bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Corinthians 12
1 Corinthians 12
Igbo 1988
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 13 →
1
Ugbu a ụmụnna m, ka anyị gafee nꞌokwu gbasara onyinye dị iche iche Mmụọ Nsọ na-enye. Aga m akọwa ya nꞌụzọ ọ ga-esi doo unu nile anya.
2
Unu ga-echeta na tupuu unu abụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst unu bụ rị ndị na-eso arụsị nke na-adịghị ekwu okwu ọ bụla.
3
Ugbu a e nwere ọtụtụ ndị na-asị na Mmụọ Nsọ Chineke si nꞌọnụ ha na-ekwu okwu. Ùnu ga-esi aṅaa mata na ọ bụ Chineke si nꞌọnụ ha ekwu okwu nꞌezie? O nweghị onye ọ bụla pụrụ ịkpọku aha Jisọs sị, “Jisọs bụ Onyenwe m” ma ọ bụghị site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla Mmụọ Chineke na-achị nke pụrụ ịsị, “Jisọs bụ onye a bụrụ ọnụ.”
4
Ọ bụ ezie na onyinye Mmụọ Nsọ Chineke dị ọtụtụ, ma ọ bụ otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha.
5
Anyị na-esite nꞌụzọ dị iche iche na-efe Chineke, ma ọ bụ nanị otu Chineke ahụ ka anyị na-efe.
6
E nwere ụzọ dị iche iche Chineke si arụ ọrụ nꞌime anyị, ma ọ bụkwa otu Chineke ahụ na-arụ ihe ndị a nile nꞌime mmadụ nile.
7
Mmụọ Nsọ na-arụpụta ọrụ ya nꞌime onye ọ bụla nꞌụzọ ọ ga-esi bara chọọchị nile uru.
8
Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, dị ka o si chọọ.
9
Otu Mmụọ Nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe pụrụ iche, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa.
10
Ụfọdụ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, ndị ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọ kwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu.
11
Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a nile. Ọ na-enye onye ọ bula onyinye dị iche iche dị ka o si kpebie na dị ka o si dị ya mma.
12
Dị ka ahụ anyị si nwee akụkụ dị iche iche, ma bụrụkwa otu ahụ, na-agbanyeghị na o nwere ọtụtụ akụkụ, otu a ka anụ ahụ Kraịst dịkwa.
13
Onye ọ bụla nꞌime anyị bụ otu akụkụ anụ ahụ Jisọs Kraịst. Ụfọdụ nꞌime anyị bụ ndị Juu, ụfọdụ abụghị ndị Juu, ụfọdụ bụ ndị nwe onwe ha, ndị ọzọ bụ ndị ohu. Ma ọ bụ otu Mmụọ ahụ mere anyị nile baptizim baa nꞌime otu ahụ Kraịst ahụ. Chineke enyekwala anyị nile nꞌotu nꞌotu Mmụọ Nsọ ahụ.
14
Ahụ mmadụ abụghị nanị otu akụkụ, kama o nwere ọtụtụ akụkụ.
15
Ọ bụrụ na ụkwụ, nke bụ otu akụkụ ahụ mmadụ asị, “Ebe m na-abụghị aka abụkwaghị m otu akụkụ ahụ ahụ.” Okwu dị otu a egbochighị ya ịnọgide bụrụ akụkụ ahụ ahụ.
16
Otu a kwa, ọ bụrụ na ntị asị, “Ebe m na-abụghị anya abụghị m otu akụkụ ahụ ahụ.” Okwu a kwa agaghị eme ka ntị ghara ịbụ akụkụ ahụ ahụ.
17
Olee otu mmadụ gaara esi nụ ihe ma ọ bụrụ na ahụ ya nile bụ anya? Ọ bụrụkwa na ahụ mmadụ bụ nanị ntị mmadụ ọ̀ ga-esi aṅaa nụ isisi ihe ọ bụla?
18
Onye maara otu ahụ mmadụ gaara adị ma ọ bụrụ na o nwere nanị otu akụkụ? Ma ọ bụghị otu a ka Chineke si kee ya. Chineke kpụrụ akụkụ ahụ mmadụ nile tinyekwa ha ebe ọ chọrọ ka ha dịrị.
19
Nꞌezie, mmadụ agaghị adị ma ọ bụrụ na ọ bụ nanị otu akụkụ dị nꞌahụ ya.
20
Ma ugbu a, ọ bụ ezie na akụkụ ahụ mmadụ dị ọtụtụ, ma ọ bụ nanị otu ahụ ka mmadụ nwere.
21
Nꞌihi nke a, anya enweghị ike ịgwa aka okwu sị, “Achọghị m gị, nꞌihi na ị dịghị m mkpa.” Isi agakwaghị agwa ụkwụ okwu sị, “Achọghị m inye aka gị.”
22
Ma lee ihe Chineke mere. O mere ka akụkụ ahụ anyị ndị na-esighị ike bụrụ ndị dị anyị mkpa karịa.
23
Ee, akụkụ ndị ahụ anyị na-eche na ha adịghị mkpa ka anyị na-eji nsọpụrụ na-elekọta. Akụkụ ndị ahụ na-ekwesịghị ile anya ka anyị na-enye ugwu, ma na-ekpuchi ha.
24
Ma anyị adịghị e si otu a elekọta akụkụ ndị ahụ anya nile na-ahụ, nꞌihi na Chineke kpachapụrụ anya mee ka akụkụ ndị ahụ dịkarịsịri nta bụrụ nke anyị kwesịrị inye nsọpụrụ karịa.
25
Nꞌụzọ dị otu, nkewa ọ bụla adịghị nꞌahụ mmadụ. Akụkụ ọ bụla maara mkpa ibe ya, ha na-egborịtakwara onwe ha mkpa ha.
26
Ọ bụrụ na otu akụkụ enwee nsogbu akụkụ ndị ọzọ ga-eketa oke na nsogbu ahụ. Ọ bụrụkwa na otu akụkụ emee ihe ga-eweta otuto ọ bụ ahụ nile na-enwe otuto ahụ.
27
Ugbu a ghọtanụ ihe m na-ekwu; unu nile nꞌotu nꞌotu bụ otu anụ ahụ Kraịst. Unu bụkwa akụkụ ahụ ya nꞌotu nꞌotu, bụrụkwa ndị dị mkpa nꞌahụ ahụ.
28
Nke a bụ ụfọdụ nꞌime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị bụ ahụ Kraịst: ndị ozi, ndị amụma, ndị nkụzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe nile nꞌusoro, na ndị na-asụ aụsụ dị iche iche.
29
Nꞌime ọrụ ndị a nile, ọ bụghị mmadụ nile pụrụ ịrụzucha ha nile. Mmadụ nile abụghị ndị ozi, ọ bụkwaghị mmadụ nile na-ebu amụma. Mmadụ nile agaghị abụ ndị nkụzi, ọ bụkwaghị mmadụ nile na-arụ ọrụ ịtụnanya.
30
Otu aka ahụ, ọ bụghị mmadụ nile nwere ike ịgwọ ọrịa, ọ bụkwaghị mmadụ nile ka Chineke nyere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche. Ọ bụkwaghị mmadụ nile pụrụ ịkọwa asụsụ ndị a.
31
Ọ bụghị mmadụ nile pụrụ ime ihe nile ndị a, kama gbalịsienụ ike inweta onyinye kachasị mma nꞌime ha. Geenụ ntị ka m gwa unu onyinye ọzọ kachasị onyinye ndị a nile mma.
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 13 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16