bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Corinthians 2
1 Corinthians 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 3 →
1
Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, gwa unu ihe banyere ozi ọma Chineke, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya.
2
Nꞌihi na tupuu m bịa, ekpebiri m na nanị ihe m ga-eme bụ ikwuru unu ihe banyere Jisọs Kraịst na ihe banyere ọnwụ ya nꞌelu obe.
3
Mgbe m bịakwara nꞌetiti unu, ọ bụ nꞌọnọdụ oke ụjọ na ahụ ịma jijiji ka m ji bịa.
4
Ihe nile m ziri unu na ihe nile m kwusara, bụ ihe dịrị onye ọ bụla nꞌime unu mfe ịghọta. Ejighị m oke okwu na-ezipụta mmụta m, ma ọ bụ amamihe m gwa unu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ Chineke gbara okwu ndị ahụ nile m gwara unu ume, mee ka ọ pụta ìhè nye ndị nụrụ okwu ahụ, na ihe m kwuru bụ okwu Chineke.
5
Ejighị m okwu na-ezipụta oke mmụta m gwa unu okwu, nꞌihi na achọghị m ka okwukwe unu dabere na mmụta mmadụ, kama ọ bụ ọchịchọ m ka okwukwe unu guzosie ike nꞌime Chineke.
6
Otu ọ dị, mgbe ọ bụla m nọ na-ekwuru ndị okwukwe ha siri ike nꞌime Kraịst okwu, ana m eji okwu amamihe gwa ha okwu. Ma okwu amamihe nke m na-ekwu ihe banyere ya abụghị okwu amamihe nke ụwa a, ọ bụghị okwu amamihe nke na-atọ ndị ọkachamara ụwa a ụtọ, nꞌihi na ndị dị otu a aghaghị ịla nꞌiyi.
7
Kama okwu anyị na-ekwusa bụ okwu amamihe, nꞌihi na o si nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ okwu nke na-akọwa nzube zoro ezo nke Chineke, nzube ahụ Chineke zubere tupuu o kee ụwa, iwebata anyị nꞌotuto ya nꞌeluigwe.
8
Ọ dịghị ọkachamara ọ bụla nọ nꞌụwa a maara ihe banyere nzube a. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nꞌobe.
9
Ọ bụ ihe a ka e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ndị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nꞌobi ya, na ọ bụ ihe ga-eme, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị nile hụrụ ya nꞌanya.”
10
Ọ bụ nanị anyị ka Chineke kpugheere ihe omimi a; o sitere na Mmụọ Nsọ ya mee ka anyị mata ya. Mmụọ Nsọ Chineke bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo nile dị Chineke nꞌobi, ọ bụ ya na-egosikwa anyị ihe ha bụ.
11
Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nꞌobi ya. Ọ bụ nanị mmụọ nọ nꞌime onye ahụ bụ onye maara ihe nile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nꞌobi ya, ma ọ bụghị nanị Mmụọ Chineke nꞌonwe ya.
12
Ma mmụọ nke anyị nwere abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ Chineke nyere anyị inyere anyị aka, ịmata onyinye amara nile Chineke nyere anyị.
13
Mgbe anyị gwara unu okwu banyere onyinye ndị a, anyị ji okwu ahụ Mmụọ Nsọ tinyere anyị nꞌọnụ kwuo ya, ọ bụghị okwu nke anyị ji aka anyị họrọ site na mmụta anyị. Ya mere, ọ bụ okwu nke Mmụọ Nsọ tinyere anyị nꞌọnụ ka anyị ji kọwaa ihe gbasara Mmụọ Nsọ.
14
Ma mmadụ ahụ mkpụrụ obi nke onwe ya na-achị enweghị ike ịnabatara onwe ya onyinye si nꞌaka Mmụọ Nsọ Chineke, nꞌihi na onye dị otu a adighị aghọta ihe ha bụ. Nꞌebe ọ nọ, ha bụ ihe nzuzu. Kama ọ bụ nanị ndị Mmụọ Nsọ bi nꞌime ha na-aghọta ihe ọ bụla banyere Mmụọ Nsọ.
15
Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọ bụla. Ụdị nghọta ọ na-enwe banyere ihe ọ bụla na-agba onye ụwa gharịị, na-agbagwoju ya anya, nꞌihi na onye ụwa enweghị ike ịghọta ụdị mmadụ ọ bụ.
16
Ma onye ụwa ọ̀ ga-esi aṅaa ghọtakwanụ? Ò nweela oge ọ bụla o ji mata ihe Chineke na-eche nꞌobi ya? Ò nweela mgbe o ji nwee ike ịdụ Chineke ọdụ ịgwa ya ihe ọ ga-eme? Ma dị ka o si dị, anyị bụ ndị nke Kraịst, nwere nꞌime anyị Mmụọ Kraịst.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16