bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Leviticus 17
Leviticus 17
Igbo 2006
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 18 →
1
Jehova we gwa Moses okwu, si,
2
Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu, si ha; Nka bu ihe nke Jehova nyeworo n'iwu, si,
3
Nwoke ọ bula nke ulo Israel, nke nēb͕u ehi, ma-ọbu nwa-aturu, ma-ọbu ewu, n'omuma-ulo-ikwū, ma ọbu nke nēb͕u ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū,
4
ma ọ wetaghi ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, iweta ya nso ka ọ buru onyinye iji biaru nso Jehova n'iru ebe-obibi Jehova: ọbara ka agāguru nwoke ahu; ọbara ka ọ wusiworo; agēbipu kwa nwoke ahu n'etiti ndi-ya:
5
ka umu Israel we weta àjà nile ha, nke ha onwe-ha nāchu n'ọhia sara iru, ọbuná ka ha we wetara ha Jehova, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, were ha biakute onye-nchu-àjà, chua ha ka ha buru ihe àjà nke àjà udo anāchuru Jehova.
6
Onye-nchu-àjà gāwusa ọbara-ha n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru ihe ísì utọ anāchuru Jehova.
7
Ha agaghi-achu-kwa-ra nkpi àjà-ha ọzọ, nke ha onwe-ha so nākwa iko. Ukpuru ebighi-ebi ka nka gāburu ha rue ọb͕ọ-ha nile.
8
I gāsi kwa ha, Nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēsure àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ,
9
ma ọ wetaghi ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute imere ya Jehova, agēbipu kwa nwoke ahu n'etiti umu-nna-ya.
10
Ọzọ, nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēri ọbara ọ bula; M'gēche kwa irum megide madu ahu nke nēri ọbara, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndi-ya.
11
N'ihi na ndu nke anu-aru, n'ọbara ka ọ di: Mu onwem enyewo kwa unu ya n'elu ebe-ichu-àjà ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie-ha n'ihi na ọbara ka ọ bu nke nēkpuchi nmehie nime nkpuru-obi.
12
N'ihi nka ka M'siri umu Israel, Ọ dighi madu ọ bula n'etiti unu gēri ọbara, ọbìa kwa, nke nọ dika ọbìa n'etiti unu, ọ gaghi-eri ọbara.
13
Ọzọ nwoke ọ bula nke sitere n'umu Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nāchu ntá ihe, ma ọ bu anu-ọhia ma-ọbu anu-ufe, nke anēri eri; ọ gāwusi kwa ọbara-ya, were ájá kpuchi ya.
14
N'ihi na ọ bu ndu nke anu-aru ọ bula; ọbara-ya, ya na ndu-ya bu otù: M'we si umu Israel, Unu erila ọbara anu-aru ọ bula: n'ihi na ndu nke anu-aru ọ bula, ọbara-ya ka ọ bu onye ọ bula nke nēri ya, agēbipu ya.
15
Madu ọ bula nke nēri ihe nwuru onye-ya, ma-ọbu ihe anu-ọhia dọb͕uru, n'etiti ndi amuru n'ala ma-ọbu n'etiti ndi-ọbìa, ọ gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ọ we di ọcha.
16
Ma ọ buru na ọ sughi ha, ọ buru kwa na ọ saghi anu-aru-ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya.
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27