bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Corinthians 16
1 Corinthians 16
Igbo 1988
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
1
Ma okwu banyere ego a na-atụrụ ndị Kraịst nọ na Jerusalem. Leenụ otu unu ga-esi nakọtaa ya. Ihe m na-agwa unu ugbu a bụkwa ihe m gwara ndị chọọchị dị nꞌakụkụ Galatia.
2
Ụbọchị ụka nile, ka onye ọ bụla site nꞌihe ọ kpatara nꞌizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Ihe mmadụ kwesịrị inye dabeere nꞌihe onye ahụ nwere, dị ka Onyenwe anyị si gọzie ya nꞌizu ụka ahụ. Nakọtaanụ onyinye ndị a nile tupu m bịa. Ka a hapụ iche tutuu ruo mgbe m bịara.
3
Mgbe m bịara, aga m enye ndị unu họpụtara onyinye a ka ha bulaara ya ndị Kraịst nọ na Jerusalem. Aga m enyekwa ha akwụkwọ ozi nke ga-akọwa ndị ha bụ, nye nzukọ Kraịst dị na Jerusalem.
4
Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro.
5
Aga m abịa ileta unu mgbe m gasịrị Masidonia. Agaghị m atufu ọtụtụ oge nꞌebe ahụ.
6
Mgbe m bịara ọ na-adị m ka mụ na unu ga-anọ ogologo oge. Ma eleghị anya, anyị ga-anọ tutuu oge oyi agwụ. Mgbe ahụ site nꞌinyeaka unu, aga m ahapụ unu gaa ebe ọzọ.
7
Ọ bụrụ na Chineke ekwee, achọrọ m ka mụ na unu nọọ ogologo oge. Achọghị m ka m bịa taa, laa echi.
8
Ma aga m anọ nꞌEfesọs tutuu emechaa mmemme Pentikọọsụ,
9
nꞌihi na ọrụ ikwusa na izi ihe banyere ozi ọma nke dị ukwuu dịrị m nꞌebe a. Ma dị ka ọrụ si dị ukwuu, otu a ka ndị iro si dịkwa ukwuu nꞌEfesọs.
10
Bikonụ ọ bụrụ na Timoti abịa, nabatanụ ya nꞌihi na ọ bụ onye na-arụ ọrụ Onyenwe anyị dị ka m si arụ ya.
11
Ka onye ọ bụla ghara ileda ya anya nꞌihi na ọ bụ okorọbịa. Kama nyerenụ ya aka ka o nwee ike jiri ọṅụ lọghachikwute m. Mụ na ndị nile na-akwado ịlọghachikwute unu na Kọrint na-ele anya ịhụ unu.
12
Arịọrọ m nwanna anyị Apọlọs ka o soro ndị ọzọ ahụ bịara ileta unu bịa, ma o kweghị. Nꞌihi na ọ bụ uche ya na ọ bụbeghị uche Chineke ka ọ bịa ịhụ unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọ bụla ohere pụtara.
13
Na-echenụ nche mgbe nile, guzosienụ ike nꞌime Onyenwe anyị. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike.
14
Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọ bụla unu na-arụ.
15
Ùnu chetara Stefanas na ezinụlọ ya? Ha bụ ndị mbụ kweere na Kraịst nꞌala Griis. Ha na-enyekwa onwe ha ijere ndị Chineke nọ ebe nile ozi. Ana m arịọ unu ụmụnna m,
16
ka unu na-eso ihe ọ bụla ndị dị otu a gwara unu. Nyekwaranụ ha aka, ha na ndị ọzọ nile so unu jiri obi ha nile na-arụ ọrụ.
17
Obi tọrọ m ụtọ na Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs bịara nꞌebe a ileta m. Ha emeelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nꞌebe a.
18
Ha mesiri m obi ike, dị ka m si chee na ha sikwa otu a na-agba unu ume. Eji m aka na unu na-egosi ndị dị otu a na ọrụ ha dị unu mma.
19
Ụlọ chọọchị nile dị nꞌokpuru Esia na-ezitere unu ozi ekele. Akwila na nwụnye ya Prisilia, na nzukọ Kraịst dị nꞌụlọ ha na-ekelekwa unu.
20
Ụmụnna nꞌime Kraịst nile nọ nꞌebe a na-ekele unu. Jirinụ ikwe nꞌaka nke obi aghụghọ na-adịghị kelerịtaa onwe unu.
21
Ọ bụ mụ onwe m bụ Pọl ji aka m na-ede okwu ikpeazụ ndị a dị nꞌakwụkwọ a.
22
Ka onye ọ bụla na-ahụghị Chineke nꞌanya bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Onyenwe anyị Jisọs bịa ngwangwa!
23
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.
24
Ka ịhụnanya m dịnyere unu site nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Amin.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16