bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Leviticus 24
Leviticus 24
Igbo 2006
← Chapter 23
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 25 →
1
Jehova we gwa Moses okwu, si,
2
Nye umu Israel iwu, ka ha wetara gi manu olive anāgwaghi agwa nke asuru asu, itiye n'ihe nēnye ìhè, iweli oriọna mb͕e dum.
3
N'èzí ákwà-nb͕ochi nke ihe-àmà, n'ulo-ikwū nzute, ka Eron gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova mb͕e dum: ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile.
4
N'elu ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka ọ gēdo oriọna nile n'usoro n'iru Jehova mb͕e dum.
5
Ọzọ, i gēwere utu ọka flour, sie ya ka ọ buru ob͕e achicha iri na abua: uzọ abua n'uzọ iri nke ephah gādiri otù ob͕e achicha.
6
I gēdo kwa ha n'usoro abua, isi n'otù usoro, n'elu table nke ọla-edo anāgwaghi agwa n'iru Jehova.
7
I gētiye kwa frankincense anāgwaghi agwa n'elu usoro ọ bula, ka ọ we ghọrọ achicha ahu ihe-ncheta, bú àjà-ọku anāchuru Jehova.
8
Kwa-ubọchi-izu-ike o gēdo ya n'usoro n'iru Jehova mb͕e dum; o sitere n'umu Israel, ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ bu.
9
Ọ gādiri Eron na umu-ya ndikom; ha gēri ya n'ebe di nsọ n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru ya sitere n'àjà-ọku nile nke Jehova, ọ bu ukpuru ebighi-ebi.
10
Nwa-nwoke nke nwayi Israel, nwoke ahu bu kwa nwa nke nwoke Ijipt, we pua je n'etiti umu Israel: nwa-nwoke nke nwayi Israel ahu na otù onye Israel we lua ọ̀gù n'ọmuma-ulo-ikwū;
11
nwa-nwoke nke nwayi Israel ahu we kpọlu Aha ahu, kọcha kwa: ha we me ka ọ biakute Moses. Aha nne-ya bu Shelomit, nwa-nwayi Dibri, nke ebo Dan.
12
Ha we me ka ọ nọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, ka ewe kọrọ ha ala okwu ahu n'ọnu Jehova.
13
Jehova we gwa Moses, okwu, si,
14
Me onye ahu nākọcha akọcha ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; ndi nile nke nuru olu-ya gēbikwasi aka-ha n'isi-ya, nzukọ nile gātub͕u ya na nkume.
15
I gāgwa kwa umu Israel okwu, si, Onye ọ bula, mb͕e ọ nākọcha Chineke-ya, o gēbu nmehie-ya.
16
Onye nākpọlu kwa aha Jehova, aghaghi ime ka ọ nwua; nzukọ Israel nile aghaghi itub͕u ya na nkume: dika anēme ọbìa, otú a ka agēme onye amuru n'ala, mb͕e ọ nākpọlu aha Jehova agēme ka ọ nwua.
17
Onye ọ bula mb͕e ọ gētipu ndu madu, aghaghi ime ka ọ nwua;
18
Onye nētipu kwa ndu anu-ulo gākwughachi ya: ndu lara ndu.
19
Ọzọ, onye ọ bula, mb͕e ọ gēme ka ọlu di n'aru madu-ibe-ya; dika ọ meworo, otú a ka agēme ya;
20
nkpaji lara nkpaji, anya lara anya, ezé lara ezé: dika o meworo ka ọlu di n'aru madu, otú a ka agēme ka ọlu di n'aru ya.
21
Onye nētib͕u anu-ulo gākwughachi ya: ma onye nētib͕u madu, agēme ka ọ nwua.
22
Otù ikpé diri unu, dika anēkpe ọbìa, otú a ka agēkpe onye amuru n'ala: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
23
Moses we gwa umu Israel okwu, ha we me onye ahu nākocha akọcha ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we tub͕ue ya na nkume. Umu Israel we me dika Jehova nyere Moses iwu.
← Chapter 23
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 25 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27