bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Genesis 40
Genesis 40
Igbo 2006
← Chapter 39
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 41 →
1
O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na obu-ihe-ọṅuṅu nke eze Ijipt na osi-ite-ya mehiere megide onye-nwe-ha, bú eze Ijipt.
2
Fero we we iwe megide madu abua ahu nējere ya ozi, megide onye-isi-ndi-obu-ihe-ọṅuṅu, megide kwa onye-isi ndi-osi-ite.
3
Ọ we tiye ha n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-isi ndi-ob͕ū, nime ulo-nkpọrọ, bú ebe Josef nọ n'ab͕u.
4
Onye-isi ndi-ob͕ū we me ka Josef nēlekọta ha anya, ọ we jere ha ozi: ha nọ ubọchi ufọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ.
5
Ha we rọ nrọ, ha abua, onye ọ bula ọ rọ nrọ-ya n'otù abali ahu, onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, bú obu-ihe-ọṅuṅu na osi-ite eze Ijipt nwere, ndi nọ n'ab͕u n'ulo-nkpọrọ.
6
Josef we bakute ha n'ututu, hu ha, ma, le, iru nāb͕aru ha.
7
Ọ we jua ndi ahu nējere Fero ozi, ndi nọyere ya n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-nwe-ya, si, Gini mere iru-unu ji jọ njọ taa?
8
Ha si ya, Nrọ ka ayi rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya. Josef we si ha, Ọ̀ bughi Chineke nwe akukọ-isi nrọ nile? biko, kọrọnu m.
9
Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu ahu we kọrọ Josef nrọ-ya, si ya, Na nrọm, le, osisi vine di n'irum.
10
alaka atọ di kwa n'osisi vine ahu: vine ahu we di ka ọ nāma ifuru, okoko-ya nile b͕ọwara; uyọkọ-ya nile miri nkpuru-vine chara acha:
11
iko Fero di kwa n'akam; m'were nkpuru-vine ahu, pinye ha n'iko Fero, nye iko ahu n'aka Fero.
12
Josef we si ya, Nka bu akukọ-isi-ya: alaka atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu;
13
ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi, me ka i lata n'ọnọdu-gi: i gēnye kwa iko Fero n'aka-ya, dika i nēme na mbu mb͕e i buri obu-ihe-ọṅuṅu-ya.
14
Ma otú ọ di chetam n'onwe-gi mb͕e ọ gādiri gi nma, mekwara m ebere, biko, chetakwa m n'iru Fero, me ka m'si n'ulo a pua:
15
n'ihi na ezupurum n'ala ndi-Hibru n'ezie: ọzọ kwa, n'ebe a emeghm ihe ọ bula ka ha we tinye m n'olùlù a.
16
Onye-isi ndi-osi-ite we hu na akukọ-isi nrọ a di nma, ọ we si Josef, Mu onwem di kwa na nrọm, ma, le, nkata atọ nke achicha ọcha di n'isim:
17
ufọdu nime ihe-oriri nile nke Fero nke osi ite nēsi di kwa na nkata nke kachasi elu; anu-ufe nēri kwa ha site na nkata ahu n'elu isim.
18
Josef we za, si, Nka bu akukọ-isi-ya: nkata atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu;
19
ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi wepu ya n'aru gi, kwuba gi n'elu osisi; anu-ufe gēri kwa anu-aru-gi site n'aru gi.
20
O rue, n'ubọchi nke-atọ, nke bu ubọchi ncheta ọmumu Fero, na o mere oké oriri nye ndi-orù-ya nile: o welie isi onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu na isi onye-isi ndi-osi-ite n'etiti ndi-orù-ya.
21
O me ka onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu lata n'ọnọdu-obu-ihe-ọṅuṅu-ya; o we nye iko n'aka Fero:
22
ma ọ kwubara onye-isi ndi-osi-ite: dika Josef kọrọ isi nrọ nye ha.
23
Ma onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu echetaghi Josef, kama o chezọrọ ya.
← Chapter 39
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 41 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50