bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Genesis 34
Genesis 34
Igbo 2006
← Chapter 33
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 35 →
1
Daina, bú nwa-nwayi Lia, nke ọ muru nye Jekob, we pua ihu umu-ndinyom ala ahu.
2
Shekem, bú nwa-nwoke Hemoa onye-Haivait, onye-isi ala ahu, we hu ya; o kuru ya, dinayere ya, weda ya n'ala.
3
Nkpuru obi ya we rapara n'aru Daina nwa-nwayi Jekob, ọ hu nwa-ab͕oghọ ahu n'anya, gwa nwa-ab͕ọghb͕ọ ahu okwu nābà ya n'obi.
4
Shekem we gwa nna-ya Hemoa okwu, si, Lutaram nwata-nwayi a na nwunye.
5
Ma Jekob nuru na o merururi Daina nwa-ya nwayi; ma umu-ya ndikom nọyere anu-ulo-ya n'ọhia: Jekob we b͕a nkiti rue mb͕e ha biara.
6
Hemoa, bú nna Shekem, we pukuru Jekob ikpayere ya uka.
7
Umu-ndikom Jekob we si n'ọhia bata mb͕e ha nuru ya: ọ nēwuta ndikom ahu, ha nēwe iwe di ọku nke-uku, n'ihi na ọ bu ihe-nzuzu ka o mere n'Israel, n'idinayere nwa-nwayi Jekob; nke nēkwesighi ime otú a.
8
Hemoa we kpayere ha uka, si, Shekem, bú nwam, nkpuru-obi-ya nāhu nwa-unu nwayi n'anya si-ike: biko, werenu ya nye ya na nwunye.
9
Ka ayi na unu nālurita kwa nwunye; nyenu ayi umu-unu ndinyom, kurukwanu umu-ayi ndinyom n'onwe-unu.
10
Ayi na unu gēbi kwa: ala nka gādi n'iru unu; birinu nāzukwanu ahia nime ya, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe nime ya.
11
Shekem we si nna Daina, ọ si kwa umu-nne-ya, Ka m'huta amara n'iru unu, ihe unu gāsikwam m'gēnye.
12
Me ka ọ ba uba nke-uku n'isim, bú ego-ilu-nwunye na onyinye, m'gēnye dika unu gāsim, ma nyenum nwa-ab͕ọghọ ahu na nwunye.
13
Umu-ndikom Jekob we were aghughọ za Shekem na Hemoa nna-ya, we kwue, n'ihi na ọ meruru Daina nwa-nne-ha,
14
ha we si ha, Ayi apughi ime ihe a, iwere nwa-nne-ayi nwayi nye nwoke nke anēbighi úgwù; n'ihi na ihe-ita-uta ka ọ buru ayi:
15
ọ bu nání ma asi na unu eme nka ka ayi gēkwere unu: ọ buru na unu gādi ka ayi, ka ebìe nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù;
16
ayi gēnye kwa unu umu-ayi ndinyom, ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ayi gēkuru n'onwe-ayi, ayi na unu gēbi kwa, ghọ otù ndi.
17
Ma ọ buru na unu agaghi-ege ayi nti, ka ebìe unu úgwù; ayi gēkuru kwa nwa-ayi nwayi, la.
18
Okwu-ha nile we di nma n'anya Hemoa, na n'anya Shekem, bú nwa Hemoa.
19
Okorọbia ahu alaghi kwa azu ime ihe ahu, n'ihi na ihe nwa-nwayi Jekob tọrọ ya utọ: ya onwe-ya nwekwara nsọpuru kari ulo nile nke nna-ya.
20
Hemoa na Shekem nwa-ya we bia n'ọnu-uzọ-ama obodo-ha, gwa ndikom obodo-ha okwu, si,
21
Ndikom ndia, ndi-udo ka ha bu n'etiti ayi; ka ha biri kwa n'ala-ayi, zu kwa ahia nime ya; ala-ayi-kwa, le, ọ sara mbara n'aka abua n'iru ha; ka ayi lutara onwe-ayi umu-ha ndinyom na nwunye, ka ayi nye kwa ha umu-ayi ndinyom.
22
Ọ bu nání ma asi na ayi eme nka ka ndikom ahu gēkwere ayi ka ayi na ha biri, ighọ otù ndi, ọ buru na ebìe nwoke, ọ bula n'etiti ayi úgwù, dika ha onwe-ha bu ndi ebiri úgwù.
23
Anu-ulo-ha, na ihe ha nwetara, na anumanu-ha nile, ọ̀ bughi ayi gēnwe ha? ka ayi me nání nka, ka ayi kwere ha, ayi na ha gēbi kwa.
24
Ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu we ge Hemoa, ge kwa Shekem nwa-ya, nti; ewe bìe nwoke ọ bula úgwù, ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu.
25
O rue n'ubọchi nke-atọ, mb͕e o nēb͕u ha nb͕u, na madu abua n'etiti umu-ndikom Jekob, bú Simeon na Livai, umu-nne Daina, were mma-agha-ha n'otù n'otù, biakwasi obodo ahu mb͕e ọ di na ntukwasi-obi, ha we b͕ue ndikom nile.
26
Hemoa na Shekem nwa-ya ka ha b͕u-kwa-ra n'ọnu mma-agha, ha we kuputa Daina n'ulo Shekem, pua.
27
Umu-ndikom Jekob biakwasiri ndi eb͕uru eb͕u, luta obodo ahu n'agha, n'ihi na ha merururi nwa-nne-ha nwayi.
28
Ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha na inyinya-ibu nile ha, na ihe nke di n'obodo ahu, na ihe nke di n'ohia-ya, ka ha chiri;
29
àkù-ha nile, na umu-ntakiri-ha nile, na ndinyom-ha, ka ha dọtara n'agha, luta kwa ha n'agha, bú ihe nile nke di n'ulo-ha.
30
Jekob we si Simeon na Livai, Unu emekpawom aru, n'imem ka m'sì ísì n'etiti ndi bi n'ala nka, n'etiti ndi Kenean, na n'etiti ndi-Perizait: mu onwem kwa, ebe m'nwere ndikom ole-na-ole, ha gāchikọta onwe imegidem, tigbue m, agēme kwa ka m'tọb͕ọrọ n'efu, mu onwem na ulom
31
Ha we si, Ọ̀ gēme nwa-nne-ayi nwayi dika anēme nwayi nākwa iko?
← Chapter 33
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 35 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50