bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Leviticus 7
Leviticus 7
Igbo 2006
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 8 →
1
Nka bu kwa iwu àjà-ikpe-ọmuma: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.
2
N'ebe ha nēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka ha gēb͕u ihe àjà-ikpe-ọmuma; ọ gāwusa kwa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.
3
Abuba-ya nile ka ọ gēsi nime ya weta nso; bú akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime,
4
na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya):
5
onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà ka ọ buru àjà-ọku anāchuru Jehova: àjà-ikpe-ọmuma ka ọ bu.
6
Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: n'ebe di nsọ ka agēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.
7
Dika àjà-nmehie si di, otú a ka àjà-ikpe-ọmuma di: otù iwu diri ha: onye-nchu-àjà nke nēwere ya ikpuchi nmehie, ya onwe-ya gēnwe ya.
8
Onye-nchu-àjà nke nēweta nso àjà-nsure-ọku nke onye ọ bula, onye-nchu-àjà onwe-ya gēnwe akpukpọ nke ihe àjà-nsure-ọku nke o wetaworo nso n'onwe-ya.
9
Ọzọ, onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke anēsi n'ite-ọku, na ihe ọ bula anēme n'ihe ighe ihe, na n'ite isi ihe, onye-nchu-àjà nke nēweta ya nso, ya onwe-ya gēnwe ya.
10
Ọzọ onyinye-inata-iru-ọma ọ bula, agwara manu, ma-ọbu nke kpọrọ akpọ, umu-ndikom Eron nile gēnwe ya, otù dika ibe-ya.
11
Nka bu kwa iwu nke ihe àjà nke àjà-udo nke madu gēweta nso Jehova.
12
Ọ buru na ọ weta ya nso ka ọ buru àjà-ekele, ọ gēweta kwa nso ob͕e achicha ekoghi-eko ufọdu nke agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na ob͕e achicha ufọdu agwara manu, nke utu ọka flour dere edè, tiyere àjà-ekele ahu.
13
N'elu ob͕e achicha koro eko ufọdu ka ọ gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso tiyere àjà-ekele nke àjà-udo-ya.
14
O gēsi kwa na ya weta nso otù nime onyinye ọ bula iji biaru nso ka ọ buru àjà-nbuli ibuliri Jehova; onye-nchu-aja nke nāwusa ọbara àjà-udo, ya onwe-ya gēnwe ya.
15
Agēri kwa anu nke àjà-ekele nke àjà-udo-ya n'ubọchi nke onyinye-ya iji biaru nso; ọ gaghi-adọba ufọdu nime ya rue ututu.
16
Ma ọ buru na àjà nke onyinye-ya iji biaru nso bu nkwa ma-ọbu àjà-afọ-ofufo, n'ubọchi ọ nēweta nso àjà-ya-ka agēri ya: n'echi-ya ka agēri kwa nke fọduru nime ya:
17
ma nke fọduru nime anu nke àjà ahu, agēji ọku sure ya n'ubọchi nke-atọ.
18
Ma ọ buru na erie ufọdu nime anu nke ihe àjà nke àjà-udo-ya n'ubọchi nke-atọ n'uzọ ọ bula, ọ gaghi-atọ utọ: onye nēweta ya nso, agaghi-agu ya nye ya: ihe-árú ka ọ gābu, madu nke nēri ufọdu nime ya gēbu kwa ajọ omume-ya.
19
Anu nke meturu ihe ọ bula ruru árú, agaghi-eri ya: agēji ọku sure ya. Ma anu àjà ahu, onye ọ bula nke di ọcha gēri anu-ya:
20
ma madu nke nēri anu sitere n'ihe àjà nke-udo, nke Jehova nwere, ma ọrurú-ya di n'aru ya, agēbipu madu ahu n'etiti umu-nna-ya.
21
Ma mb͕e madu gēmetu ihe ọ bula ruru árú aru, bú ọrurú madu, ma-ọbu anumanu ruru árú, maọbu ihe-árú ọ bula ruru árú, we rie ufọdu nime anu ihe àjà-udo, nke Jehova nwere, agēbipu madu ahu n'etiti umu-nna-ya.
22
Jehova we gwa Moses okwu, si,
23
Gwa umu Israel okwu, si, Unu erila abuba ọ bula, nke ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu.
24
Abuba nke anumanu nwuru onwe-ya, na abuba nke anumanu anu-ọhia dọb͕uru, agēdozi ya iji je ozi ọ bula: ma unu erila ya ma-ọli.
25
N'ihi na onye ọ bula nke nēri abuba sitere n'anumanu nke madu si nime ya eweta nso àjà-ọku ichuru Jehova, agēbipu kwa madu nke nēri ya n'etiti umu-nna-ya.
26
Ọ dighi kwa ọbara ọ bula unu gēri n'ebe-ọbibi-unu nile, nke anu-ufe, ma ọbu nke anumanu.
27
Madu ọ bula nke gēri ọbara ọ bula, agēbipu kwa madu ahu n'etiti umu-nna-ya.
28
Jehova we gwa Moses okwu, si,
29
Gwa umu Israel okwu, si, Onye nēwetara Jehova nso ihe àjà nke àjà-udo-ya gēsi n'ihe àjà nke àjà-udo-ya wetara Jehova onyinye-ya iji biaru nso:
30
aka ya gēweta àjà-ọku nke Jehova; abuba di n'akuku okpukpu-obi ka ọ gēweta, ya na okpukpu-obi, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova.
31
Onye-nchu-àjà gēsure kwa abuba ahu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísi utọ n'ebe-ichu-àjà: ma okpukpu-obi ahu ka Eron na umu-ya ndikom gēnwe.
32
Utaku-ukwu aka-nri ka unu gēnye kwa onye-nchu-àjà ibu àjà-nbuli sitere n'ihe àjà nile nke àjà-udo-unu.
33
Onye ahu n'etiti umu-ndikom Eron nke nēweta nso ọbara nke àjà-udo nile, na abuba-ha, ya gēnwe utaku-ukwu aka-nri ahu ka ọ buru òkè-ya.
34
N'ihi na okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka M'naraworo n'aka umu Israel site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha nile, nye Eron, bú onye-nchu-àjà, nye kwa umu-ya ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi, sitere n'aka umu Israel.
35
Nka bu òkè otite-manu Eron, na òkè otite-manu umu-ya ndikom, sitere n'àjà-ọku nke Jehova, n'ubọchi O mere ka ha biarue nso iburu Jehova ndi-nchu-àjà;
36
bú nke Jehova nyere iwu ka enye ha site n'aka umu Israel, n'ubọchi O tere ha manu. Ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile.
37
Nka bu iwu diri àjà-nsure-ọku, di-kwa-ra onyinye-inata-iru-ọma, di-kwa-ra àjà-nmehie, di-kwa-ra àjà-ikpe-ọmuma, di-kwa-ra nmeju-aka, di-kwa-ra ihe àjà nke àjà-udo;
38
nke Jehova nyere Moses n'iwu n'ugwu Sainai, n'ubọchi O nyere umu Israel iwu iwetara Jehova nso onyinye-ha iji biaru nso, n'ọzara Sainai.
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27