bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Leviticus 21
Leviticus 21
Igbo 2006
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 22 →
1
Jehova we si Moses, Gwa ndi-nchu-àjà, bú umu-ndikom Eron, okwu, si ha, Onye-nchu-àjà agaghi-emeru onwe-ya n'ihi madu nwuru anwu n'etiti umu-nna-ya;
2
ma-ọbughi nání n'ihi onye-aru-ya, nke di ya nso, n'ihi nne-ya, na n'ihi nna-ya, na n'ihi nwa-ya nwoke, na n'ihi nwa-ya nwayi, na n'ihi nwa-nne-ya nwoke:
3
na n'ihi nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke, nke di ya nso, nke ọ dighi mb͕e nwoke luru ya na nwunye, n'ihi ya ka ọ gēmeru onwe-ya.
4
Ọ gaghi-emeru onwe-ya, ime onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ, ebe ọ bu onye-nwe madu n'etiti umu-nna-ya.
5
Ha agaghi-eme onwe-ha isi-nkwọcha n'isi-ha, ha agaghi-akọpu kwa usọ afu-ọnu-ha, ha agaghi-eb͕u kwa eb͕ub͕u n'anu-aru-ha.
6
Ndi nsọ ka ha gāburu Chineke-ha, ha agaghi-eme kwa ka aha Chineke-ha ghara idi nsọ: n'ihi na àjà-ọku Jehova, bú nri Chineke-ha, ka ha onwe-ha nēweta nso: ha gādi kwa nsọ.
7
Ha agaghi-aluru nwayi nākwa iko na nwunye, ma-ọbu nwayi nke emeworo ka ọ ghara idi nsọ; ha agaghi-alu kwa nwayi achupuru achupu n'aru di-ya: n'ihi na nsọ ka ọ di n'ebe Chineke-ya nọ.
8
I gēdo kwa ya nsọ; n'ihi na nri Chineke-gi ka ya onwe-ya nēweta nso: nsọ ka ọ gādi n'ebe i nọ: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, di, Nke nēdo gi nsọ.
9
Nwa-nwayi nke onye-nchu-aja ọ bula kwa, mb͕e ọ gēme onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ site n'ikwa iko, nna-ya ka nwanyi ahu nēme ka ọ ghara idi nsọ: n'ọku ka agēsure ya.
10
Ma onye-nchu-àjà n'etiti umu-nna-ya, onye awukwasiworo manu nke otite-manu n'isi-ya, onye emejuwo-kwa-ra aka-ya iyiri uwe ahu, ọ gaghi-atọpu agiri-isi-ya, ọ gaghi-adọwa kwa uwe-ya;
11
ọ gaghi-abakuru kwa madu nwuru anwu, ọ gaghi-emeru kwa onwe-ya n'ihi nna-ya, ma-ọbu n'ihi nne-ya;
12
ọ gaghi-esi kwa n'ebe nsọm pua, ọ gaghi-eme kwa ka ebe nsọ Chineke-ya ghara idi nsọ; n'ihi na nkewapu nke manu nke otite-manu nke Chineke-ya dikwasi ya: Mu onwem bu Jehova.
13
Ya onwe-ya gāluru nwunye mb͕e ọ di na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke.
14
Nwayi-di-ya nwuru, ma-ọbu nke achupuru achupu, ma-ọbu nke emere ka ọ ghara idi nsọ, bú nwayi nākwa iko, ndia ka ọ nāgaghi-aluru na nwunye: ma nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke nke sitere n'umu-nna-ya ka ọ gāluru na nwunye.
15
Ọ gaghi-eme kwa ka nkpuru-ya ghara idi nsọ n'etiti umu-nna-ya: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ya nsọ.
16
Jehova we gwa Moses okwu, si,
17
Gwa Eron okwu, si, Nwoke ọ bula nke nkpuru-gi rue ọb͕ọ-ha nile nke ọlu di n'aru ya, ya abiarula nso iweta nri Chineke-ya nso.
18
N'ihi na nwoke ọ bula nke ọlu di n'aru ya, ọ gaghi-abiaru nso: nwoke nke bu onye-ìsì, ma-ọbu onye-ngwurọ, ma-ọbu nke nwere imi-npia, ma-ọbu nke nwere n'aru-ya ihe ibe-ya nēnweghi,
19
ma-ọbu nwoke nke ukwu kpajiri, akpaji, ma-ọbu aka kpajiri akpaji, di n'aru ya,
20
ma-ọbu onye-nkpunkpu-azu, ma-ọbu onye-ùkpọ̀, ma-ọbu nke nwere ntupọ n'anya-ya, ma-ọbu nke àb͕à nāta, ma-ọbu nke nwere ire-ebube, ma-ọbu nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia;
21
ọ dighi nwoke ọ bula nke nkpuru Eron onye-nchu-àjà, nke ọlu di n'aru ya, gābiaru nso iweta àjà-ọku Jehova nso: ọlu di n'aru ya; ọ gaghi-abiaru nso iweta nri Chineke-ya nso.
22
Nri Chineke-ya, nke sitere n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, na n'ihe nsọ nile, ka o gēri.
23
Nání na ọ gaghabà rue ákwà-nb͕ochim, ọ gaghi-abiaru kwa nso ebe-ichu-àjàm, n'ihi na ọlu di n'aru ya; ka ọ we ghara ime ka ebe nsọm nile ghara idi nsọ: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.
24
Moses we gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu.
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 22 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27