bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Leviticus 3
Leviticus 3
Igbo 2006
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 4 →
1
Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ihe àjà nke àjà-udo; ọ buru na ọ bu ihe si n'ìgwè ehi puta ka ya onwe-ya nēweta nso, ma ọ bu oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso n'iru Jehova.
2
O gēbikwasi aka-ya n'isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.
3
O gēsi kwa n'ihe àjà nke àjà-udo weta nso àjà-ọku ichuru Jehova; bú abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,
4
na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku ákwù-ya, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwuzuga ya).
5
Umu-ndikom Eron gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku, nke di n'elu nkú nke di n'elu ọku: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova.
6
Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso, nke, ọ nēnye ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo ichuru Jehova, esi n'ìgwè ewu na aturu puta; oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso.
7
Ọ buru na ọ bu aturu ka ya onwe-ya nēweta nso ibu onyinye-ya iji biaru nso, ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova:
8
ọ gēbikwasi aka-ya n'isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n'iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.
9
O gēsi kwa n'ihe àjà nke àjà-udo weta nso àjà-ọku ichuru Jehova: bú abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba n'izu-okè-ya, (n'ebe ọkpukpu-azu-ya di ka ọ gēwezuga ya); na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,
10
na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya).
11
Onye-nchu-àjà gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku anāchuru Jehova.
12
Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ewu, ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova.
13
O gēbikwasi aka-ya n'isi-ya, b͕u kwa ya n'iru ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.
14
O gēsi kwa nime ya weta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova; abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,
15
na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya).
16
Onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku, ka ọ buru ihe ísì utọ: abuba nile bu ihe Jehova nwere.
17
Ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile, na unu agaghi-eri abuba ọ bula ma-ọbu ọbara ọ bula.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27