bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Corinthians 5
1 Corinthians 5
Igbo 1988
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 6 →
1
Ọtụtụ mmadụ agwala m ụdị ihe ọjọọ na-eme nꞌụlọ chọọchị unu. Ihe jọgburu onwe ya, nke ndị na-ekweghị ekwe na-apụghị ime, ka unu na-eme. A gwara m na ọ dị otu nwoke nọ nꞌime ụlọ chọọchị unu onye ya na nwụnye nna ya na-akwa iko.
2
Ugbu a, olee ihe bụ isi nganga unu? Ihe unu kwesịrị ime ọ̀ bụghị ịkwa akwa na iru uju, na ime ka nwoke ahụ si nꞌọgbakọ unu pụọ?
3
Ọ bụ ezie na mụ na unu anọghị ugbu a, ma mụ na unu nọkwa nꞌime mmụọ. Ikwuru unu eziokwu, amaala m rị onye ahụ ikpe site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs, dị ka a ga-asị na mụ na unu nọ.
4
Ya mere, mgbe ọ bụla unu zukọrọ nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs, aga m esoro unu nọdụ nꞌime mmụọ m, ike Onyenwe anyị Jisọs ga-adịnyekwara unu.
5
Mgbe ahụ sitenụ nꞌụlọ chọọchị Chineke wepụ nwoke a, werenụ ya nyefee nꞌaka ekwensu, ka ọ taa anụ ahụ ya ahụhụ, ka e nwee ike ịzọpụta mmụọ ya, mgbe Onyenwe anyị Jisọs lọghachiri.
6
Olee uru ọ bara na unu nọ na-anya isi mgbe ihe ọjọọ dị otu a na-eme nꞌetiti unu? Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụrụ na unu agbaa nkịtị, hapụ nwoke a, ka ọ na-eme mmehie ya gaa nꞌihu, na ihe ọjọọ a ga-emekụta ndị ọzọ nọ nꞌụlọ chọọchị unu?
7
Wepụnụ ekwensu a nọ nꞌetiti unu, ka unu bụrụ ndị dị ọhụrụ, na ndị dị ọcha. Nꞌihi na egbuolarị Kraịst nwa atụrụ Chineke nꞌihi anyị.
8
Ugbu a ka anyị dabere na Kraịst, si otu a na-eto eto nꞌime ndụ anyị dị ka ndị nke ya. Ka anyị wezuga ndụ ochie ahụ jupụtara nꞌekworo na ọrụ ọjọọ nile. Ka anyị jiri eziokwu na ịdị ọcha zụjuo onwe anyị afọ dị ka nri.
9
Nꞌakwụkwọ mbụ m deere unu, adọrọ m unu aka na ntị ka unu na ndị na-akwa iko ghara inwe mmekọ ọ bụla.
10
Mgbe m gwara unu okwu ahụ, ọ bụghị ihe gbasara mmekọ unu na ndị na-ekweghị ekwe na-akwa iko, na ndị na-enwe anya ukwu, na ndị na-ezu ohi, na ndị na-efe arụsị ka m na-ekwu. Nꞌihi na o nweghị ụzọ unu na ndị dị otu a pụrụ isi hapụ imekọrịta nꞌụwa, karịa ma unu si nꞌụwa pụọ kpamkpam.
11
Kama ndị m bu nꞌuche dee ihe ahụ bụ ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, ma ha nọgidere na-akwa iko, ma ọ bụ na-enwe anya ukwu, ma ọ bụ na-efe arụsị. Ee, ndị ahụ sị na ha bụ ndị Kraịst ma nọgidekwa na-ekwutọ ibe ha, na-aṅụbiga mmanya oke, ma na-ezukwa ohi. Unu na ndị dị otu a enwela mmekọ ọ bụla. Unu esola ha rikọọ ihe.
12
Ọ bụghị ọrụ anyị ikpe ndị na-esoghị anyị bụrụ ndị Kraịst ikpe. Ma ọ bụ ọrụ anyị ikpe ndị nọ nꞌọgbakọ anyị na-eme mmehie ikpe.
13
Ọ bụ nanị Chineke ka ọ dịrị ikpe ndị na-abụghị ndị Kraịst ikpe. Ya mere, sitenụ nꞌetiti unu wepụ nwoke a.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16