bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Leviticus 8
Leviticus 8
Igbo 2006
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 9 →
1
Jehova we gwa Moses okwu, si,
2
Chiri Eron na umu-ya ndikom tiyere ya, na uwe-ha, na manu otite-manu ahu, na oke-ehi nke àjà-nmehie, na ebulu abua ahu, na nkata achicha ekoghi-eko;
3
kpọkọta kwa nzukọ Israel nile n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.
4
Moses we me dika Jehova nyere ya iwu; ewe kpọkọta nzukọ ahu n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.
5
Moses we si nzukọ ahu, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka eme ya.
6
Moses we me ka Eron na umu-ya ndikom biaru nso, o were kwa miri sa ha aru.
7
O tiye n'aru ya uwe-ime ahu, were ihe ike n'úkwù ke ya, yikwasi ya uwe-nwuda, tiye ephod n'aru ya, ke ya n'ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara, were ya kegide ephod ahu n'aru ya.
8
Ọ tukwasi n'aru ya ihe-ib͕ochi-obi; tiye kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi Ìhè ahu na Izu-okè ahu.
9
Ọ tukwasi ákwà-nkukù-isi n'isi-ya; tukwasi kwa n'ákwà-nkukù-isi ahu, n'iru ya, ihe ahu di mbara nke ọla-edo, bú okpu nsọ nke onye-nchu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.
10
Moses we were manu otite-manu ahu, te ebe-obibi ahu na ihe nile nke di nime ya, do ha nsọ.
11
Ọ we fesa ufọdu nime ya n'ebe-ichu-àjà ub͕ò asa, te kwa ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri na ukwu-ala-ya, manu, ido ya nsọ.
12
Ọ wukwasi kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu n'isi Eron, te kwa ya manu, ido ya nsọ.
13
Moses we me ka umu-ndikom Eron biaru nso, o yikwasi ha uwe-ime, were ihe ike n'úkwù ke ha, ke kwa ha ihe ike n'isi; dika Jehova nyere Moses iwu.
14
Ọ kputa oke-ehi nke àjà-nmehie nso: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'oke-ehi nke àjà-nmehie.
15
O b͕ue ya; Moses we were ọbara-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu buruburu na nkpisi-aka-ya, wepu nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu: ọbara ahu ka ọ wusi-kwa-ra na ntọ-ala ebe-ichu-àjà, do ya nsọ, ikpuchiri ya nmehie.
16
Ọ were abuba nile nke di n'elu ihe-ime, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ abua, na abuba-ha, Moses we sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà.
17
Ma oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na anu-ya, na nsi-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Jehova nyere Moses iwu.
18
Ọ weta nso ebulu nke àjà-nsure-ọku: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.
19
O b͕ue ya: Moses we wusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu.
20
Ọ bọ ebulu ahu n'ọbubọ-ya; Moses we sure isi-ya na ọbubọ-ya nile na abuba-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
21
Ọ were miri sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya; Moses we sure ebulu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku ka ọ bu ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu; dika Jehova nyere Moses iwu.
22
Ọ we weta nso ebulu nke-ọzọ, bú ebulu nke nmeju-aka: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.
23
O b͕ue ya; Moses we were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya.
24
Ọ me ka umu-ndikom Eron biaru nso, Moses we were ufọdu nime ọbara ahu, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri ha, na n'isi-aka nke aka-nri-ha, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha: Moses we wusa ọbara ahu n'ebe-ichu-àjà buruburu.
25
Ọ were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba-ha, na utaku-ukwu aka-nri ya:
26
o si na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n'iru Jehova were otù ob͕e achicha ekoghi-eko, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, tukwasi ha n'abuba ahu na n'utaku-ukwu aka-nri:
27
o tiye ha nile n'elu ọbu-aka abua nke Eron, na n'elu ọbu-aka nke umu-ya ndikom, we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova.
28
Moses we wepu ha n'elu ọbu-aka-ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku ahu: nmeju-aka ka ha bu, ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu.
29
Moses were kwa okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: òkè Moses nwere ka ọ bu sitere n'ebulu nmeju-aka; dika Jehova nyere Moses iwu.
30
Moses were kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu, na ufọdu nime ọbara nke di n'elu ebe-ichu-àjà, fesa n'aru Eron, na n'elu uwe-ya, na n'aru umu-ya ndikom, na n'elu uwe umu-ya ndikom tiyere ya; ọ we do Eron nsọ, do kwa uwe-ya, na umu-ya ndikom, na uwe umu-ya ndikom, nsọ tiyere ya.
31
Moses we si Eron na umu-ya ndikom, Sienu anu-ya n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēri ya na achicha nke di na nkata nke nmeju-aka ahu, dika m'nyere n'iwu, si, Eron na umu-ya ndikom gēri ya.
32
Ma ihe nke fọduru nime anu ahu na nime achicha ahu, n'ọku ka unu gēsure ya.
33
Unu esi-kwa-la n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute pua ubọchi asa, rue ubọchi mb͕e ubọchi nile nke nmeju-aka-unu gēzu: n'ihi na ubọchi asa ka Ọ ganēmeju aka-unu.
34
Dika emere ta, otú a ka Jehova nyere iwu ime, ikpuchiri unu nmehie-unu.
35
Ọ bu kwa n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute ka unu gānọgide ehihie na abali ubọchi asa, debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, ka unu we ghara inwu: n'ihi na otú a ka enyeworom iwu.
36
Eron na umu-ya ndikom we me ihe nile Jehova nyere n'iwu site n'aka Moses.
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 9 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27