bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Corinthians 11
1 Corinthians 11
Igbo 1988
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 12 →
1
Ya mere, bụrụnụ ndị na-eṅomi m, na ndị na-eso nzọ ụkwụ m, dị ka m si eṅomi Kraịst, ma na-esokwa nzọ ụkwụ ya.
2
Ọṅụ juru m obi nꞌihi na unu na-echeta m na nꞌihi na unu na-eme ihe m ziri unu.
3
Ma ọ dị otu ihe dị mkpa m chọrọ ichetara unu. Achọrọ m ka unu mata na dị ka Kraịst si bụrụ isi nwoke nile, otu a ka nwoke ọ bụla si bụrụ isi nwụnye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst.
4
Nwoke ọ bụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi ihe na-eme Kraịst onye bụ isi ya ihe ihere.
5
Ma nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi okwu Chineke, ma o kpuchighị isi ya, na-eme di ya ihe ihere, nꞌihi na ọ dịghị ihe dị iche nꞌebe nwanyị a na nwanyị kpụchara isi ya nọ.
6
Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya.
7
Ma nwoke ekwesịghị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihi na Chineke kere nwoke nꞌoyiyi ya izipụta otuto ya. Ma nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya nꞌihi na nwanyị na-ezipụta otuto nwoke.
8
E si na nwoke kee nwanyị mbụ, ma e sighị na nwanyị kee nwoke.
9
E keghị nwoke mbụ maka nwanyị, ma e kere nwanyị mbụ maka nwoke.
10
Nꞌihi nke a, nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nꞌokpuru di ya, ime ka ndị mmụọ ozi hụ ụdị omume a, site nꞌihi ya ṅụrịa ọṅụ.
11
Ma dị ka nzube Chineke si dị, mkpa nwanyị na-akpa nwoke, mkpa nwoke na-akpa nwanyị.
12
Nꞌihi na ọ bụ ezie na nwanyị mbụ si na nwoke pụta, ma ọ bụ ụmụ nwanyị na-amụ ụmụ nwoke nile, nwoke na nwanyị nile sitekwara nꞌebe Chineke onye kere ha nọ na-abịa.
13
Achọrọ m ka unu tulee ihe a nꞌonwe unu, ọ̀ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihu ọha mmadụ?
14
Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka Chineke siri mee ya.
15
Nwanyị nwere agịrị isi dị ogologo na-aṅụrị ọṅụ na-anyakwa isi. Akọnuche anyị na-agwakwa anyị na o kwesịrị ka nwanyị na-ekechi isi ya.
16
Ọ bụrụ na ọ dị onye jụrụ ịnabata ozizi a, ọ bụrụkwa na onye ahụ achọọ ịrụ ụka, nanị ihe m maara bụ na anyị, na chọọchị nile, adịghị ezi ihe ọ bụla karịa na nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ nke na-ekwusa ozi ọma nꞌebe ndị mmadụ nọ kwesịrị ikechi isi ya.
17
Ihe ndị ọzọ m chọrọ ikwu ugbu a bụ ihe gbasara ihe unu na-eme nke m na-ekwesịghị inye unu otuto nꞌihi ha. Nꞌihi na omume unu na-eme mgbe unu zukọtara nꞌime chọọchị unu bụ omume jọgburu onwe ya na njọ.
18
Na mmalite, ihe m na-anụ bụ na mgbe nile unu zukọrọ, ịrụ ụka nke na-ebute nkewa na-adị nꞌetiti unu. Ọ na-adịkwa m ka ihe ndị a m nụrụ bụ eziokwu.
19
Ana m echekwa na ụdị nkewa a na-atọ unu bụ ndị na-eme ezi ihe mgbe nile ụtọ nꞌihi na unu chọrọ ka e site nꞌụzọ dị otu a mata unu.
20
Mgbe unu zukọtara iri nri, ọ bụghị oriri nsọ ka unu na-eri.
21
Nꞌihi na anụrụ m na onye ọ bụla na-eri nri nke aka ya. Anụkwara m na ndị nile bu nri ha bịa na-ericha ya ngwangwa. Ha anaghị echere ka ndị na-enweghị nri ha ji bịa soro ha keta oke na nri ha ji bịa. Nꞌihi nke a ụfọdụ na-eribiga nri oke mgbe ndị ọzọ na-anọ agụụ. Ụfọdụ kwa na-aṅụbiga mmanya oke bụrụ ndị mmanya na-egbu.
22
A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ̀ bụ na unu enweghị ike iri nri na ịnụ mmanya nꞌụlọ unu tupuu unu abịa nꞌụlọ chọọchị? Karịa na unu ga-ebu ihe ndị a bịa nꞌime chọọchị ime ndị ogbenye na ndị na-enweghị ike iweta nri nke ha ihe ihere. Gịnị ọzọ ka unu chọrọ ka m kwuo banyere ihe ndị a? Ùnu chọrọ ka m too unu? Mbaa!
23
Nꞌihi na ihe m ziri unu banyere oriri nsọ bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nꞌabalị ụbọchị ahụ Judas rara ya nye nꞌaka ndị ga-egbu ya, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe beredi.
24
Mgbe o nyechara Chineke ekele nꞌihi ya ọ nyawara ya nye ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ beredi a taa, nꞌihi na nke a bụ anụ ahụ m nke a na-enye nꞌihi unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.”
25
Nꞌụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risịrị nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị nꞌetiti unu na Chineke, nke e ji ọbara m mee ka o guzosie ike. Meekwanụ otu a icheta m.”
26
Nꞌihi na mgbe ọ bụla unu na-eri nri a na-aṅụkwa site nꞌiko a, unu na-akọ akụkọ banyere ọnwụ Jisọs. Na-emekwanụ nke a tutuu ruo mgbe ọ laghachiri ọzọ.
27
Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla ataa beredi Onyenwe anyị ma ọ bụ ṅụọ site nꞌiko Onyenwe anyị nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Kraịst na ọbara ya.
28
Ọ bụ nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka onye ọ bụla nyochaa onwe ya nke ọma tupuu o rie beredi ahụ ma ọ bụ ṅụọ site nꞌiko ahụ.
29
Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ ataa beredi ahụ ma ọ bụ ṅụọ site nꞌiko ahụ nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na-echeghị echiche banyere anụ ahụ Kraịst na ihe ọ pụtara, ọ na-eri, na-aṅụtara onwe ya ikpe ọmụma Chineke, nꞌihi na ọ bụ ọnwụ Kraịst ka o ji egwuri egwu.
30
Ọ bụ nke a mere ọtụtụ nꞌime unu ji bụrụ ndị ahụ na-esighị ike, ndị nọ nꞌọrịa na ndị dara nꞌụra ọnwụ.
31
Ọ bụrụ na unu enyochaa onwe unu nke ọma tupuu unu erie oriri nsọ unu agaghị adaba nꞌikpe na ahụhụ Chineke.
32
Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekpee anyị ikpe, ma ọ bụ taa anyị ahụhụ, ọ bụ nꞌihi na ọ chọrọ ka a hapụ ịmakọ anyị na ndị ụwa ikpe.
33
Ya mere, ụmụnna m, mgbe unu bịara iri oriri nsọ cherenụ ibe unu.
34
Ọ bụrụ na agụụ agụọ onye ọ bụla ya rie nri nꞌụlọ ya, ka ọ hapụ iwetara onwe ya ikpe ọmụma Chineke, mgbe unu nile zukọtara. Aga m edozi okwu ndị ọzọ mgbe m bịara.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16