bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 8
Mark 8
Igbo 1988
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 9 →
1
Nꞌoge ahụ, igwe mmadụ ọzọ zukọrọ. Ebe ha na-enweghị ihe ha ga-eri, Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, ọ sịrị,
2
“Enwere m ọmiko nꞌebe igwe mmadụ ndị a nọ. Nke a na-eme ya ụbọchị atọ anyị na ha nọ. Ugbu a ọ dịkwaghị ihe fọdụrụ ha ga-eri.
3
Ọ bụrụ na m sị ha laa, ụfọdụ nꞌime ha ga-ada nꞌụzọ nꞌihi agụụ. Nꞌihi na ụfọdụ ha si nꞌebe dị anya bịa.”
4
Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ọ̀ pụrụ ime bụ ịchọta nri ga-ezuru ha nꞌọzara a?”
5
Jisọs zara sị ha, “Ogbe beredi ole ka unu nwere?” Ha zara sị ya, “Asaa.”
6
Jisọs nyere iwu ka igwe mmadụ ahụ nọdụ ala. O weere ogbe beredi ahụ kpee ekpere nye Chineke ekele. Ọ nyawara beredi ahụ ntakịrị ntakịrị, nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ nile. Ndị na-eso ụzọ ya kekwara ya.
7
Ha nwekwara azụ ntakịrị. Jisọs weere ya kpee ekpere, nyekwa Chineke ekele. Emesịa ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ya.
8
Igwe mmadụ ahụ riri ihe tutuu ha erijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara ibiribe beredi dafuru nꞌebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa.
9
Ndị riri nri a dị puku mmadụ anọ. Emesịa, Jisọs zipụrụ ha ka ha laa.
10
Emesịakwa, Jisọs banyere nꞌụgbọ mmiri ya na ndị na-eso ụzọ ya, gaa nꞌakụkụ obodo Dalmanuta.
11
Mgbe Jisọs ruru nꞌebe ahụ, ndị Farisii bịakwutere ya bido ịjụ ya ajụjụ. Ha gwara Jisọs okwu sị ya, “Ị bụrụ ihe ahụ ị sị na ị bụ, mee ka ihe dị egwu mee na mbara eluigwe. Mgbe ahụ anyị ga-ekwere na ị bụ onye ahụ.”
12
Mgbe Jisọs nụrụ ihe ha chọrọ ka o mee, ọ sụrụ ude nke ukwuu nꞌime onwe ya sị ha, “Gịnị mere ndị ọgbọ a ji na-arịọ m ka m gosi ha ihe ịrịba ama tupu ha ekwere na m? Ka m gwa unu eziokwu, ọ dịghị ihe ịrịba ama a ga-egosi unu.”
13
Ọ hapụrụ ha nꞌebe ahụ banyekwa nꞌụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ.
14
Mgbe ha nọ nꞌụgbọ mmiri na-aga, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha chefuru iwere beredi. Ọ bụ nanị otu ogbe beredi fọdụụrụ ha.
15
Mgbe ha nọ na-eche ihe banyere ya, Jisọs sịrị ha, “Ka m dọọ unu aka na ntị, kpacharanụ anya. Unu ekwela ka e jiri ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke ndị otu Herọd duhie unu.”
16
Ndị na-eso ụzọ ya leritara onwe ha anya jụrịtaa onwe ha, “Gịnị ka ọ na-ekwu? Ọ̀ na-ekwu okwu a nꞌihi na anyị ewetaghị nri ga-ezuru anyị?”
17
Mgbe Jisọs ghọtara na okwu ha na nke ya adakọtaghị, ọ gwara ha okwu sị, “Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu banyere ejighị beredi? Ọ̀ pụtara na unu adịghị aghọta? Ọ̀ pụtara na obi unu siri ike ịnabata okwu m?
18
Ùnu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Ùnu nwere ntị nke na-ajụ ịnụ ihe? Ọ̀ ga-abụ na unu echefuola ngwangwa otu a?
19
“Mgbe m ji beredi ise zụọ puku mmadụ ise ibiribe beredi juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.”
20
Jisọs jụkwara ajụjụ ọzọ sị ha, “Mgbe m ji ogbe beredi asaa zụọ puku mmadụ anọ, ibiribe beredi juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata asaa.”
21
Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụrụ na o si otu a dị, ùnu na-eche na nsogbu m bụ nꞌihi na unu chefuru iweta nri?”
22
Emesịa, ha ruru Betsaida. Nꞌebe ahụ ụfọdụ mmadụ kpọtaara Jisọs otu onye ìs ì rịọọ ya ka o metụ ya aka, ka o bido ịhụ ụzọ.
23
Jisọs duuru onye ìsì ahụ nꞌaka pụọ nꞌobodo ahụ. Mgbe ahu ọ gbụsara ọnụ mmiri nꞌanya nwoke ahụ metụkwa ya aka nꞌanya. Jisọs jụrụ nwoke ahụ sị, “Ị na-ahụ ihe ọ bụla?”
24
Nwoke ahụ leliri anya elu sị Jisọs, “Ana m ahụ ndị mmadụ ka ha na-agagharị agagharị. Kama ha toro ogologo dị ka osisi.”
25
Nke ugboro abụọ Jisọs metụkwara nwoke ahụ aka nꞌanya. Mgbe ahụ anya ya meghere. O bidoro ịhụ ihe nile nke ọma.
26
Jisọs zilagara ya sị ya, “Alaghachikwala azụ nꞌime obodo.”
27
Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nꞌobodo nta ndị ọzọ dị gburugburu Sizaria Filipaị. Mgbe ha na-aga nꞌụzọ Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”
28
Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-eche na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ na-eche na ị bụ Ịlaịja ma ọ bụ otu nꞌime ndị amụma.”
29
Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Onye ka unu onwe unu na-eche na m bụ?” Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst, Onye nzọpụta ahụ anyị na-ele anya ya!”
30
Jisọs dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọ bụla.
31
Emesịa, Jisọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere otu ọ ga-esi hụọ ahụhụ, na otu ndị okenye, na ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-esi jụ ya. Ọ gwara ha ihe banyere otu ha ga-esi gbuo ya, na otu ọ ga-esi site nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị nke atọ.
32
Ọ gwaghere ha ihe ndị a ọnụ. Ma Pita kpọọrọ Jisọs pụọ nꞌotu akụkụ, bido ịbara ya mba na-asị, “Gịnị mere i ji na-ekwu ụdị okwu a?”
33
Ma Jisọs tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya gwa Pita okwu nꞌụzọ ịba mba sị ya, “Si nꞌebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.”
34
Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ ka ha bịa nso. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ ya buru obe ya so m nꞌazụ.
35
Nꞌihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọ bụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nꞌihi m, na nꞌihi ozi ọma m, ga-ahụ ndụ nꞌụtọ ya.
36
“Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ irite ụwa nile nꞌuru ma tufuo mkpụrụ obi ya?
37
Ọ̀ dị ihe ọzọ dị nꞌụwa mmadụ nwere iji gbanworo ndụ ya?
38
Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọ bụla nꞌihi m, na nꞌihi okwu m nꞌụwa ọjọọ a, na nꞌụwa mmehie a, ọ ga-abụkwara mụ bụ Nwa nke mmadụ ihe ihere mụ na onye ahụ inwekọ ihe ọ bụla, mgbe m ga-abịaghachi nꞌebube nke Nna m, mụ na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 9 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16