bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Corinthians 8
1 Corinthians 8
Igbo 1988
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 9 →
1
Ajụjụ ọzọ unu jụrụ bụ ihe banyere iri anụ e ji chụọra arụsị aja. Nꞌụdị ajụjụ dị otu a onye ọ bụla na-eche na ọsịsa nke ya dị mma. Ma ọ bụ ezie na anyị na-anya isi nꞌihi na anyị na-akpọ onwe anyị ndị maara ihe, ma ihe dịkarịsịrị mkpa iji iwuli ụlọ nzukọ Kraịst elu bụ nanị ịhụnanya.
2
Ọ bụrụ na ọ dị onye sị na ya maara ihe nile, onye ahụ na-ekwu okwu ụgha nꞌihi na ọ matabeghị ihe o kwesịrị ịmata.
3
Ma onye ahụ hụrụ Chineke nꞌanya bụ onye Chineke maara.
4
Ugbu a ka anyị tulee ajụjụ unu. Ò kwesịrị ka anyị rie anụ e ji chụọra arụsị aja? Anyị nile maara na o nweghị arụsị dị, na ihe ndị mmadụ na-akpọ arụsị abụghị ihe ọ bụla. Anyị matakwara na ọ bụ nanị otu Chineke dị.
5
A sịkwa na arụsị a na-akpọ chi dị, ma ha nọ nꞌeluigwe ma ọ bụ nꞌụwa nꞌezie, ọtụtụ chi na ndị nwe mmadụ dị otu a dị.
6
Ma nꞌebe anyị nọ anyị maara na ọ bụ nanị otu Chineke dị, onye bụ Nna, onye okike, onye kere ihe nile, meekwa ka anyị bụrụ ndị nke ya. Ọ bụkwa nanị otu Onyenwe anyị ka anyị nwere, onye bụ Jisọs Kraịst. Onye e sitere nꞌaka ya kee ihe nile, onye na-enyekwa anyị ndụ.
7
Ma otu ọ dị, ọ bụghị ndị Kraịst nile maara eziokwu a. Nꞌime ndụ ha nile, ha na-ele arụsị anya dị ka chi dị ndụ. Ha na-echekwa na ihe ọ bụla e ji chụọra arụsị aja, na ọ bụ chi dị ndụ ka e ji ya chụọra aja. Nꞌihi nke a, mgbe ọ bụla ha riri ihe e ji chụọ aja nye arụsị, ọ na-ewute mmụọ ha nke ukwuu nꞌihi na ha na-eche na ihe ha riri emerụọla ha.
8
Ma chetanụ na ọ bụghị nri ga-eme ka anyị dị ezi ndụ nꞌihu Chineke. Ma anyị riri ma anyị erighị, ọ dịghị ihe ọhụrụ anyị ga-enweta. Ọ dịkwaghị ihe anyị ga-atufu.
9
Ọ bụ eziokwu na anyị pụrụ iri ihe ọ bụla, ma jie onwe gị aka ka ị ghara iri ihe ga-eme ka nwanna gị nꞌime Kraịst, nke okwukwe ya na-esighị ike daba nꞌime mmehie.
10
Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ chere na nri e nyere arụsị bụ ihe ọjọọ, ahụ gị ka ị nọ na-eri nri nꞌụlọ arụsị, ọ ga-enwe obi ike soro gị nọdụ rie nri ahụ. Ma mgbe ọ na-eri ya akọnuche ya ga-anọ na-ama ya ikpe na o meela ihe ọjọọ.
11
Site nꞌụzọ dị otu a, nwoke a mmụọ ya na-esighị ike, onye bụ nwanne gị, onye Kraịst nwụrụ nꞌihi ya, ga-ala nꞌiyi nꞌihi na o sooro gị, onye maara ihe nile, mee ihe ahụ akọnuche ya gwara ya na ọ bụ mmehie.
12
Cheta na ọ bụ mmehie i mere megide Kraịst, ma ọ bụrụ na ị kwagide nwanne gị nꞌime Kraịst, ka o mee ihe ahụ o chere na ọ bụ ihe ọjọọ.
13
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na iri anụ e ji chụọra arụsị aja ga-eme ka nwanne m mee mmehie, agaghị m eso rie ya mgbe ọ bụla, ka m ghara ime ka nwanne m mee mmehie.
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 9 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16