bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Corinthians 13
1 Corinthians 13
Igbo 1988
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 14 →
1
A sị na m nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, na asụsụ ndị mmụọ ozi, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, ọ bụ nanị ụzụ ka m na-eme.
2
A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe nile gaje ime nꞌoge dị nꞌihu, na onye maara ihe nile, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya olee uru onyinye ndị a baara m? A sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nꞌebe ọ nọ gaa nꞌebe ọzọ, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, abụghị m ihe ọ bụla.
3
A sịkwa na m ewere ihe nile m nwere nye ndị ogbenye, kwerekwa ka e ree m ọkụ nꞌihi ikwusa ozi ọma Kraịst, ihe ndị a nile abaghị uru, ma ọ bụrụ na m ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya.
4
Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.
5
Onye hụrụ mmadụ ibe ya nꞌanya anaghị akpasu ya iwe, ọ naghị achọ ihe nke nanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ nile e mere ya.
6
Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌihe ọjọọ, ọ hụrụ eziokwu nꞌanya.
7
Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta.
8
Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma nile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma nile ga-agabiga.
9
Ugbu a ihe anyị maara adịghị ukwuu, mmụta anyị na amụma anyị na-ebu ezughị oke, nꞌihi na ihe anyị maara bụ nanị nwa ntịị.
10
Ma mgbe e mere ka anyị zuo oke, mgbe ahụ, mkpa nke onyinye ndị a na-ezughị oke na-egboro anyị agaghị adịkwa. Onyinye ndị a ga-agwụsịkwa.
11
Ọ dị nnọọ dị ka mgbe m bụ nwanta. Mgbe ahụ, ekwuru m okwu dị ka nwanta, echiche m nile bụ echiche nwanta. Izuzu obi m nile bụkwa nke ụmụntakịrị. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịkwaghị m akpa agwa dị ka nwantakịrị ọzọ.
12
Otu aka ahụ kwa, ihe anyị na-ahụ na ihe anyị na-aghọtakwa bụ nanị ihe ntakịrị banyere Chineke, dị ka a ga-asị na anyị na-ele anya nꞌime enyo gbajiri ojii. Ma otu ụbọchị, anyị ga-ahụ ya ihu na ihu. Ugbu a, ihe mụ onwe m maara banyere ya dị ntakịrị, ma oge na-abịa mgbe m ga-ama ihe nile nke ọma, dị ka Chineke si mara obi m ugbu a.
13
Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nꞌime ihe atọ ndị a, ihe kachasị ha nile bụ ịhụnanya.
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16