bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Leviticus 13
Leviticus 13
Igbo 2006
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 14 →
1
Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
2
Madu, mb͕e ihe-otutó, ma-ọbu ọnyá, ma-ọbu ntupọ nke nēke uke, di n'akpukpọ nke anu-aru-ya, mb͕e ihe ahu gāghọ n'akpukpọ nke anu-aru-ya ihe-otiti ekpenta, agēme kwa ka ọ biakute Eron, bú onye-nchu-àjà, ma-ọbu biakute otù nime umu-ya ndikom, bú ndi-nchu-àjà:
3
onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu di n'akpukpọ nke anu-aru-ya: ma ọ buru na aji nke di n'ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọchā, ọ buru kwa na, n'ile ihe-otiti ahu anya, ọ di omimi kari akpukpọ anu-aru-ya, ihe-otiti ekpenta ka ọ bu: onye-nchu-aja gāhu kwa ya, si na ọ ruru árú.
4
Ma ọ buru na ntupọ ahu nke nēke uke di ọcha n'akpukpọ anu-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na aji-ya abanweghi ọcha, onye-nchu-àjà gēme-chibido onye nwere ihe-otiti ahu nime ulo abali asa:
5
onye-nchu-àjà gāhu kwa ya anya n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu eguzo n'anya-ya, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ:
6
onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa ọzọ: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha; ọnyá efu ka ọ bu; ọ gāsu kwa uwe-ya, di ọcha.
7
Ma ọ buru na ọnya ahu aba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e emesiri ka onye-nchu-àjà hu ya ime ka ọ di ọcha, ọ gēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya nke ub͕ò abua:
8
onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọnyá ahu abawo aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ ruru árú: ekpenta ka ọ bu.
9
Mb͕e ihe-otiti ekpenta di n'aru madu, agēme kwa ka ọ biakute onye-nchu-àjà;
10
onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na ihe-otutó ọcha di n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ihe ahu emewo aji ka ọ b͕anwe ọcha, onyá nke anu-aru ndu adi kwa n'ihe-otutó ahu,
11
ekpenta site na mb͕e ochie ka ọ bu n'akpukpọ anu-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọ gaghi-emechibido ya nime ulo; n'ihi na onye ruru árú ka ọ bu.
12
Ọ buru kwa na ekpenta ab͕awaputa nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, ekpenta ahu ewe kpuchie akpukpọ-aru nile nke onye nwere ihe-otiti ahu site n'isi-ya we rue ukwu-ala-ya, ọbuná ihe nile anya onye-nchu-àjà nāhu;
13
onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ekpenta ekpuchiwo anu-aru-ya nile, ọ gāsi kwa na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: aru-ya nile ab͕anwewo ọcha: ọcha ka ọ di.
14
Ma n'ubọchi anāhu anu-aru ndu nime ya, ọ gāru árú.
15
Onye-nchu-àjà gāhu kwa anu-aru ndu ahu, si na ọ ruru árú: anu-aru ndu ahu, ihe ruru árú ka ọ bu: ekpenta ka ọ bu.
16
Ma-ọbu mb͕e anu-aru ndu ahu gātughari, b͕anwe ọcha, ọ gābiakute kwa onye-nchu-àjà,
17
onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọcha, onye-nchu-àjà gāsi na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: ọcha ka ọ di.
18
Ọzọ, anu-aru, mb͕e ihe-ofifi di nime ya n'akpukpọ-aru-ya, ma eme ka ọ la.
19
ihe-otutó ọcha we di n'ọnọdu ihe otiti ahu, ma-ọbu ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, agēme ka onye-nchu-àjà hu ya;
20
onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọ di ala, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji-ya ab͕anwewo kwa ọcha, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, n'ihe-ofifi ahu ka ọ b͕awaputaworo.
21
Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú ya, ma, le, aji ọcha adighi nime ya, ọ dighi kwa ala kari akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, onye-nchu-àjà gēmechibido ya nime ulo ubọchi asa;
22
ma ọ buru na ọ ba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ka ọ bu.
23
Ma ọ buru na ntupọ ahu nke nēke uke eguzo n'ọnọdu-ya, ma ọ baghi aba, apa ihe-ofifi ahu ka ọ bu; onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha.
24
Ma-ọbu anu-aru, mb͕e ọku-ọruru di n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e anu-aru ndu nke ọku-ọruru ahu gāghọ ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, ma-ọbu ọcha;
25
onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le, ọ buru na aji ab͕anwewo ọcha nime ntupọ ahu nēke uke, ọ di kwa omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; ekpenta ka ọ bu, n'ọku-ọruru ahu ka ọ b͕awaputaworo: onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu.
26
Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú ya, ma, le, aji ọcha adighi nime ntupọ ahu nēke uke ọ dighi kwa ala kari akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi; onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa:
27
onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa: ọ buru na ọ ba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu.
28
Ma ọ buru na ntupọ nke nēke uke eguzo n'ọnọdu-ya ma ọ baghi aba n'akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi; ihe-otutó nke ọku-ọruru ahu ka ọ bu, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: n'ihi na apa ọku-ọruru ahu ka ọ bu.
29
Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ihe-otiti di n'aru-ya, n'isi ma-ọbu n'afu-ọnu,
30
onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu: ma, le ọ, buru na ọ di omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na aji nācha edo edo, nke di irighiri, di nime ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọria isi ka ọ bu, ekpenta nke isi ma-ọbu nke afu-ọnu ka ọ bu.
31
Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti nke ọria-isi ahu, ma, le, ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji oji adighi kwa nime ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ihe-otiti ọria-isi ahu nime ulo ubọchi asa:
32
onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi ahu abaghi aba, ọ buru kwa na aji nke nācha edo edo adighi nime ya, ọ buru kwa na ọria-isi ahu adighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya,
33
agākọpu kwa isi-ya, ma, ọ gaghi-akọpu ọria-isi ahu: onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ọria-isi ahu ubọchi asa ọzọ:
34
onye-nchu-àjà gāhu kwa ọria-isi ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, di ọcha.
35
Ma ọ buru na ọria-isi-ya aba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya mb͕e emesiri ka ọ di ọcha;
36
onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ọria-isi abawo aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà agaghi-achọ aji nācha edo edo ahu; onye ruru árú ka ọ bu.
37
Ma ọ buru na ọria-isi ahu eguzowo n'anya-ya, ọ buru kwa na aji oji epuputawo nime ya; emewo ka ọria-isi ahu la, ọcha ka ọ di: onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha.
38
Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ntupọ di iche iche nke nēke uke, bú ntupọ nēke uke nke di ọcha, di n'akpukpọ anu-aru-ha;
39
onye-nchu-àjà gāhu kwa: ma, le, ọ buru na ntupọ di iche iche nke nēke uke acha ọcha inyoghi-inyoghi, bú nke di n'akpukpọ anu-aru-ha; ngwọ ka ọ bu, ọ b͕awa-putawo n'akpukpọ-aru-ya; ocha ka ọ di.
40
Ma onye ọ bula, mb͕e agiri-isi kwọchapuworo n'isi-ya, onye-isi-nkwọcha ka ọ bu; ọcha ka ọ di.
41
Ọ buru kwa na agiri-isi-ya akwọchapuwo n'isi-ya na nko iru-ya, onye egedege-iru-ya kwọchara akwọcha ka ọ bu: ọcha ka ọ di.
42
Ma mb͕e ihe-otiti nke di ọcha nācha ọbara di n'isi-nkwọcha ahu ma-ọbu n'egedege-iru ahu kwọchara akwọcha; ekpenta nke nāb͕awaputa n'isi-nkwọcha-ya, ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, ka ọ bu.
43
Onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ihe-otutó nke ihe-otiti ahu di ọcha nācha ọbara-ọbara n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, dika ekpenta nke akpukpọ anu-aru si di, n'ile ya anya;
44
onye-ekpenta ka ọ bu, ihe ruru árú ka ọ bu: onye-nchu-àjà aghaghi isi na ọ ruru árú; n'isi-ya ka ihe-otiti-ya di.
45
Ma onye-ekpenta, nke ihe-otiti ahu di n'aru ya, uwe-ya nile gābu ihe dọwara adọwa, agiri-isi-ya ganātọpu kwa atọpu, o gēkpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ya nke-elu, nākpọ, si, Onye ruru árú, onye ruru árú.
46
Ubọchi nile nke ihe-otiti ahu di n'aru ya ka ọ gāru árú; onye ruru árú ka ọ bu: ọ gēbi iche; n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka ebe-obibi-ya gābu.
47
Uwe kwa, mb͕e ihe-otiti ekpenta di nime ya, ma ọ bu uwe aji-anu, ma-ọbu uwe flax;
48
ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie; nke flax, ma-ọbu nke aji-anu; ma ọ bu n'akpukpọ, ma-ọbu n'ihe ije-ozi ọ bula eji akpukpọ me:
49
ọ buru kwa na ihe-otiti ahu acha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara n'uwe, ma-ọbu n'akpukpọ, ma-ọbu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula; ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, agēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya:
50
onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu, mechibido kwa ihe nwere ihe-otiti nime ulo ubọchi asa:
51
ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu n'ubọchi nke-asa: mb͕e ihe-otiti ahu baworo aba n'uwe, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'akpukpọ, nke ihe ọ bula agēji akpukpọ me iji je ozi; ekpenta nke jọb͕uru onwe-ya ka ihe-otiti ahu bu; ihe ruru árú ka ọ bu.
52
O gēsure kwa uwe ahu ọku, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, n'aji-anu ma-ọbu na flax, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke ihe-otiti ahu di nime ya: n'ihi na ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu; n'ọku ka agēsure ya.
53
Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'uwe ahu, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula;
54
onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha sua ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya, o gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ:
55
onye-nchu-àjà gāhu kwa, mb͕e asuchasiri ihe-otiti ahu: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anweghi iru-ya, ọ buru kwa na ihe-otiti ahu abaghi aba, ihe ruru árú ka ọ bu; n'ọku ka i gēsure ya: ekpenta ka ọ bu, ma ọ bu n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha.
56
Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi mb͕e asuchasiri ya, ọ gādọwapu kwa ya nime uwe ahu, ma-ọbu nime akpukpọ ahu, ma-ọbu nime nke akpara ogologo, ma-ọbu nime nke akpara uhie.
57
Ma ọ buru na anāhu ya n'uwe ub͕u a, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu na nke ihe akpukpọ ọ bula, ihe nāb͕awaputa ka ọ bu: n'ọku ka i gēsure ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya.
58
Uwe ahu kwa, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke i gāsu, ọ buru na ihe-otiti ahu esiwo nime ha wezuga onwe-ya, agāsu kwa ya nke ub͕ò abua, ọ gādi kwa ọcha.
59
Nka bu iwu nke ihe-otiti ekpenta n'uwe aji-anu ma-ọbu nke flax, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, isi na ọ di ọcha, ma-ọbu isi na ọ ruru árú.
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27