bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Genesis 35
Genesis 35
Igbo 2006
← Chapter 34
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 36 →
1
Chineke we si Jekob, Bilie, rigoro Betel, biri n'ebe ahu: mekwara Chineke ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú Onye mere ka i hu Ya anya mb͕e ināb͕apu n'iru Isọ nwa-nne-gi.
2
Jekob we si ulo-ya, ọ si kwa ndi nile ya na ha bi, Wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'etiti unu, menu onwe-unu ka unu di ọcha, b͕anwe-kwa-nu uwe-unu:
3
ka ayi bili kwa, rigoro Bet-el; m'gēmekwara Chineke ebe-ichuaja n'ebe ahu, bú Onye nāzam n'ubọchi ahuhum, we nọyerem n'uzọ nke m'jere.
4
Ha we nye Jekob chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'aka-ha, na nb͕a-aka nile nke di na nti-ha; Jekob we zobe ha n'okpuru osisi terebinth nke di nso Shekem.
5
Ha we bulie ije: ujọ nke Chineke we dikwasi obodo nile nke di ha buruburu, ha achughi kwa umu-ndikom Jekob.
6
Jekob we biarue Luz, nke di n'ala Kenean (nke ahu bu Bet-el), ya onwe-ya na ndi nile ya na ha yikọrọ bia.
7
O wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, kpọ ebe ahu El-bet-el: n'ihi na ebe ahu ka Chineke kpughere Onwe-ya nye ya, mb͕e ọ nab͕apu n'iru nwa-nne-ya.
8
Debora, bú nwayi nyere Rebeka ara na nwata, we nwua, elìe ya n'okpuru Bet-el n'okpuru osisi oak: ewe kpọ aha-ya Alon-bakut.
9
Chineke we me ka Jekob hu Ya anya ọzọ, mb͕e o siri na Padan-eram bia, Ọ gọzie ya.
10
Chineke we si ya, Aha-gi bu Jekob: agaghi-akpọ aha-gi Jekob ọzọ, kama Israel gābu aha-gi: Ọ we kpọ aha-ya Israel.
11
Chineke we si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile: gi mua ọmùmù ba kwa uba; mba na nkpọkọta mba gādi site na gi, ndi-eze gēsi kwa n'úkwù-gi puta;
12
ala nke M'nyere Abraham na Aisak, gi ka M'gēnye ya, ọ bu kwa nkpuru-gi gānọchi gi ka M'gēnye ala nka.
13
Chineke we si n'ebe ọ nọ rigo n'ebe Ọ kpayere ya uka.
14
Jekob we guzo ogidi ọtọ n'ebe ahu ebe Ọ kpayere ya uka, bú ogidi nkume: ọ wusi àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya, wusa kwa manu n'elu ya.
15
Jekob we kpọ aha ebe ahu ebe Chineke kpayere ya uka Bet-el.
16
Ha we si na Bet-el bulie ije; ma uzọ fọduru ibiaru Efrat: Rechel we nāmu nwa, ime nēmesi kwa ya ike mb͕e ọ nāmu nwa.
17
O rue, mb͕e ime nēmesi, ya ike, na nwayi nke nēle ime siri ya, Atula egwu; n'ihi na nka bu kwa nwa-nwoke i gēnwe.
18
O rue, mb͕e nkpuru-obi-ya nāpu (n'ihi na ọ nwuru), na ọ kpọrọ aha-ya Ben-oni: ma nna-ya kpọrọ ya Benjamin.
19
Rechel we nwua, elìe ya n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem).
20
Jekob we guzo ogidi ọtọ n'elu ílì-ya: nke ahu bu Ogidi ílì Rechel rue ta.
21
Israel we bulie ije, seti ulọ ikwū ya n'ofè ulo-elu Ida.
22
O rue, mb͕e Israel biri n'ala ahu, na Reuben jere dinayere Bilha, bú iko-nwayi nna-ya: Israel we nu ya. Ma umu-ndikom Jekob di iri na abua:
23
umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun:
24
umu-ndikom Rechel; Josef na Benjamin:
25
umu-ndikom Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi; Dan na Naftali:
26
umu-ndikom Zilpa, bú nwani nējere Lia, ozi; Gad na Asha: ndia bu umu-ndikom Jekob, nke amuru nye ya na Padan-eram.
27
Jekob we biakute Aisak, bú nna-ya, na Mamre, bú Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), ebe Abraham na Aisak nọrọ dika ọbìa.
28
Ubọchi Aisak we buru ọgu arọ iteghete.
29
Aisak we kubie ume, nwua, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ bu agadi, ubọchi-ya jukwara ya afọ: Isọ na Jekob, bú umu-ya ndikom, we lìe ya.
← Chapter 34
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 36 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50