bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Corinthians 9
1 Corinthians 9
Igbo 1988
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 10 →
1
Abụ m onyeozi Kraịst, bụrụkwa onye nwe onwe m. Abụkwa m otu nꞌime ndị ji anya ha hụ Jisọs Onyenwe anyị. Ndụ ọhụrụ ahụ unu nwere ugbu a sitekwara nꞌọrụ Onyenwe anyị m rụrụ nꞌetiti unu.
2
Ọ bụrụ na ndị ọzọ asị na m abụghị onyeozi Kraịst, unu onwe unu maara na m bụ onyeozi Kraịst, nꞌihi na ọ bụ site nꞌọrụ m, dị ka onyeozi ya, ka unu ji bụrụ ndị kwere na Kraịst.
3
Mgbe ọ bụla ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ banyere ihe m bụ, ihe a bụ ọsịsa m na-enye ha.
4
Ọ̀ bụ na o kwesịghị ekwesị na a ga-enye m ihe ruru m dị ka onyeozi Kraịst? Ọ̀ ga-abụ na enweghị m ike ịbata nꞌụlọ unu nọnyere unu, ka unu jiri nri unu zụọ m, dị ka ndị ozi Kraịst ọzọ na-eme?
5
A sịkwa na m nwere nwụnye, onye bụ onye Kraịst, ọ̀ bụ na m enweghị ike iduru ya gaa ebe ọ bụla m na-aga dị ka ndị ozi ọzọ na-eme, na dị ka ụmụnne Onyenwe anyị na Pita na-emekwa?
6
Ọ̀ ga-abụ nanị mụ na Banabas ga-anọgide na-arụpụtara onwe anyị ihe anyị ga na-eri, mgbe unu na-egboro ndị ọzọ mkpa ha?
7
Olee onye agha unu maara nke na-esi nꞌakpa ya akwụ onwe ya ụgwọ ọnwa? Ka ọ̀ dị onye ọrụ ubi unu maara nke na-adịghị eri mkpụrụ e si nꞌubi ya weta? Olee onye ọzụzụ atụrụ unu maara nke na-adịghị aṅụ mmiri ara e si nꞌatụrụ ọ na-azụ apịpụta?
8
Nꞌezie, anaghị m ekwu ihe a nꞌihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị nile nꞌetiti ndị mmadụ, kama akwụkwọ nsọ kwagidekwara ihe ndị a.
9
Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ ahụ Chineke nyere Mosisi sị, “Ị gaghị ekechi ọnụ ehi nke na-arụ ọrụ nꞌubi gị, ime ka ọ ghara ịta ọka mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.” Unu chere na ọ bụ nanị ehi ka Chineke bu nꞌobi kwuo okwu a?
10
É, è! O bukwa anyị nꞌobi kwuo ya. Nꞌezie, e dere ihe ndị a nꞌihi anyị, nꞌihi na onye kụrụ mkpụrụ nꞌubi na onye gara wee ihe dị nꞌubi ahụ, kwesịrị iketa oke site na mkpụrụ e si nꞌubi ahụ weta.
11
Mkpụrụ anyị kụrụ nꞌime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ̀ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ihe oriri na akwa oyiyi unu?
12
Echere m na ọ bụ anyị kwesịrị isite nꞌaka unu nata ihe ndị a karịa ndị ọzọ a unu na-enye ihe ndị a. Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọ bụla, kama anyị na-agbalịsi ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nꞌozi ọma Kraịst nke anyị wetara.
13
Ma unu maara na ndị na-arụ ọrụ nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke na-esi nꞌụlọ nsọ ahụ na-eweta ihe ha na-eri. Otu a kwa, ndị nchụaja na-eketakwa oke nꞌụfọdụ ihe ha ji chụọ aja.
14
Nꞌotu aka ahụ kwa, Chineke ekwuola na ndị nile na-ekwusa ozi ọma ya ga-esi nꞌozi ọma eweta nri ha ga-eri.
15
Ma ajụbeghị m unu ihe ọ bụla. Nꞌeziokwu, anaghị m ede akwụkwọ a ime ka unu bido izitere m ihe. Ọ ga-akara m mma na m nwụrụ karịa na m ga-ana unu ihe ọ bụla nꞌihi ozi ọma m na-ekwusara unu! Nke a bụ ihe m ji anya isi!
16
Ọ bụghị na ọ dị ihe ọzọ pụrụ iche ikwusa ozi ọma na-ewetara m. Enweghị m ike ịkwụsị ikwusa ozi ọma. Nꞌihi na ọ bụrụ na m akwụsị ikwusa ozi ọma, agaghị enwe udo na ọṅụ ọ bụla. Onye a bụrụ ọnụ ka m ga-abụ ma ọ bụrụ na m akwụsị ikwusa ozi ọma Onyenwe anyị.
17
A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe olileanya na Chineke ga-akwụ m ụgwọ ọnwa. Ma o sighị otu a dịrị. Ọ bụ Chineke nꞌonwe ya họpụtara m, nyefee m ọrụ nꞌaka. Ya mere, ọ bụ ọrụ nke m na-aghaghị ịrụ.
18
Ebe m na-arụ ya dị ka ọrụ m na-aghaghị ịrụ, gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nꞌizisa ozi ọma a, na-anaghị onye ọ bụla ụgwọ ọrụ ọ bụla, ma ọ bụ ihe ruru m.
19
Site nꞌụzọ dị otu a, abụghị m ohu onye ọ bụla nꞌihi na o nweghị onye m nọ nꞌokpuru ya nke na-akwụ m ụgwọ ọrụ, kama abụ m onyenwe onwe ya. Ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ nile ka m nwee ike site nꞌụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụ obi nꞌuru nye Kraịst.
20
Mgbe ọ bụla m bịara nꞌetiti ndị Juu ana m eme dị ka onye Juu, ka m nwee ike nwetara Kraịst ụfọdụ nꞌime ha. Ọ bụ ezie na anọghị m nꞌokpuru iwu Mosisi, ma mgbe m nọ nꞌetiti ndị mba ọzọ ndị na-ebi ndụ dị ka usoro okpukpe iwu ndị Juu si dị, ana m emekwa dị ka m bụ otu nꞌime ndị nọ nꞌokpuru iwu, ka m si otu a nwee ike ikwusara ha ozi ọma, inyere ha aka.
21
Otu aka ahụ kwa, mgbe mụ na ndị mba ọzọ na-anọghị nꞌokpuru iwu nọkọrọ, ana m eme dị ka ha si eme ka m nwee ike site nꞌụzọ dị otu a mee ka ha mata Kraịst. Ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe Chineke na-achọ. Mba! Ana m emekwarị dị ka onye nọ nꞌokpuru iwu Kraịst.
22
Ọ bụrụkwa na mụ na ndị okwukwe ha na-esighị ike anọkọọ, ana m emekwa dị ka ha, ka m nwee ike mee ka ha mata Kraịst. Ee, otu ọ bụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike gwa ya ihe banyere Kraịst, Ka Kraịst zọpụta ya.
23
Ana m eme ihe ndị a ka ozi ọma nwee ike ruo ha nile ntị. Ana m emekwa ya nꞌihi ngọzi m na-enweta mgbe m na-ele ha ka ha na-anabata Jisọs dị ka Onyenwe ha na Onye nzọpụta ha.
24
Unu maara na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ, nꞌoge a na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ otu onye nanị na-enwe ihe onyinye nke mbụ. Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta ụdị onyinye ahụ.
25
Mgbe ọgba ọsọ na-ejikere ịgba ọsọ ya, ọ na-enwe ntachi obi nꞌọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ma ọgba ọsọ a na-azụ onwe ya nanị ka o nweta okpu mmeri okoko osisi na-emebi emebi, ma ọ bụ iko ọlaọcha. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpu mmeri nke eluigwe nke na-adịghị emebi emebi.
26
Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nꞌazụ, tutuu ruo mgbe m ruru na njedebe ije ahụ. Ana m alụsi ọgụ ike ka m nwee ike merie, dị ka ọkụ ọkpọ nke na-adịghị akụjọ akụjọ.
27
Dị ka ọgba ọsọ, ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ, na-azụ ya ka ọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ihe ọ chọrọ ime. Nꞌihi na achọghị m ka ọ bụrụ na mgbe m gbalịsịrị ike mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso nꞌọsọ a, mụ onwe m a bụrụ onye a jụrụ ajụ, nke na-agaghị enweta ihe a na-agbata nꞌọsọ.
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16