bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Genesis 45
Genesis 45
Igbo 2006
← Chapter 44
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 46 →
1
Ma Josef apughi ijisi onwe-ya ike n'iru ndi nile guzoworo onwe-ha n'akuku ya; o we kpọ òkù, si, Me ka madu ọ bula si n'ebe m'nọ pua. Ọ dighi kwa onye ọ bula guzoro n'ebe ọ nọ, mb͕e Josef mere ka umu-nne-ya mara ya.
2
Ọ we welie olu-ya n'ikwa-ákwá: ndi Ijipt we nu, ulo Fero nukwara.
3
Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem bu Josef; nnam, ọ nọ ndu ub͕u a? Ma umu-nne-ya apughi iza ya; n'ihi na ha mara jijiji n'iru ya.
4
Josef we si umu-nne-ya, Biko, biakutenum nso. Ha we bia nso. Ọ si, Mu onwem bu Josef nwa-nne-unu, onye unu rere je n'Ijipt.
5
Ma ub͕u a ya ewutala unu, ya abu-kwa-la ihe iwe iwe di ọku n'anya-unu, na unu rerem bia n'ebe a: n'ihi na ọ bu idebe ndu ka Chineke zìrim ga n'iru unu.
6
N'ihi na arọ abua ndia ka oké unwu a di n'etiti ala: arọ ise fọdu-kwa-ra nke ilu-ọlu-ubi na owuwe-ihe-ubi nāgaghi-adi.
7
Chineke we zìem ga n'iru unu idoro unu n'uwa ndi fọduru, na idebere unu ndu ka unu buru oké ndi b͕apuru ab͕apu.
8
Ub͕a a kwa, Ọ bughi unu onwe-unu ziterem n'ebe a, kama Chineke: O we mem ka m'ghọrọ Fero nna, na onye-nwe ulo-ya nile, na onye nāchi ala Ijipt nile.
9
Menu ngwa, rigokuru nnam, si ya, Otú a ka nwa-gi Josef siri, Chineke, emewom ka m'ghọ onye-nwe Ijipt nile: ridakutem, atula ujọ:
10
i gēbi n'ala Goshen, nọkwam nso, gi onwe-gi, na umu-gi, na umu umu-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi, na ndi nile i nwere:
11
m'gāzù kwa gi n'ebe ahu; n'ihi na arọ ise nke oké unwu fọduru; ka ewe ghara inapu gi ihe nile, gi onwe-gi, na ulo-gi, na ndi nile i nwere.
12
Ma, le, anya-unu na anya nwa-nnem, bú Benjamin, nāhu na ọ bu ọnum nāgwa unu okwu.
13
Unu gēgosi kwa nnam nsọpurum nile n'Ijipt, na ihe nile nke unu huworo; unu gēme kwa ngwa me ka nnam ridata n'ebe a.
14
Ọ we dakwasi Benjamin, bú nwa-nne-ya, n'olu, kwa ákwá; Benjamin kwa-kwa-ra ákwá n'olu-ya.
15
Ọ we sutu umu-nne-ya nile ọnu, kwakwasi ha ákwá: emesia umu-nne-ya kpayere ya uka.
16
Ewe nu ùdé-ya n'ulo Fero, si, Umu-nne Josef abiawo: ọ di nma n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya.
17
Fero we si Josef, Si umu-nne-gi, Menu nka; bonu anumanu-unu ibu, la, ba n'ala Kenean;
18
chiri-kwa-nu nna-unu na ulo-unu, biakutem: ka m'nye kwa unu ezi ihe nke ala Ijipt, unu gēri kwa urù ala nka.
19
Ma gi onwe-gi ka enyeworo iwu, menu nka; sinu n'ala Ijipt chiri ub͕ọ-ala n'ihi umu-ntakiri-unu, na n'ihi nwunye nile unu, kuru-kwa-nu nna-unu, bia.
20
Anya-unu adi-kwa-la n'ihe-unu; n'ihi na ezi ihe nke ala Ijipt nile, ọ bu unu nwe ya.
21
Umu Israel we me otú a: Josef we nye ha ub͕ọ-ala n'okwu-ọnu Fero, o nye kwa ha ihe ha gēri n'uzọ.
22
Ha nile n'otù ka o nyere uwe-nb͕okwasi nb͕anwe; ma o nyere Benjamin ọgu nkpuru-ego ọla-ọcha iri na ọgu ise na uwe-nb͕okwasi nb͕anwe ise.
23
O ziga-kwa-ra nna-ya otú a; inyinya-ibu iri nēbu ufọdu n'ezi ihe nke Ijipt, na nne-inyinya-ibu iri nēbu ọka na achicha na nri nna-ya gēri n'uzọ.
24
Ọ we zilaga umu-nne-ya, ha la: ọ si ha, Unu esela okwu n'uzọ.
25
Ha si n'Ijipt rigo, ba n'ala Kenean, biakute Jekob nna-ha.
26
Ha gosi ya, si, Josef nọ ndu ub͕u a, ha gosi kwa ya na ọ bu ya nāchi ala Ijipt nile. Obi-ya we b͕afue, n'ihi na ọ kweghi ha.
27
Ha we gwa ya okwu Josef nile nke ọ gwara ha: mb͕e ọ huru ub͕ọ-ala nile nke Josef ziri ibute ya, mọ nke Jekob, bú nna-ha, we di ndu:
28
Israel we si, O zuwo; Josef, bú nwam, nọ ndu ub͕u a: ka m'je, hu ya anya tutu mu anwua.
← Chapter 44
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 46 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50