bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Corinthians 4
1 Corinthians 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 5 →
1
Achọrọ m ka unu na-ele mụ na Apọlọs anya dị ka ndị na-ejere Kraịst ozi, ndị e nyefere nkọwa okwu omimi Chineke nꞌaka.
2
Ma ihe dị mkpa bụ na o kwesịrị ka odibo ọ bụla bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi nꞌọrụ ọ bụla e tinyere ya nꞌaka.
3
Ọ bụghị m ka ọ dịrị ikwu na m bụ ezi odibo, ma ọ bụ ajọ odibo. Anaghị m echegbu onwe m banyere ihe unu na-eche gbasara m, ajụkwaghị m ajụjụ banyere ihe ndị ọzọ na-eche. Nꞌezie, anaghị m atụkwasịkwa uche nꞌihe akọnuche m na-ekwu banyere ọrụ m na-arụ.
4
O doro m anya na akọnuche m adịghị ama m ikpe, ma nke a egosighị na m bụ onye na-eme ihe ziri ezi. Ọ bụ Onyenwe anyị nanị ka ọ dịrị inyocha ọrụ m, ikpebi ma m rụziri ọrụ m ma m arụzighị ya.
5
Nꞌihi ya jienụ onwe unu aka ikpe onye ọ bụla ikpe tutuu oge ikpe eruo. Cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-abịa igbubi ikpe nile. Ọ ga-eme ka ihe nile ụmụ mmadụ na-eme ugbu a na nzuzo pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo dị ndị mmadụ nꞌobi nꞌanwụ. Mgbe ahụ onye ọ bụla ga-anatakwa nꞌotu nꞌotu, otuto ruuru ya site nꞌaka Chineke.
6
Ụmụnna m, eji m onwe m na Apọlọs maara unu atụ ime ka unu mata na o kwesịghị ka unu lee mmadụ anya karịa ihe ọ bụ. Ka onye ọ bụla gharakwa iji otu onyeozi Chineke nyaa isi karịa ibe ya.
7
Nꞌihi na gịnị mere i ji akpa nganga? Olee ihe i nwere nke ọ na-abụghị Chineke nyere gị ya? Ugbu a, ọ bụrụ na ihe nile i nwere si nꞌaka Chineke rute gị, gịnị na-ebu gị isi? Gịnị mere i ji eme dị ka ọ dị ihe ị pụrụ ime nꞌonwe gị?
8
Ndụ unu na-ebi na-egosi na echiche unu bụ na unu enwezuola ihe nile dị unu mkpa. Ee, unu na-ebi ndụ dị ka ndị afọ juru nꞌihe nke Mmụọ. Unu na-ebi ndụ dị ka ndị eze, ndị nọkwasịrịla nꞌocheeze ha, ma anyị onwe anyị nọ nꞌezi. Nꞌezie, ọ gaara atọ ma a sị na unu anọrọla nꞌocheeze unu, nꞌihi na mgbe oge ịnọ nꞌocheeze ruru, ghọtanụ na anyị onwe anyị ga-anọkwa nꞌebe ahụ, iso unu ịchị achị.
9
Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m nnọọ ka Chineke na-eme ka anyị bụ ndị ozi bụrụ ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta nanị mgbe ihe nile na-agwụsị agwụsị. Anyị dị ka ndị a mara ikpe ọnwụ, ndị a na-akpọpụta nꞌihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi.
10
Okwukwe anyị kwere na Kraịst emeela ka anyị ghọọ ndị nzuzu nꞌihu unu, ma unu onwe unu bụkwa ndị Kraịst maara ihe! Lee ka anyị si bụrụ ndị na-adịghị ike, mgbe unu na-awụgharị dị ka agụ. Lee ka anyị si bụrụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-agụ dị ka ndị na-abaghị uru, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ!
11
Tutuu ruo ugbu a anyị na-ebu ọnụ nꞌihi ahụghị ihe anyị ga-eri. Anyị na-ejegharị na-arụ ọrụ nꞌọnọdụ akpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị.
12
Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-ekpere ha ekpere. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi.
13
Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutuu ruo ugbu a a na-emeso anyị mmeso dị ka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dị ka ihe a jụrụ ajụ nꞌanya ndị ụwa.
14
Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dị ka ụmụ m hụrụ nꞌanya.
15
Ọ bụ ezie na ihe ruru puku mmadụ iri ọzọ nwere ike bịakwute unu izi unu ihe banyere Kraịst, ma chetakwanụ na ọ bụ nanị m bụ nna unu nwere. Nꞌihi na ọ bụ m kpọtara unu nye Kraịst mgbe m bịara kwusaara unu ozi ọma.
16
Ya mere, arịọọ m unu, meenụ nzọ ụkwụ m ihe ịma atụ nye onwe unu.
17
Ọ bụ nke a mere m ji ezitere unu Timoti ka ọ bịa nyere unu aka ime nke a. Nꞌihi na Timoti bụ ezi nwa m, onye kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-eme ka unu mata ihe nile m na-ezi nꞌụlọ nzukọ Kraịst nile m na-aga.
18
Amaara m na e nwere ụfọdụ nꞌetiti unu ndị na-akpa nganga nꞌihi na enweghị m ike bịa leta unu.
19
Ma site nꞌike Onyenwe anyị, aga m abịa ịhụ unu anya nꞌoge na-adịghị anya. Mgbe m bịara, aga m achọpụta ihe ndị ahụ na-akpa nganga pụrụ ime, ọ bụghị ihe ha nwere ike ikwu.
20
Nꞌihi na ihe e ji amata ndị so nꞌalaeze Chineke abụghị oke okwu ha, kama ọ bụ site nꞌike Chineke dị nꞌime ha.
21
Ya mere, unu ka ọ dịrị ịhọrọ nke unu chọrọ. Unu chọrọ ka m jiri ụtarị bịakwute unu, ka ọ bụ ka m jiri obi dị umeala na mmụọ nke ịhụnanya bịa?
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16