bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Genesis 49
Genesis 49
Igbo 2006
← Chapter 48
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 50 →
1
Jekob we kpọ umu-ya ndikom òkù, si: Chikọtanu onwe-unu, ka m'we gosi unu ihe gādakwasi unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.
2
Zukọnu, nukwanu, umu-ndikom Jekob; Genu nti n'olu Israel, bú nna-unu.
3
Reuben, ọkparam ka i bu, ikem, na nkpuru mbu nke umem; Ọkaka nke nbuli-elu, na ọkaka nke ike.
4
I nāb͕oghari dika miri, akarila akari; N'ihi na i rigoro n'ihe-ndina nna-gi: Mb͕e ahu i mere ya ka ọ ghara idi nsọ: ọ rigoro n'utem.
5
Simeon na Livai bu nwa-nne; Ihe nke ihe-ike bu mma-agha-ha.
6
Abala n'ìzù-ha, nkpuru-obim; Gi na nkpọkọta-ha abula otù, nsọpurum; N'ihi na n'iwe-ha ka ha b͕uru nwoke, Ọ bu kwa n'ime ihe nātọ ha ka ha bipuru nkwonkwo-ukwu ehi.
7
Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n'ihi na ọ di ike; Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n'ihi na o sika ike: M'gēkesa ha nime Jekob, B͕asa kwa ha n'Israel.
8
Juda, gi onwe-gi, umu-nne-gi gēkele gi: Aka-gi di n'olu ndi-iro-gi; Umu-ndikom nna-gi gākpọ isi ala nye gi.
9
Nwa-ọdum ka Juda bu; N'anu adọb͕uru, nwam, ka i siworo rigo; O ruru ala, ọ makpuru dika ọdum, Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?
10
Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya, Rue mb͕e Shailo gābia; Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.
11
O nēlibe nwa-inyinya-ibu-ya n'osisi vine, O nēlibe kwa nwa nke nne-inyinya-ibu-ya n'osisi vine kachasi nma; Ọ suworo uwe-ya nime manya-vine, Su kwa ákwà-nb͕okwasi-ya n'ọbara nkpuru-vine:
12
Anya-ya abua nācha ọbara-ọbara site na manya-vine, Ezé-ya nēnwu kwa ọcha site na miri-ara-ehi.
13
Zebulun, n'ọnu-miri nke oké osimiri ka o gēbi: Ya onwe-ya gānọ kwa n'ọnu-miri nke ub͕o. Akuku-ya gādi kwa n'akuku Zaidon.
14
Isaka bu inyinya-ibu di ike, Nāmakpuru n'etiti ogige-aturu abua:
15
Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma, Hu kwa ala ahu, na ọ di uto; Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu, We ghọ onye nēfè òfùfè orù.
16
Dan gēkpeputa ndi-ya, Dika otù nime ebo nile nke Israel.
17
Ka Dan buru agwọ n'uzọ, Aju-ala n'okporo-uzọ, Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru, Onye o nēbu we daghachi azu.
18
Nzọputa-Gi ka m'cheworo, Jehova
19
Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya: Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n'ikiri-ukwu.
20
Asha ka abuba si aputa, bú nrí-ya, Ya onwe-ya gēnye kwa ihe-utọ di iche iche nke eze.
21
Naftali bu nne-ele arapuworo arapu: Bú onye ahu nke nēnye okwu-ọnu nile di utọ.
22
Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu, Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n'akuku isi-iyi; Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi.
23
Ndi-ọ̀kà-uta mere ya ihe-ilú, B͕a kwa ya àkú, kpọ kwa ya asì:
24
Ma uta-ya nānọgide n'idi-ike, Ab͕a-kwa-ra ogwe-aka-ya abua ume, Site n'aka Dike nke Jekob, (N'ebe ahu ka onye-ọzùzù-aturu si bia, bú nkume Israel,)
25
Site na Chineke nke nna-gi; Ya yere gi aka! Na Onye Nke puru ime ihe nile; Ya gọzie gi! Ngọzi nile nke elu-igwe site n'elu, Ngọzi nile nke ob͕u-miri nke nāma-kpu n'okpuru, Ngọzi nile nke ara na nke àkpà-nwa.
26
Ngọzi nile nke nna-gi Adiwo ike kari ngọzi nile nke ndi murum Rue ókè nke ugwu ebighi-ebi: Ha gādi n'isi Josef, Na n'opù-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya.
27
Benjamin bu wolf nke nādọb͕u anu: N'ututu o nēri anu ọ dọb͕uru, N'anyasi o nēkesa kwa ihe ọ kwatara.
28
Ndia nile bu ebo Israel iri na abua: nka bu kwa ihe nna-ha gwara ha, ọ we gọzie ha; onye ọ bula n'ihe nke di ka ngọzi-ya si di, otú a ka ọ gọziri ha.
29
Ọ we nye ha iwu, si ha, Anāchikọta mu onwem na ndi nkem n'ala-mọ: lìenum n'ebe nnam-hà di n'ọb͕à nke di n'ọhia nke Efron, bú onye Het,
30
n'ọb͕à nke di n'ọhia Makpila, nke di n'iru Mamre, n'ala Kenean, nke Abraham zutara, ya na ọhia ahu, n'aka Efron onye Het, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì:
31
n'ebe ahu ka ha lìri Abraham na Sera nwunye-ya; n'ebe ahu ka ha lìri Aisak na Rebeka nwunye-ya; ọ bu kwa n'ebe ahu ka m'liri Lia:
32
azutara ọhia ahu na ọb͕à ahu nke di nime ya n'aka umu Het.
33
Jekob we nyebie umu-ya ndikom iwu, chikọta ukwu-ya n'ihe-ndina-ya, kubie ume, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.
← Chapter 48
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 50 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50