bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Corinthians 3
1 Corinthians 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 4 →
1
Ụmụnna m, o siiri m ike ịgwa unu okwu dị ka a ga-asị na unu bụ ndị tozuru etozu nꞌime Mmụọ, kama agwara m unu okwu dị ka ndị na-etozughị etozu nꞌime mmụọ, ndị bụ ụmụntakịrị nꞌime Kraịst.
2
Ejighị nri siri ike na-azụ unu, kama eji m mmiri ara na-azụ unu, nꞌihi na unu apụghị iri nri dị ike. Nꞌezie, ọ bụladị ugbu a, unu erubeghị iri nri siri ike.
3
Nꞌihi na unu na-adị ndụ dị ka ndị bi nꞌụwa, ndị ọchịchọ nke anụ ahụ na-enugharị. Ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nꞌetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dị ka ndị ụwa, dị ka ndị mmadụ efu nọ nꞌụwa.
4
Nꞌihi na mgbe nkewa pụtara ìhè nꞌetiti unu ruo na ụfọdụ nꞌime unu na-asị, “Anyị bụ nke Pọl”, ndị ọzọ na-asịkwa, “Anyị bụ nke Apọlọs”, o gosighị na unu na-akpa agwa dị ka ndị bi nꞌụwa?
5
Ma ka m jụọ unu ajụjụ, ònye ka m bụ? Ònye kwa ka Apọlọs bụ? Ọ̀ bụ na anyị abụghị ndị na-eje ozi, ndị wetaara unu ozi ọma unu kweere nꞌime ya. Ọrụ dị iche iche anyị rụrụ bụkwa nke anyị rụrụ dị ka Onyenwe anyị si kenye anyị ọrụ ahụ.
6
Ọ bụ m kụrụ mkpụrụ okwu Chineke nꞌobi unu, Apọlọs bụkwa onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri, ma ọ bụ Chineke mere ka o too.
7
Onye kụrụ mkpụrụ ahụ na onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri adịghị mkpa. Ọ bụ Chineke onye mere ka ha too dị mkpa.
8
O nweghị ihe dị iche nꞌetiti mụ bụ onye kụrụ mkpụrụ ahụ na Apọlọs onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri. Ọ bụ otu ihe ahụ ka anyị bụ nꞌobi. Chineke ka ọ dịrị ịkwụghachi onye ọ bụla nꞌime anyị dị ka ọrụ anyị si dị.
9
Anyị so Chineke na-arụ ọrụ, dị ka a ga-asị na anyị na ya jikọtara aka nꞌọrụ ahụ. Unu onwe unu bụkwanụ ubi Chineke, bụrụkwa ụlọ ya a na-ewuli elu.
10
Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọ ala ọrụ a, dị ka ezi onye ọka na-ese ihe osise ụlọ. Ugbu a onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nꞌelu ntọ ala ahụ. Ma ka onye ọ bụla kpachapụ anya otu o si ewu.
11
O nweghị onye ọzọ pụrụ ịtọ ntọ ala karịrị ntọ ala ahụ e bururị ụzọ tọọ. Jisọs Kraịst bụkwa ntọ ala ahụ.
12
Ma e nwere ọtụtụ ihe dị iche iche mmadụ pụrụ iji wuo ụlọ nꞌelu ntọ ala ahụ. Ụfọdụ ga-eji ọlaedo na ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụ ahịa wuo nke ha ṅdị ọzọ ga-eji osisi okporo ọka ma ọ bụ ahịhịa wuo nke ha.
13
Ma otu ụbọchị na-abịa mgbe ọrụ nke onye ọ bụla rụrụ ga-apụta ìhè, ụbọchị ahụ a ga-anwapụta ụdị ihe anyị ji wuo ụlọ nꞌelu ntọ ala ahụ. A ga-esite nꞌọkụ na-enwụsi ike wefee ọrụ nile onye ọ bụla rụrụ lee ọrụ ahụ ule, ịchọpụta ma ọrụ ahụ ọ ga-adịgide adịgide.
14
Nꞌụbọchị ahụ, ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọ bụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nꞌelu ntọ ala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ.
15
Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọ bụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nꞌiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma nzọpụta ahụ ga-adị ka a ga-asị na e si nꞌụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya.
16
Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọ nsọ Chineke. Ọ̀ bụ na unu aghọtakwaghị na Mmụọ Nsọ Chineke bi nꞌime unu?
17
Ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie ụlọ nsọ Chineke, Chineke ga-emibikwa onye ahụ. Nꞌihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ.
18
Ya mere, ka onye ọ bụla ghara ịghọgbu onwe ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu na-eche nꞌobi ya na ya bụ onye maara ihe, dị ka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ịghọ ewu, onye na-enweghị uche, kama amimihe ahụ o chere na o nwere ga-eme ya ka ọ hapụ ịnata ezi amamihe ahụ si nꞌelu na-abịa.
19
Nꞌihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nꞌanya Chineke. Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ọ bụ site nꞌihe ahụ mmadụ kpọrọ amamihe ya ka Chineke si ejide ya, mee ka ọ daa.”
20
Ọzọ kwa, akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ, mara na amamihe ya bụ ihe efu.”
21
Nꞌihi nke a, ka onye ọ bụla ghara ịnya isi nꞌihi na ọ na-agbaso mmụta na amamihe mmadụ. Nꞌihi na Chineke enyela gị ihe nile dị gị mkpa.
22
Chineke enyela unu Pọl, na Apọlọs, na Pita ka ha bụrụ ndị ozi unu. Chineke emeekwala ka ndụ, na ọnwụ bụrụ ndị na-ejere unu ozi. O nyela unu ihe nile dị taa, na ihe nile ga-adị nꞌoge dị nꞌihu ka ha bụrụ nke unu.
23
Unu bụkwa nke Kraịst, Kraịst bụkwa nke Chineke.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16