bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Genesis 46
Genesis 46
Igbo 2006
← Chapter 45
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 47 →
1
Israel we bulie ije, ya na ndi nile o nwere, ọ biarue Bia-sheba, chuara Chineke nke nna-ya Aisak aja.
2
Chineke we gwa Israel okwu n'ọhù nke abali, si, Jekob, Jekob. Ọ si Lekwam.
3
Ọ si, Mu onwem bu Chineke, bú Chineke nke nna-gi: atula egwu irida n'Ijipt; n'ihi na mba uku ka M'gēme gi ka i ghọ n'ebe ahu.
4
Mu onwem gēso gi rida n'Ijipt; ọ bu kwa Mu onwem gēme ka i rigota kwa n'ezie: Josef gātukwasi kwa aka-ya n'anya-gi abua.
5
Jekob we si na Bia-sheba bilie: umu Israel we buru Jekob, bú nna-ha, na umu-ntakiri-ha, na nwunye nile ha, n'ub͕ọ-ala nke Fero zitereri ibu ya.
6
Ha chiri anu-ulo-ha, na àkù-ha, bú nke ha kpatarari n'ala Kenean, bata n'Ijipt, bú Jekob na nkpuru-ya nile tiyere onwe-ya:
7
ya na umu-ya ndikom, na umu-ndikom nke umu-ya ndikom, umu-ya ndinyom, na umu-ndinyom nke umu-ya ndikom, ọ bu nkpuru-ya nile ka o mere ka ha so ya bata n'Ijipt.
8
Ma ndia bu aha umu Israel, ndi batara n'Ijipt, Jekob na umu-ya ndikom: ọkpara Jekob, bú Reuben.
9
Umu-ndikom Reuben; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami.
10
Umu-ndikom Simeon; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoba, na Shaul, bú nwa nke nwayi Kenean ahu.
11
Umu-ndikom Livai; Giashon, na Kohat, na Merari.
12
Umu-ndikom Juda; Ia, na Onan, na Shila, na Perez, na Zera: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean. Umu-ndikom Perez bu kwa Hezron, na Hamul.
13
Umu-ndikom Isaka; Tola, na Puva, na Job, na Shimron.
14
Umu-ndikom Zebulun: Sered, na Ilon, na Jahleel.
15
Ndia bu umu-ndikom Lia, nke ọ muru nye Jekob nime Padan-eram, ha na Daina, bú nwa-ya nwayi nkpuru-obi nile nke umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom bu orú na iri na atọ
16
Umu-ndikom Gad; Zifyon, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Iri, na Arodi, na Areli.
17
Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi: umu-ndikom Beria kwa; Heba na Malkiel.
18
Ndia bu umu-ndikom Zilpa, onye Leban nyere Lia nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia, bú nkpurui-obi iri na isi.
19
Umu-ndikom Rechel, bú nwunye Jekob; Josef na Benjamin.
20
Ewe muara Josef n'ala Ijipt Manase na Efraim, ndi Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya.
21
Umu-ndikom Benjamin; Bela na Beka, na Ashbil, na Gira, na Neaman, na Ihi, na Rosh, na Mupim, na Hupim, na Ad.
22
Ndia bu umu-ndikom Rechel, ndi amuru nye Jekob: nkpuru-obi nile di iri na anọ.
23
Umu-ndikom Dan; Hushim.
24
Umu-ndikom Naftali; Jahzeel, na Guni, na Jiza, na Shilem.
25
Ndia bu umu-ndikom Bilha, onye Leban nyere Rechel nwa-ya nwayi, ọ we muara Jekob ndia: nkpuru-obi nile di asa.
26
Nkpuru-obi nile Jekob nwere ndi batara n'Ijipt, ndi siri n'úkwù-ya puta, nāgughi nwunye nile nke umu Jekob, nkpuru-obi nile di ọgu atọ na isi;
27
umu-ndikom Josef, ndi amuru nye ya n'Ijipt, di kwa nkpuru-obi abua; nkpuru-obi nile nke ulo Jekob, ndi nābata n'Ijipt, di ọgu atọ na iri.
28
Ma ọ bu Juda ka o zigara n'iru ya jekuru Josef, igosi ya uzọ n'iru ya rue Goshen; ha we bata n'ala Goshen
29
Josef we dozie ub͕o-ala-ya, rigorue Goshen izute Israel, bú nna-ya; ọ me ka ọ hu ya anya, ọ we dakwasi ya n'olu, kwa ákwá n'olu-ya mb͕e di anya.
30
Israel we si Josef, Ka m'nwua ub͕u a, mb͕e m'husiri iru-gi, na i nọ ndu rue ub͕u a.
31
Josef we si umu-nne-ya, si kwa ulo nna-ya, M'gārigo, gosi Fero, si ya, Umu-nnem na ulo nnam, ndi nọ n'ala Kenean, abiakutewom;
32
ma ndikom ahu bu ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu, n'ihi na ndi ọlu-ha bu iche anu-ulo ka ha bu-woro; ọ bu kwa ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na ihe nile ha nwere, ka ha chitaworo.
33
Ma o gēru, mb͕e Fero gākpọ unu, si kwa, Gini bu ọlu unu nālu?
34
na unu gāsi, Ndi ọlu-ayi bu iche anu-ulo ka ndi orù-gi buworo site na mb͕e ayi di na nwata we rue ub͕u a, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà: ka unu we biri n'ala Goshen; n'ihi na onye ọ bula nāzù ìgwè ewu na aturu bu ihe-árú n'anya ndi Ijipt.
← Chapter 45
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 47 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50