya, puta, jisie onwe-ya ike, si, Dọkwasinu nri.
32
Ha we dọkwasiri ya nke ya iche, dọkwasikwara ha nke ha iche, dọkwasi-kwa-ra ndi Ijipt nke ha iche, bú ndi ya na ha nērikọ ihe: n'ihi na ndi Ijipt apughi isoro ndi-Hibru rie nri; n'ihi na ihe-árú ka nke ahu buru ndi Ijipt.
33
Ha we nọdu n'iru ya, ọkpara dika ọnọdu-ọkpara-ya si di, nke-ntà kwa dika ọnọdu-nke-ntà-ya si di; ibobo we nwurita ndikom ahu n'aru n'etiti ibe-ha.
34
Ewe si n'iru ya butere ha onyinye nri: ma onyinye nri Benjamin kariri onyinye nri ha nile ub͕o ise. Ha we so ya ṅu ihe-ọṅuṅu, we ṅujue afọ.
← Chapter 42
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 44 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50