bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Leviticus 22
Leviticus 22
Igbo 2006
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 23 →
1
Jehova we gwa Moses okwu, si,
2
Gwa Eron na umu-ya ndikom okwu, ka ha kewapu onwe-ha n'ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ndi ahu nēdorom nsọ, ka ha ghara kwa ime ka aha nsọm ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.
3
Si ha, Nwoke ọ bula nke nkpuru-unu nile rue ọb͕ọ-unu nile, nke nābiaru nso ihe nsọ nile, nke umu Israel nēdoro Jehova nsọ, ma orurú-ya di n'aru ya, agēbipu madu ahu n'irum: Mu onwem bu Jehova.
4
Nwoke ọ bula nke nkpuru Eron nke bu onye-ekpenta, ma-ọbu nke nwere orùrù; ọ gaghi-eri ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, rue mb͕e ọ di ọcha. Ọzọ, onye nēmetu ihe ọ bula ruru árú nke madu nwuru anwu aru, ma-ọbu nwoke nke ure-ya nēsi n'aru-ya pua;
5
ma-ọbu nwoke nke nēmetu ihe ọ bula nēnuputa enuputa aru, nke ruru árú n'ebe ọ nọ ma-ọbu nke nēmetu nwoke nke ruru árú n'ebe ọ nọ aru, ọbuná ọrurú-ya ọ bula;
6
madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi, ọ gagheri kwa ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, ma ọ buru na ọ saghi anu-aru-ya na miri.
7
Ma mb͕e anyanwu daworo, ọ gādi ọcha; emesia ọ gēri ihe ufọdu nime ihe nsọ nile, n'ihi na nri-ya ka ọ bu.
8
Ihe nwuru onwe-ya, ma-ọbu ihe anu-ọhia dọb͕uru, ọ gaghi-eri ya, iwere ya meru onwe-ya: Mu onwem bu Jehova.
9
Ha gēdebe kwa ihe-ndebem, ka ha we ghara ibū nmehie bayere ya, nwua nime ya, mb͕e ha nēme ya ka ọ ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.
10
Ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe nsọ ahu: onye nānọdu n'ulo onye-nchu-àjà, ma-ọbu onye egoro ọlu agaghi-eri ihe nsọ ahu.
11
Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāb͕ata madu, bú onye o ji ego-ya b͕ata, onye ahu gēri ufọdu nime ya; ya na onye amuru n'ulo-ya, ndi ahu gēri ufọdu nime nri-ya.
12
Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e onye ala ọzọ nwere ya na nwunye, nwayi ahu agaghi-eri ihe ọ bula nime àjà-nbuli nke ihe nsọ nile.
13
Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e ọ bu nwanyi di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi achupuru achupu, ma o nweghi nkpuru, o we laghachi n'ulo nna-ya, dika mb͕e ọ di na nwata, ihe nime nri nna-ya ka o gēri: ma ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe ọ bula nime ya.
14
Ma mb͕e onye ọ bula gēri ihe nsọ n'amaghi-ama, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzo ise ya n'elu ya, nye onye-nchu-àjà ihe nsọ ahu.
15
Ha agaghi-eme kwa ka ihe nsọ nke umu Israel ghara idi nsọ, bú nke ha nēbuliri Jehova;
16
ha we ghara ime ka ha nēbu ajọ omume nke ikpe-ọmuma, mb͕e ha nēri ihe nsọ ha: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.
17
Jehova we gwa Moses okwu, si,
18
Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu, si ha, Nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa n'Israel, nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú nke diri nkwa-ha nile, ma-ọbu nke diri onyinye-afọ-ofufo-ha nile, nke ha nēweta nso Jehova ka ọ buru àjà-nsure-ọku;
19
unu gēweta nso oké nke zuru okè n'etiti ìgwè ehi, ma-ọbu n'etiti aturu, ma-ọbu n'etiti ewu, ka unu we buru ihe nātọ utọ.
20
Ihe ọ bula nke ọlu di n'aru ya, unu ewetala ya nso: n'ihi na ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu.
21
Ọzọ mb͕e onye ọ bula nēweta nso Jehova ihe àjà nke àjà-udo imezu nkwa, ma-ọbu inye onyinye-afọ-ofufo, n'etiti ìgwè ehi ma-ọbu n'etiti ìgwè ewu na aruru, ihe zuru okè ka ọ gābu ibu ihe nātọ utọ: ọlu ọ bula agaghi-adi n'aru ya.
22
Ihe kpuru ìsì, ma-ọbu ihe kpajiri akpaji, ma-ọbu ihe emeruru aru, ma-ọbu ihe nwere ọnyá, ma-ọbu ihe àb͕à nāta, ma-ọbu ihe nwere ire-ebube, unu ewetala ndia nso Jehova, unu esite-kwa-la na ha chuara Jehova àjà-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Ya.
23
Oke-ehi ma-ọbu nwa-aturu nke nwere n'aru-ya ihe ibe-ya nēnweghi, ma-ọbu nke kpọrọ ùkpọ̀, onyinye-afọ-ofufo ka i gēme ya; ma ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ bayere nkwa.
24
Ihe nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia, ma-ọbu nke piara apia, ma-ọbu nke adọwapuru adọwapu, ma-ọbu nke ebipuru ebipu, unu ewetala ya nso Jehova: unu eme-kwa-la otú a n'ala-unu.
25
Unu esite-kwa-la n'aka onye ala ọzọ weta nso nri Chineke-unu site n'ihe ndia nile; n'ihi na nbibi-ha di nime ha, ọlu di n'aru ha: ha agaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu.
26
Jehova we gwa Moses okwu, si,
27
Oke-ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu, mb͕e amuru ya, ọ gādi kwa n'okpuru nne-ya ubọchi asa; ma site n'ubọchi nke-asatọ we gaba ọ gābu ihe nātọ utọ ibu onyinye iji biaru nso nke àjà-ọku anāchuru Jehova.
28
Ehi ma-ọbu aturu, unu eb͕ula ya na nwa-ya n'otù ubọchi.
29
Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà-ekele, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.
30
N'otù ubọchi ahu ka agēri ya; unu emela ka ihe fọdu nime ya rue ututu: Mu onwem bu Jehova.
31
Unu gēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu, unu gēme kwa ha: Mu onwem bu Jehova.
32
Unu eme-kwa-la ka aha nsọm ghara idi nsọ; ma agēdom nsọ n'etiti umu Israel: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ,
33
Nke nēme ka unu si n'ala Ijipt puta, ka M'we buru unu Chineke: Mu onwem bu Jehova.
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 23 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27