bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 11
Mark 11
Igbo 1988
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 12 →
1
Mgbe ha bịaruru nso Jerusalem, ha rutere obodo nta Betfeji nke dị na Betani. Emesịa, ha bịarutere ugwu olivu. Nꞌebe ahụ ka Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya.
2
Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nꞌime obodo nta dị nꞌihu anyị. Mgbe unu na-abanye nꞌime obodo ahụ, unu ga-ahụ nwa inyinya ibu, nke onye ọ bụla na-arịkwasịbeghi nꞌelu ya. Tọpụnụ ya nꞌagbụ kpụtara m ya.
3
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ unu ihe mere unu jiri na-atọpụ ya nꞌagbụ, sịnụ onye ahụ, na ọ dị nna unu ukwu mkpa. Anyị ga-akpụghachi ya ma emesịa.”
4
Ndị ahụ e ziri ozi gara nꞌobodo nta ahụ, hụ inyinya ibu ebe Jisọs sị na ha ga-ahụ ya. E kenyere ya nꞌosisi dị nꞌihu otu ụlọ. Mgbe ndị ahụ bidoro ịtọpụ ya,
5
ndị mmadụ guzo nꞌebe ahụ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atọpụ inyinya ibu ahụ?”
6
Ha gwara ndị ahụ ihe Jisọs gwara ha ka ha kwuo. Ndị ahụ hapụrụ ha ka ha tọrọ inyinya ibu ahụ.
7
Mgbe ahụ ha kpụtaara Jisọs inyinya ibu ahụ, tụsaa uwe ha nꞌazụ ya. Jisọs nọkwasịrị nꞌelu inyinya ibu ahụ.
8
Mgbe ahụ kwa, ọtụtụ mmadụ nꞌime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nꞌụzọ, ndị ọzọ tụsara alaka osisi ha gbutere nꞌọhia.
9
Ndị nọ Jisọs nꞌihu na ndị na-eso ya nꞌazụ, tiri mkpu na-asị, “Ka Chineke gọzie ya! Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị!
10
“Ngọzi dịrị alaeze ahụ na-abịa, alaeze nna anyị Devidi! Ka Chineke site nꞌeluigwe gọzie ya!”
11
Otu a ka Jisọs siri banye Jerusalem, gaa nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke. O legharịrị anya nꞌihe nile dị nꞌebe ahụ, emesịa, ọ hapụrụ Jerusalem gaa Betani, ya na ndị na-eso ụzọ ya, nꞌihi na chi ebidola iji.
12
Nꞌụtụtụ echi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ bidoro ịgụ Jisọs.
13
Site nꞌebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiigi nꞌihu ya nke nwere ahịhịa ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gara nꞌukwu ya ile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nꞌelu ya. Mgbe o ruru nꞌukwu osisi ahụ, ọ hụghị mkpụrụ ọ bụla, nanị ahịhiạ ndụ, nꞌihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ.
14
Mgbe ahụ Jisọs gwara osisi a okwu sị, “Site nꞌụbọchị taa gaa nꞌihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe Jisọs kwuru okwu a.
15
Ha sitere nꞌebe ahụ pụọ na-aga nꞌihu nꞌije ha ịga Jerusalem. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Jisọs banyere nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nꞌebe ahụ. O kpugharịrị tebulu ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa ọdụ ahịa ndị na-ere nduru.
16
O gbochikwara onye ọ bụla iwebata ngwongwo ahịa orire nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ.
17
Ọ gwara ndị nọ nꞌebe ahụ sị, “E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ụlọ nsọ m ga-abụ ụlọ ekpere nye mba nile,’ ma unu emeela ya ka ọ ghọọ ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike.”
18
Mgbe ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha bidoro ịchọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Ha tụrụ egwu na Jisọs pụrụ ime ka ọgba aghara bido, nꞌihi na ọtụtụ mmadụ na-anabata okwu ya nke ọma.
19
Nꞌanyasị ụbọchị ahụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ Jerusalem pụọ.
20
Nꞌisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha sitere nꞌakụkụ osisi fiigi ahụ Jisọs bụrụ ọnụ na-agafe, ha hụrụ na osisi a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ ruo nꞌalaka ya.
21
Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru ụnyaahụ, gwa Jisọs okwu sị, “Onye ozizi, lee anya! Osisi fiigi ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!”
22
Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Nweenụ okwukwe nꞌime Chineke. Nꞌihi na m na-agwa unu sị, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe nꞌime Chineke, unu pụrụ ịgwa ugwu olivu a okwu sị,
23
‘Site nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa daba nꞌime osimiri.’ Ọ bụrụ na unu enweghị obi abụọ, kama kwere na ihe unu kwuru ga-emezu, ọ ga-emezukwa dị ka unu siri kwuo ya.
24
“Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọ bụla unu rịọrọ mgbe unu kpere ekpere, nweenụ okwukwe na unu anatala ya, ọ ga-emezukwara unu dị ka unu siri kpee ya.
25
Kama, mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ebula iro nꞌobi unu megide onye ọ bụla. Burunụ ụzọ gbaghara onye ahụ, ka Nna unu bi nꞌeluigwe gbaghara unu mmehie unu.
26
“Ma ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaghara, Nna unu bi nꞌeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.”
27
Nꞌoge a ha erutela Jerusalem ọzọ. Mgbe Jisọs nọ na-ejegharị nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ, ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya.
28
Ha jụrụ ya ajụjụ sị, “Ebee ka i si nweta ike i ji eme ihe ndị a ị na-eme? Onye nyere gị ike ime ha?”
29
Jisọs zara ha sị, “Aga m ajụ unu otu ajụjụ. Unu zaa m ajụjụ m, aga m aza unu ajụjụ unu, gwakwa unu onye nyere m ike m ji mee ihe m mere.”
30
Nke a bụ ajụjụ Jisọs jụrụ ha, “Ònye zitere Jọn omee baptizim? Ò bụ Chineke ka ọ bụ onye ọzọ? Gwanụ m!”
31
Ndị isi nchụaja ahụ na ndị ozizi iwu na ndị okenye ahụ tulere okwu a kpebie sị, “Ọ bụrụ na anyị asaa ya na ọ bụ Chineke zitere Jọn omee baptizim, ọ ga-ajụ anyị ihe mere anyị jiri jụ ịnabata ozi ya.
32
Ọ bụrụkwa na anyị asị na ọ bụghị Chineke zitere ya, anyị na-etinye onwe anyị na nsogbu, nꞌihi na igwe mmadụ ndị a ga-ebido ọgba aghara.” Nꞌihi na ndị mmadụ kweere na Jọn bụ onye amụma.
33
Ya mere ha zara Jisọs sị ya, “Anyị enweghị ike ịsa ajụjụ gị. Anyị amaghị.” Jisọs zakwara sị ha, “Mgbe ahụ mụ onwe m agakwaghị agwa unu onye nyere m ike ịrụ ọrụ ndị a nile.”
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16