bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Corinthians 1
1 Corinthians 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 2 →
1
Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, onye e sitere nꞌọchịchọ Chineke kpọọ ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Nwanne m nwoke Sostenis sokwa m na-ede akwụkwọ a.
2
Ọ bụ unu ka m na-edetara akwụkwọ a, unu nzukọ Chineke dị na Kọrint, ndị Chineke kpọrọ ka unu bụrụ ndị nke ya, ndị e mekwara ka unu site na Jisọs bụrụ ndị Chineke na-anabata. Anyị na-edekwara unu ndị Kraịst nile nọ nꞌebe nile akwụkwọ a, unu nile bụ ndị na-akpọku aha Jisọs Kraịst, dị ka Onyenwe anyị na Onyenwe unu.
3
Ka Chineke nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nye unu amara na udo nke na-esi nꞌaka ya na-abịa.
4
Mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere, ana m ekele Chineke ekele nꞌihi onyinye amara nile o nyere unu site na Kraịst Jisọs.
5
Nꞌihi na Chineke emeela ka unu baa ụba nꞌụzọ nile, ebe ọ bụ na unu na Kraịst bụ otu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu nile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwuwapụta okwu banyere ozi ọma ya.
6
Ihe ahụ m gwara unu na mbụ emezuola! Ozi ọma Kraịst Jisọs agbaala mgbọrọgwụ nꞌime unu.
7
Nꞌihi na ugbu a, Chineke enyela unu amara ya na ngọzi ya nile. O nyekwala unu onyinye Mmụọ Nsọ nile na ike dum unu chọrọ iji mee ihe na-atọ ya ụtọ. Chineke nyere unu ihe ndị a nile ugbu a unu nọ na-ele anya ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
8
Ọ bụkwa Chineke ga-echebe unu ruo ọgwụgwụ, meekwa ka unu bụrụ ndị a ga-agụ dị ka ndị ezi omume nꞌụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-ekpe ụwa nile ikpe.
9
Chineke nꞌonwe ya ga-emere unu nke a. Nꞌihi na ọ bụ onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ bụkwa Chineke kpọbatara unu nꞌọnọdụ ahụ nke unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ ugbu a na-enwe mmekọrịta.
10
Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu nile na-ekwekọrịta nꞌihe ọ bụla unu kwuru, ka nkewa ọ bụla gharakwa ịbata nꞌetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nꞌotu, nꞌechiche obi unu na nꞌizu unu.
11
Nꞌihi na ụmụnna m, esi m nꞌọnụ ndị si nꞌezinụlọ Kloyi bịara nꞌebe a nụrụ na esemokwu dị nꞌetiti unu.
12
Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nꞌetiti unu. Na ụfọdụ nꞌime unu na-anya isi na-agwa ibe ha sị, “Abụ m onye na-eso Pọl.” Ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”, ndị ọzọ kwa na-asị, “Ana m eso Pita”, ma ndị ọzọ na-asị kwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso”.
13
Mgbe unu na-eme ihe ndị a, ihe pụtara ìhè bụ na unu ekewasịala Kraịst, mee ka ọ dị ọtụtụ. Ma ka m jụọ unu, Kraịst, ọ̀ dị abụọ? Ọ̀ bụ mụ onwe m bụ Pọl ka a kpọgidere nꞌobe nꞌihi unu? Ọ̀ dị onye e mere baptizim nꞌetiti unu baa nꞌaha Pọl?
14
Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọ bụla nꞌime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gatọs.
15
Nꞌihi na nke a ga-eme ka onye ọ bụla ghara ikwu na e mere unu baptizim ka unu bụrụ ndị na-eso ụzọ m.
16
Ahaa! Echetara m na emekwara m Stevanas na ezinụlọ ya baptizim. Ewezuga ndị a, amaghị m ma m ga-echetakwa onye ọzọ m mere baptizim nꞌonwe m.
17
Nꞌihi na Kraịst eziteghị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa ozi ọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta mmadụ nke ga-eme ka ike ahụ dị na nkwusa ozi ọma nke obe Kraịst, bụrụ ihe efu.
18
Nꞌanya ndị na-efu efu, ozi ọma Kraịst bụ ihe nzuzu ma nꞌanya ndị a na-azọpụta azọpụta, ọ bụ ike Chineke.
19
Chineke kwuru nꞌakwụkwọ nsọ sị “Aga m emebi amamihe ndị maara ihe ạga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.”
20
Mgbe Chineke mere ihe dị otu a, gịnị ga-abụ ọnọdụ ndị amamihe, ndị mụrụ akwụkwọ na ndị nrụrịta ụka nke ihe ọmụma ụwa a? Chineke emeela ka amamihe ha na oke mmụta ha bụrụ ihe efu.
21
Chineke sitere nꞌamamihe ya chọpụta na ụmụ mmadụ enweghị ike ịmata onye ọ bụ site nꞌoke mmụta ha. Ọ bụ nke a mere o ji webata ụzọ ọ ga-esi zọpụta ndị ga-anabata ozi ọma ya. Ee, ụzọ ozi ọma a anyị na-ekwusa, nke ndị mmadụ na-akpọkwa ihe nzuzu.
22
Ozi ọma a bụ ihe nzuzu nye ndị Juu nꞌihi na ha chọrọ ịhụ ihe ịrịba ama na mbara eluigwe nke ga-egosi ha na ozi ọma a bụ eziokwu tupuu ha ekwere. Ọ bụ ihe nzuzu nye ndị mba ọzọ, nꞌihi na ihe ha na-anabata bụ nanị ozizi nke ya na usoro oke mmụta ha na-adakọta.
23
Ma anyị na-ekwusa na-asị na Kraịst nwụrụ nꞌelu obe ịzọpụta ha site na mmehie ha, okwu a na-ewe ndị Juu iwe, ma na ntị ndị mba ọzọ ọ dị ka okwu nzuzu.
24
Ma Chineke emegheela anya ndị nile ọ kpọrọ, ka ha hụ na Kraịst bụ ike dị ukwuu nke Chineke ji azọpụta ha. Kraịst nꞌonwe ya bụkwa onye Chineke sitere nꞌime ya gosi amamihe ya.
25
Ugbu a ihe ahụ ndị mmadụ kpọrọ nzuzu Chineke, aghọọla ihe karịrị amamihe nile nke ndị mmadụ mma. Ihe ahụ ha chekwara na ọ bụ adịghị ike Chineke, nꞌihi ọnwụ Kraịst nwụrụ nꞌobe, aghọọkwala ihe karịrị ike mmadụ nile.
26
Ma chetakwanụ ihe unu bụ tupuu Chineke akpọọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nꞌime unu bụ ndị maara ihe, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nꞌobodo.
27
Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dị ka ihe nzuzu, ihe na-abaghị uru, ka ọ masịrị Chineke iji mee ka ihere mee ndị amamihe ahụ. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dị ka ihe na-adịghị ike ka Chineke ji mee ka ihere mee ndị dị ike.
28
Nꞌihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru.
29
Chineke mere nke a nꞌihi na ọ chọrọ ka anụ ahụ nile, bụ mmadụ, hapụ ịnya isi nꞌihi ihe ọ bụla, nꞌebe Chineke nọ.
30
Nꞌihi na ọ bụ Chineke nanị mere ka unu nwee ndụ nꞌime Kraịst Jisọs, onye bụ mmụta anyị na amamihe anyị. Ọ bụ site na Kraịst ka anyị ji nwere onwe anyị, bụrụkwa ndị nsọ, na ndị Chineke zọpụtara.
31
Ọ bụ nke a mere akwụkwọ nsọ ji kwuo sị, “Ka onye ọ bụla chọrọ ịnya isi nyaa isi nanị nꞌihe Chineke mere.”
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16