bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Leviticus 26
Leviticus 26
Igbo 2006
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 27 →
1
Unu emerela onwe-unu ihe-efu ọ bula, unu eguzoro-kwa-la onwe-unu arusi apiri api, ma-ọbu ogidi, unu etiye-kwa-la nkume emere ka o yie ihe n'ala-unu, ikpọ isi ala nye ya: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
2
Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova.
3
Ọ buru na unu ejeghari n'ukpurum nile, ọ buru kwa na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, we me ha:
4
M'gēnye kwa miri-ozuzo-unu na mb͕e-ha, ala gāmi kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ọhia gāmi kwa nkpuru-ha.
5
Nzọcha-ọka-unu gēru ọghughọ-nkpuru-vine, ọghughọ-nkpuru-vine gēru kwa ọghigha-nkpuru: unu gēriju nri-unu afọ, biri kwa n'ala-unu na ntukwasi-obi.
6
M'gēnye udo n'ala, unu gēdina kwa ala, ọ dighi kwa onye ganēme ka unu ma jijiji: M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala, mma-agha agaghi-agabiga kwa n'ala-unu.
7
Unu gāchu ndi-iro-unu, ha gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.
8
Madu ise n'etiti unu gāchu ọgu madu ise, ọgu madu ise n'etiti unu gāchu kwa orú nnù madu na nnù madu ise: ndi-iro-unu gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.
9
M'gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe unu nọ.
10
Unu gēri ihe ochie nke anēdebe site na mb͕e ochie, unu gēweputa kwa nke-ochie n'iru nke-ọhu.
11
M'gētiye ebe-obibim n'etiti unu: nkpuru-obim agaghi-asọ kwa unu oyi.
12
M'ganējeghari n'etiti unu, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi.
13
Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt, si kwa n'iburu ha ndi-orù, puta; M'tijiwo kwa nkpọrọ nile nke yoke-unu, me kwa ka unu je ije iguzo-ọtọ.
14
Ma ọ buru na unu egeghm nti, unu ewe ghara ime ihe nile ndia M'nyere n'iwu;
15
ọ buru kwa na unu aju ukpurum nile, ọ buru kwa na nkpuru-obi-unu asọ ikpém nile oyi, unu ewe ghara ime ihe nile M'nyere n'iwu, ka unu we mebie ọb͕ub͕a-ndum;
16
Mu onwem gēme kwa unu nka; M'gēme obi-ọlulọ-miri ka ọ buru onye-nlekọta-unu, bú ọtita-aru na aru-ọku, nēme ka anya-unu hubìe uzọ, nēme kwa ka nkpuru-obi-unu b͕azepu: unu gāgha kwa nkpuru-unu n'efu, ndi-iro-unu gēri kwa ya.
17
M'gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n'iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu.
18
Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti rue ihe ndia, M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa ọzọ n'ihi nmehie nile unu.
19
M'egetiji nweli-elu nke ike-unu; M'gēme kwa elu-igwe-unu ka ọ di ka ígwè, me kwa ala-unu ka ọ di ka ọla:
20
ike-unu gāgwu kwa n'efu: ala-unu agaghi-ami kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ala agaghi-ami kwa nkpuru-ha.
21
Ma ọ buru na unu ejeghari n'imegidem, we ghara ikwe igem nti; M'gātukwasi kwa unu ihe-otiti ub͕ò asa ọzọ dika nmehie-unu nile si di.
22
M'gēzite anu-ohia n'etiti unu, ha gēme kwa ka unu b͕a aka umu, ha gēb͕upu kwa anu-ulo-unu, me kwa ka unu di ole-na-ole, uzọ nile unu gātọb͕ọ kwa n'efu.
23
Ma ọ buru na adọghi unu aka na nti n'ebe M'nọ site n'ihe ndia, ma unu nējeghari n'imegidem;
24
Mu onwem gējeghari kwa n'imegide unu; M'gēti kwa unu ihe ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.
25
M'gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M'gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu; agēnye kwa unu n'aka ndi-iro.
26
Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu.
27
Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti n'ihe a, ma unu nējeghari n'imegidem;
28
M'gējeghari kwa n'imegide unu n'ọnuma; M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.
29
Unu gēri anu-aru umu-unu ndikom, anu-aru umu-unu ndinyom ka unu gēri kwa.
30
M'gēme ka ebe di elu nke unu tọb͕ọrọ n'efu, M'gēb͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, tukwasi kwa ozu-unu n'ozu nile nke arusi-unu; nkpuru-obim gāsọ kwa unu oyi.
31
M'gēme obodo nile unu nkpọnkpọ ebe, me kwa ebe nsọ unu ka ha tọb͕ọrọ n'efu, M'gaghi-anu kwa ísì utọ unu.
32
Mu onwem gēme kwa ala-unu ka ọ tọb͕ọrọ n'efu: ibobo ya gānwu kwa ndi-iro-unu n'aru, bú ndi di nime ya.
33
Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.
34
Mb͕e ahu ka ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ ala ahu utọ ubọchi nile nke itọb͕ọ-n'efu ahu, mb͕e unu onwe unu nọ kwa n'ala ndi-iro-unu; mb͕e ahu ka ala gākwusi n'ọlu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ.
35
Ubọchi nile nke itọb͕ọ-n'efu ahu ka ọ gākwusi n'ọlu: nke ọ nākwusighi n'ubọchi-izu-ike-unu, mb͕e unu biri n'elu ya.
36
Ma ndi nāfọdu n'etiti unu, M'gēme ka ida-mbà ba n'obi-ha n'ala ndi-iro-ha: olu nke akwukwọ-osisi ifufe nēfepu gāchu kwa ha; ha gāb͕alaga nb͕alaga mma-agha; ha gāda kwa mb͕e ọ dighi onye nāchu ha.
37
Ha gāsurita ngọngọ, otù n'aru ibe-ya, dika n'iru mma-agha, mb͕e onye nāchu ha adigh: ma nguzosi-ike n'iru ndi-iro-unu agaghi-adiri unu.
38
Unu gāla kwa n'iyì n'etiti mba nile ọzọ, ala ndi-iro-unu gēri kwa unu.
39
Ndi nāfọdu n'etiti unu gāta aru n'ajọ omume-ha n'ala nile nke ndi-iro-unu; ọzọ kwa, n'ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha, ha gēso kwa ha ta aru.
40
Ha gēkwuputa ajọ omume-ha, na ajọ omume nke ndi bu nna-ha, nime nmekpu-ha nke ha mekpurum, ha gēkwuputa kwa na n'ihi na ha jeghariri n'imegidem,
41
Mu onwem we nējeghari kwa n'imegide ha, me ka ha ba n'ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu;
42
M'gēcheta kwa ọb͕ub͕a-ndu Mu na Jekob b͕ara; ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Aisak b͕ara, ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Abraham b͕ara, ka M'gēcheta; ala ahu ka M'gēcheta kwa.
43
Ha gārapu kwa ala ahu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ, n'itọb͕ọ-n'efu ahu mb͕e ha nānọghi ya; ahuhu ajọ omume-ha gātọ kwa ha onwe-ha utọ: n'ihi na, ọbuná n'ihi na ikpém nile ka ha juru, ọ bu kwa ukpurum nile ka nkpuru-obi-ha sọrọ oyi.
44
Ma ọbuna n'ihe a kwa, mb͕e ha nọ n'ala ndi-iro-ha, M'gaghi-aju ha, M'gaghi-asọ kwa ha oyi, ime ka ha gwusia, na imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ha b͕ara: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke ha:
45
M'gēcheta kwa n'ihi ha ọb͕ub͕a-ndu nke ndi-mbu-ha, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya mba nile ọzọ, ka M'we buru ha Chineke: Mu onwem bu Jehova.
46
Ndia bu ukpuru na ikpé na iwu, nke Jehova nyere n'etiti Ya na umu Israel n'ugwu Sainai site n'aka Moses.
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 27 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27