bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Leviticus 15
Leviticus 15
Igbo 2006
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 16 →
1
Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
2
Gwanu umu Israel okwu, si ha, Nwoke ọ bula, mb͕e orùrù di sitere n'anu-aru-ya, n'ihi orùrù-ya onye ruru árú ka ọ bu.
3
Nka gābu kwa ọrurú n'orùrù-ya: ma ọ bu na anu-aru-ya nērù n'orùrù-ya, ma ọ bu na eb͕ochiwo anu-aru-ya n'orùrù-ya, orurú-ya ka ọ bu.
4
Ihe-ndina ọ bula nke onye nwere orùrù ahu nēdinakwasi gāru árú: ihe ọ bula kwa nke ọ nānọkwasi gāru árú.
5
Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
6
Onye nānọkwasi n'ihe nke onye nwere orùrù nānọkwasi gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
7
Onye nēmetu anu-aru nke onye ahu nwere orùrù gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
8
Ọzọ, mb͕e onye nwere orùrù gābusa onye di ọcha ọnu-miri: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
9
Ihe ọ bula eji anọkwasi anumanu nke onye nwere orùrù nānọkwasi gāru kwa árú.
10
Onye ọ bula nke nēmetu ihe ọ bula di n'okpuru ya aru gāru árú rue anyasi: onye nēbu kwa ha gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
11
Onye ọ bula nke onye nwere orùrù nēmetu aka, mb͕e ọ nāṅachaghi aka-ya abua na miri, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
12
Ihe ájá kwa, nke onye nwere orùrù nēmetu aru, agētiwa ya: ihe osisi ọ bula kwa, agāṅacha ya na miri.
13
Ma mb͕e emeworo onye nwere orùrù ka ọ di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa ime ka ọ di ọcha, ọ gāsu kwa uwe-ya nile: ọ gāsa kwa anu-aru-ya nime miri nērù erù, ọ gādi kwa ọcha.
14
Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, bia n'iru Jehova rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, nye ha onye-nchu-àjà:
15
onye-nchu-àjà gēme kwa ha, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù-ya.
16
Nwoke ọ bula, mb͕e ure-ya gēsi n'aru-ya pua, ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya nile, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
17
Uwe ọ bula, ma-ọbu akpukpọ ọ bula, nke ure dikwasi ya, agāsu ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
18
Nwayi kwa, onye nwoke nēdinayere, nke ọ rara aru n'aru-ya, ha abua gēwere miri sa aru-ha, ha gāru kwa árú rue anyasi.
19
Ọzọ, nwayi, mb͕e ọ nwere orùrù, ma orùrù-ya nke di n'anu-aru-ya bu ọbara ubọchi asa ka ọ gānọ n'idi-na-nsọ-ya: onye ọ bula nke nēmetu ya aru gāru kwa árú rue anyasi.
20
Ihe ọ bula nke o nēdinakwasi n'idi-na-nsọ-ya gāru kwa árú: ihe ọ bula kwa nke ọ nānọkwasi gāru árú.
21
Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
22
Onye ọ bula nke nēmetu ihe ọ bula ọ nānọkwasi aru gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
23
Ọ buru kwa na ọ bu n'ihe-ndina ka ọ dikwasi, ma-ọbu n'ihe nke ya onwe-ya nānọkwasi, mb͕e ọ nēmetu ya aru, ọ gāru árú rue anyasi.
24
Ọ buru kwa na ya nwoke edina ma-ọli, idi-na-nsọ-ya adikwasi n'aru nwoke ahu, ọ gāru árú ubọchi asa; ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi gāru kwa árú.
25
Nwayi ọ bula kwa, mbe o nwere orùrù-ọbara nēru ọtutu ubọchi, ma ọ dighi na mb͕e idi-na-nsọ-ya, ma-ọbu mb͕e ọ nwere orùrù gabiga mb͕e idi-na-nsọ-ya; ubọchi nile nke orúrú nke ọrurú-ya ọ gādi ka ubọchi idi-na-nsọ-ya; onye ruru árú ka ọ bu.
26
Ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi ubọchi nile nke orùrù-ya gādi ya ka ihe-ndina idi-na-nsọ-ya: ihe ọ bula nke ọ nānọkwasi gāru kwa árú, dika ọrurú idi-na-nsọ-ya.
27
Onye ọ bula nke nēmetu ha aru gāru kwa árú, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
28
Ma ọ buru na emewo ka nwayi ahu di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa, emesi kwa ọ gādi ọcha.
29
N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, wetara ha onye-nchu-àjà, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.
30
Onye-nchu-àjà gēme kwa otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù nke ọrurú-ya.
31
Unu gēkewapu kwa umu Israel n'ọrurú-ha; ka ha we ghara inwu n'ọrurú-ha, mb͕e ha meruru ebe-obibim nke di n'etiti ha.
32
Nka bu iwu nke onye nwere orùrù, na nke onye ure-ya si n'aru-ya pua, imeru ya nime ya;
33
na nke nwayi nke aru nādighi ya ike n'idi-na-nsọ-ya, na nke onye nwere orùrù, bú orùrù nke nwoke ma-ọbu nke nwayi, na nke nwoke nke ya na nwayi ruru árú nēdina.
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 16 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27